< Mark 16 >
1 When the Sabbath was past, Mary the Magdalene, Mary the mother of James, and Salome, bought spices that they might embalm Jesus.
Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ.
2 And early in the morning, the first day of the week, they came to the tomb about sunrise.
Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ.
3 And they said among themselves, Who will roll away the stone for us from the entrance of the tomb? (for it was very large.)
Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?”
4 But when they looked, they saw that the stone had been rolled away.
Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ.
5 Then entering the tomb, they beheld a youth sitting on the right side, clothed in a white robe, and they were frightened.
Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu.
6 But he said to them, Be not frightened; you seek Jesus the Nazarene, who was crucified. He is risen, he is not here: behold the place where they laid him.
Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya.
7 But go, say to his disciples, and to Peter, He is gone before you to Galilee; where you shall see him, as he told you.
Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’”
8 The women then getting out, fled from the tomb, seized with trembling and consternation; but said nothing to any one, they were so terrified.
Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.
9 (note: The most reliable and earliest manuscripts do not include Mark 16:9-20.) Jesus having arisen early the first day of the week, appeared first to Mary the Magdalene, out of whom he had cast seven demons.
(note: The most reliable and earliest manuscripts do not include Mark 16:9-20.) Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.
10 She went and informed those who had attended him, who were in affliction and tears.
Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ.
11 But when they heard that he was alive, and had been seen by her, they did not believe it.
Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị.
12 Afterward he appeared in another form to two of them, as they traveled on foot into the country.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo.
13 These being returned, informed the other disciples, but neither did they believe him.
Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị.
14 At length he appeared to the eleven, as they were eating, and reproached them with their incredulity and obstinacy, in disbelieving those who had seen him after his resurrection.
Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite.
15 And he said unto them, Go throughout all the world, proclaim the glad tidings to the whole creation.
Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma.
16 He who shall believe, and be immersed, shall be saved; but he who shall not believe, shall be condemned.
Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe.
17 And these miraculous powers shall attend the believers: -- In my name they shall expel demons. They shall speak in languages unknown to them before.
Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche.
18 They shall handle serpents with safety. And if they drink poison, it shall not hurt them. They shall cure the sick by laying their hands upon them.
Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.”
19 Now, after the Lord had spoken to them, he was taken up into heaven, and sat down at the right hand of God.
Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke.
20 As for them, they went out and proclaimed the tidings everywhere, the Lord co-operating with them, and confirming their doctrine by the miracles with which it was accompanied.
Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.