Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, 1-Samuel Chapter 21 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/1-Samuel/21 1) Devid jere nʼobodo Nob ịhụ Ahimelek, onye nchụaja. Ahimelek mara jijiji mgbe ọ hụrụ Devid. Ọ sịrị Devid, “Gịnị mere naanị gị ji bịa? Gịnị mere o nweghị onye so gị?” 2) Devid zara Ahimelek, onye nchụaja sị, “Eze ziri m ozi dị mkpa, ma sị m, ‘Ka onye ọbụla ghara ịma ihe ọbụla banyere ozi a m na-eziga gị.’ Ma banyere ụmụ okorobịa m, agwala m ha ebe ha ga-ezute m. 3) Ugbu a, olee ihe oriri i nwere? Nye m ogbe achịcha ise maọbụ ihe ọzọ i nwere.” 4) Onye nchụaja ahụ zara Devid sị, “Enweghị m achịcha ana edoghị nsọ nʼebe a. Ma otu ọ dị, e nwere ụfọdụ achịcha e doro nsọ nʼebe a, ma ọ bụrụ na ụmụ okorobịa gị na ha so debere onwe ha ọcha, na-emetụghị nwanyị ahụ.” 5) Devid zara sị ya, “Nʼezie, anyị ekwebeghị ka ụmụ nwanyị bịa anyị nso, dịka anyị dị mbụ eme ma anyị na-eje ozi. Ndị ikom ndị a na-edo onwe ha nsọ ọ bụladị mgbe njem anyị na-adịghị nsọ ka ọfọdụzie njem nke taa.” 6) Ebe nri ọzọ na-adịghị, onye nchụaja ahụ nyere Devid achịcha nsọ, bụ achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, nke ewepụtara site nʼihu Onyenwe anyị nʼime ebe ịchụ aja, debekwa achịcha ọhụrụ nke e ji gbanwee nke ochie dị nʼebe ahụ. 7) Ma otu onye odibo Sọl nọ nʼebe ahụ nʼụbọchị ahụ, onye e jigidere nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ Doeg, onye Edọm onyeisi ndị na-azụ anụ ụlọ Sọl. 8) Devid jụrụ Ahimelek ajụjụ sị ya, “I nweghị ùbe maọbụ mma agha nʼebe a? Ewetaghị m mma agha m maọbụ ngwa agha ọzọ, nʼihi na ozi eze ziri anyị dị oke ngwangwa.” 9) Onye nchụaja zaghachiri, “Mma agha Golaịat, onye Filistia, onye ahụ i tigburu na ndagwurugwu Ịla dị nʼebe a, a fụchiri ya nʼakwa nʼazụ efọọd. Ọ bụrụ na ị chọrọ ya, were ya, nʼihi na ọ dịghị mma agha ọzọ dị nʼebe a ma ọ bụghị nke ahụ.” Devid sịrị, “Ọ dịghị nke dịka ya, nye m ya.” 10) Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat. 11) Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị: “‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?” 12) Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya. 13) Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya. 14) Akish gwara ndị ozi ya okwu sị ha, “Leenụ nwoke a! Ọ bụ onyeisi mebiri! Gịnị mere unu ji kpọtara m ya? 15) Ndị na-ayị ara ha kọrọ m, nke mere unu ji kpọtara m nwoke a nʼebe a ka ọ bịa na-eme ka onye na-ayị ara nʼihu m? O kwesiri ka onye dị otu a bata nʼụlọ m?” Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!