< 詩篇 88 >

1 詠【哀怨歌】 科辣黑子孫的詩歌,交於樂官,悲調歌唱。 上主,我的天主,我白天禱告,我黑夜在您的面前哀號。
Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra. O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m, nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.
2 願我的祈禱上前達您前,求您側耳聽我的呼喊。
Ka ekpere m bịa nʼihu gị. Chee ntị gị nụrụ akwa m.
3 因我的心靈飽受災難,我的性命已臨近陰間; (Sheol h7585)
Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ. (Sheol h7585)
4 我已被列在進入墳墓的人中,我已變成與無氣力的人相同。
Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike.
5 我的床榻舖在死人的中間,與葬於墳墓者的屍身作伴,您已不再記念他們,您已不再照顧他們。
A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.
6 您把我放在極深的坑間,您把我置於黑暗和深淵。
Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.
7 您的忿怒氣燄重壓著我,您的大浪巨濤苦害著我。
Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. (Sela)
8 您叫我的知己離我遠去,您使我被他們痛恨厭惡;我受他們拘留不得外出。
Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya, mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ. Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;
9 我的眼睛痛苦而憔悴,上主,我天天在呼號著您,也把我的雙手向您舉起。
anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
10 難道您還要給死人發顯奇跡,或是去世的人會起來稱謝您?
ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị? Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? (Sela)
11 難道在墳墓裏還有人稱述您的仁慈,或者在陰府內還有人宣揚您的信義?
Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?
12 難道在幽暗處能有人明瞭您的奇蹟?或者在遺忘區還有人曉得您的正義?
A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?
13 但是上主,我現今呼號您,我的祈禱早晨上達於您;
Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.
14 上主,您為什麼捨棄了我的靈魂?又為什麼向我掩起了您的慈容?
O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m? Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?
15 我自幼受苦,幾乎死去,受您的威嚇,萬分恐懼;
Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.
16 您的盛怒將我淹沒,您的威嚇使我死掉,
Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; ihe egwu gị alaala m nʼiyi.
17 像水一樣常環繞著我,由四周齊來緊圍著我。
Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.
18 您使親友同伴將我離棄,黑暗成了我的家人知己。
Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya; ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.

< 詩篇 88 >