< 1 Samuel 21 >
1 Devid jere nʼobodo Nob ịhụ Ahimelek, onye nchụaja. Ahimelek mara jijiji mgbe ọ hụrụ Devid. Ọ sịrị Devid, “Gịnị mere naanị gị ji bịa? Gịnị mere o nweghị onye so gị?”
達味去諾布,到了阿希肋客那裏;阿希默肋客戰戰兢兢出來迎接達味,問他說:「為什麼你一個人來,沒有人隨從你﹖」
2 Devid zara Ahimelek, onye nchụaja sị, “Eze ziri m ozi dị mkpa, ma sị m, ‘Ka onye ọbụla ghara ịma ihe ọbụla banyere ozi a m na-eziga gị.’ Ma banyere ụmụ okorobịa m, agwala m ha ebe ha ga-ezute m.
達味回答阿希默肋客說:「君王今天吩咐我一件事,曾對說:我派你,吩咐你去作的事,別叫任何人知道。我已經和我的僮僕約定了某處見面。
3 Ugbu a, olee ihe oriri i nwere? Nye m ogbe achịcha ise maọbụ ihe ọzọ i nwere.”
現今,你手中若有五個餅,請給我,或給我別的什麼東西」。
4 Onye nchụaja ahụ zara Devid sị, “Enweghị m achịcha ana edoghị nsọ nʼebe a. Ma otu ọ dị, e nwere ụfọdụ achịcha e doro nsọ nʼebe a, ma ọ bụrụ na ụmụ okorobịa gị na ha so debere onwe ha ọcha, na-emetụghị nwanyị ahụ.”
司祭回答達味說:「我手中沒有普通餅,只有聖餅;但是你的僮僕們戒了女色沒有﹖」
5 Devid zara sị ya, “Nʼezie, anyị ekwebeghị ka ụmụ nwanyị bịa anyị nso, dịka anyị dị mbụ eme ma anyị na-eje ozi. Ndị ikom ndị a na-edo onwe ha nsọ ọ bụladị mgbe njem anyị na-adịghị nsọ ka ọfọdụzie njem nke taa.”
達味回答司祭說:「當然,我們戒絕了女色;我出征時,僮僕們常是身潔的;這次上路雖為了俗務,但今天他們仍是身身的」。
6 Ebe nri ọzọ na-adịghị, onye nchụaja ahụ nyere Devid achịcha nsọ, bụ achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, nke ewepụtara site nʼihu Onyenwe anyị nʼime ebe ịchụ aja, debekwa achịcha ọhụrụ nke e ji gbanwee nke ochie dị nʼebe ahụ.
於是司祭就將聖餅給了他,因為那天在沒有別的餅,只有供餅;即由上主面前撤下來,為另換上新的供餅。
7 Ma otu onye odibo Sọl nọ nʼebe ahụ nʼụbọchị ahụ, onye e jigidere nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ Doeg, onye Edọm onyeisi ndị na-azụ anụ ụlọ Sọl.
那一天,在那裏正有撒烏耳的一個臣僕留在上主面前,名叫多厄格,厄東人,是撒烏耳的侍衛長。──
8 Devid jụrụ Ahimelek ajụjụ sị ya, “I nweghị ùbe maọbụ mma agha nʼebe a? Ewetaghị m mma agha m maọbụ ngwa agha ọzọ, nʼihi na ozi eze ziri anyị dị oke ngwangwa.”
達味又對阿希默肋客說:「你手邊有沒有一支槍或一把刀﹖我的刀和我的武器,沒有帶在手邊,因為君王的事很緊急」。
9 Onye nchụaja zaghachiri, “Mma agha Golaịat, onye Filistia, onye ahụ i tigburu na ndagwurugwu Ịla dị nʼebe a, a fụchiri ya nʼakwa nʼazụ efọọd. Ọ bụrụ na ị chọrọ ya, were ya, nʼihi na ọ dịghị mma agha ọzọ dị nʼebe a ma ọ bụghị nke ahụ.” Devid sịrị, “Ọ dịghị nke dịka ya, nye m ya.”
司祭答說:「有你在厄拉谷中所殺的那培肋舍特人哥肋雅的刀。看,用外衣包著,放在「厄弗得」後面;假使你願意拿去,就拿去吧! 因為在這裏沒有別的」。達味答說:「沒有像這把刀更好的了! 就請你給我吧! 」
10 Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat.
那一天,達味起身,逃避了撒烏耳的面,到了加特王阿基士前。
11 Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị: “‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?”
阿基士的臣僕對王說:「這不是國王達味嗎﹖在歌舞中所歌頌的:撒烏耳殺了一千,達味殺了一萬,不就是他嗎﹖」
12 Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya.
達味細想這些話,在加特王阿基士前感到十分恐懼。
13 Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
於是便在他們面前裝作傻子,在他們中佯作瘋子,亂敲門戶,鬍鬚上流著唾沬。
14 Akish gwara ndị ozi ya okwu sị ha, “Leenụ nwoke a! Ọ bụ onyeisi mebiri! Gịnị mere unu ji kpọtara m ya?
阿基士對臣僕說:「他們看,這是個瘋子,為什麼送他到我這裏來﹖
15 Ndị na-ayị ara ha kọrọ m, nke mere unu ji kpọtara m nwoke a nʼebe a ka ọ bịa na-eme ka onye na-ayị ara nʼihu m? O kwesiri ka onye dị otu a bata nʼụlọ m?”
難道我缺乏瘋子,你們竟領他到這裏來,向我發瘋。這樣的人豈能進入我的宮室﹖」