< Ezra 2 >

1 Ga lissafin waɗanda suka dawo daga bauta a Babilon, waɗanda Nebukadnezzar sarkin Babilon ya kwasa zuwa bauta a ƙasar Babilon (sun dawo Urushalima da Yahuda, kowa ya koma garinsu.
Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha.
2 Sun komo tare da Zerubbabel, da Yeshuwa, da Nehemiya, da Serahiya, da Re’elaya, da Mordekai, da Bilshan, da Misfar, da Bigwai, da Rehum, da Ba’ana). Ga jerin mazan mutanen Isra’ila.
Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
3 Zuriyar Farosh mutum 2,172
Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ.
4 ta Shefatiya 372
Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ.
5 ta Ara 775
Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise.
6 ta Fahat-Mowab (ta wurin Yeshuwa da Yowab) 2,812
Ụmụ Pahat-Moab (site nʼụmụ Jeshua na Joab), dị puku abụọ na narị asatọ na iri na abụọ.
7 ta Elam 1,254
Ụmụ Elam, otu puku na narị abụọ na iri ise na anọ.
8 ta Zattu 945
Ụmụ Zatu, narị itoolu na iri anọ na ise.
9 ta Zakkai 760
Ụmụ Zakai, narị asaa na iri isii.
10 ta Bani 642
Ụmụ Bani, narị isii na iri anọ na abụọ.
11 ta Bebai 623
Ụmụ Bebai, narị isii na iri abụọ na atọ.
12 ta Azgad 1,222
Ụmụ Azgad, otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ.
13 ta Adonikam 666
Ụmụ Adonikam, narị isii na iri isii na isii.
14 ta Bigwai 2,056
Ụmụ Bigvai, puku abụọ na iri ise na isii.
15 ta Adin 454
Ụmụ Adin, narị anọ na iri ise na anọ.
16 ta Ater (ta wurin Hezekiya) 98
Ụmụ Atea, site na Hezekaya, iri itoolu na asatọ.
17 ta Bezai 323
Ụmụ Bezai, narị atọ na iri abụọ na atọ.
18 ta Yora 112
Ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ.
19 ta Hashum 223
Ụmụ Hashum, narị abụọ na iri abụọ na atọ.
20 ta Gibbar 95.
Ụmụ Giba, iri itoolu na ise.
21 Mutanen Betlehem 123
Ndị ikom Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ.
22 na Netofa 56
Ndị ikom Netofa, iri ise na isii.
23 na Anatot 128
Ndị ikom Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ.
24 na Azmawet 42
Ndị ikom Azmavet, iri anọ na abụọ.
25 na Kiriyat Yeyarim, da Kefira Beyerot 743
Ndị ikom Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ.
26 na Rama da Geba 621
Ndị ikom Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu.
27 na Mikmash 122
Ndị ikom Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ.
28 na Betel da Ai 223
Ndị ikom Betel na Ai, narị abụọ na iri abụọ na atọ.
29 na Nebo 52
Ndị ikom Nebo, iri ise na abụọ.
30 na Magbish 156
Ndị ikom Magbish, otu narị na iri ise na isii.
31 na ɗayan Elam ɗin 1,254
Ụmụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ.
32 na Harim 320
Ụmụ Harim, narị atọ na iri abụọ.
33 na Lod, da Hadid da Ono 725
Ụmụ Lod, Hadid na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise.
34 na Yeriko 345
Ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise.
35 na Sena’a 3,630.
Ụmụ Senaa, puku atọ, narị isii na iri atọ.
36 Firistoci. Zuriyar Yedahiya (ta wurin iyalin Yeshuwa) 973
Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya (site nʼezinaụlọ Jeshua), narị itoolu na iri asaa na atọ
37 ta Immer 1,052
ndị Imea, otu puku na iri ise na abụọ
38 ta Fashhur 1,247
ndị Pashua, otu puku na narị abụọ na iri anọ na asaa
39 ta Harim 1,017.
ndị Harim, otu puku, otu narị na asaa.
40 Lawiyawa. Lawiyawa na zuriyar Yeshuwa da Kadmiyel (ta wurin Hodawiya) mutum 74.
Ndị Livayị: Ndị agbụrụ Jeshua na Kadmiel (nke ụmụ Hodavaya), iri asaa na anọ.
41 Mawaƙa. Zuriyar Asaf mutum 128.
Ndị ọbụ abụ: Ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri abụọ na asatọ.
42 Masu tsaron haikali. Zuriyar Shallum, Ater, Talmon, Akkub, Hatita, da Shobai mutum 139.
Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: Ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai. Ha dị otu narị, na iri atọ na itoolu.
43 Ma’aikatan haikali. Zuriyar Ziha, Hasufa, Tabbawot,
Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: Ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
44 Keros, Siyaha, Fadon,
Keros, Siaha, Padon,
45 Lebana, Hagaba, Akkub,
Lebana, Hagaba, Akub,
46 Hagab, Shamlai, Hanan,
Hagab, Shalmai, Hanan,
47 Giddel, Gahar, Reyahiya,
Gidel, Gaha, Reaya,
48 Rezin, Nekoda, Gazzam,
Rezin, Nekoda, Gazam,
49 Uzza, Faseya, Besai,
Ụza, Pasea Besai,
50 Asna, Meyunawa, Nefussiyawa,
Asna, Meunim, Nefusim,
51 Bakbuk, Hakufa, Harhur,
Bakbuk, Hakufa, Hahua,
52 Bazlut, Mehida, Harsha,
Bazlut, Mehida, Hasha,
53 Barkos, Sisera, Tema,
Bakos, Sisera, Tema,
54 Neziya da Hatifa.
Nezaya na Hatifa.
55 Zuriyar bayin Solomon. Zuriyar Sotai, Hassoferet, Feruda,
Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Hasoferet, Peruda,
56 Ya’ala, Darkon, Giddel,
Jaala, Dakon, Gidel
57 Shefatiya, Hattil, Fokeret-Hazzebayim, da Ami.
Shefataya, Hatil, na Pokeret-Hazebaim na Ami.
58 Dukan zuriyar ma’aikatan haikali, da kuma bayin Solomon 392.
Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ.
59 Waɗannan mutanen ne suka zo daga garuruwan Tel-Mela, Tel-Harsha, Kerub, Addan da Immer, amma ba su iya nuna ainihin tushensu daga Isra’ila ba.
Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
60 ’Yan zuriyar Delahiya, Tobiya, da Nekoda 652.
Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ.
61 Daga cikin firistoci kuma, zuriyar Hobahiya, Hakkoz da Barzillai (wanda ya auri diyar Barzillai mutumin Gileyad da ake kuma kira da wannan suna).
Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha.
62 Waɗannan sun nemi sunayen iyalansu a cikin littafin da ake rubuta sunayen amma ba su ga sunayensu ba, saboda haka sai aka hana su zama firistoci domin an ɗauka su marasa tsabta ne.
Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
63 Gwamna ya umarce su cewa kada su ci wani abinci mai tsarki sai firist ya yi shawara ta wurin Urim da Tummim tukuna.
Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
64 Yawan jama’ar duka ya kai mutum 42,360,
Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii,
65 ban da bayinsu maza da mata 7,337; suna kuma da mawaƙa maza da mata 200.
nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa, ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ.
66 Suna da dawakai guda 736, alfadarai 245,
Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii, ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise.
67 raƙuma 435, da jakuna 6,720.
Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise, ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ.
68 Sa’ad da suka isa haikalin Ubangiji a Urushalima, sai waɗansu shugabannin iyalai suka yi bayarwar yardar rai ta gudummawarsu domin sāke gina gidan Allah a wurin da yake.
Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.
69 Bisa ga ƙarfinsu suka bayar da darik 61,000 na zinariya, da maina 5,000 na azurfa, da rigunan firistoci guda 100.
Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu, maịna ọlaọcha dị puku ise na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị.
70 Firistoci, da Lawiyawa, da mawaƙa, da masu tsaron ƙofofi, da masu aiki a haikali, tare da waɗansu mutane, da dukan sauran Isra’ilawa suka zauna a garuruwansu.
Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha.

< Ezra 2 >