< 詩篇 25 >

1 【靠上主的祈禱】上主,我向你把我的心舉起,
Abụ Ọma Devid. Ọ bụ na gị Onyenwe anyị ka m tụkwasịrị obi m.
2 我的天主,我全心要倚靠你。求你不要使我蒙受羞恥,不要容許我的仇人歡喜。
O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m.
3 凡期望你的人絕不會蒙羞,唯冒昧失信人才會受辱。
Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
4 上主,求你使我認識你的法度,並求你教訓我履行你的道路。
O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile.
5 還求你教訓我;引我進入真理之路,我終日仰望你,因你是救我的天主。
Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.
6 上主,求你憶及的仁慈和恩愛,因為它們由亙古以來就常存在。
Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.
7 我青春的罪愆和過犯,求你要追念;上主,求你紀念我,照你的仁慈和良善。
Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
8 因為上主仁慈又正直,常領迷途者歸回正路,
Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.
9 引導謙卑者遵守正義,教善良者走入正途。
Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
10 對待持守上主的盟約和誡命的人,上主的一切行徑常是慈愛和忠誠。
Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.
11 上主,為了你聖名的緣故,求你赦免我重大的愆尤。
Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.
12 不論是誰,只要他敬愛上主,上主必指示他應選的道路,
Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.
13 他的心靈必要安享幸福,他的後裔必能承繼領土。
Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.
14 上主親近敬愛自己的人民,也使他們認識自己的誓盟。
Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
15 我的眼睛不斷地向上主瞻仰,因為祂使我的雙腳脫離羅網。
Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.
16 求你回顧,求你憐憫,因為我是孤苦伶仃。
Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.
17 求你減輕我心的苦難,救我脫離我的憂患;
Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute.
18 垂視我的勞苦和可憐,赦免我犯的一切罪愆。
Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile.
19 請看我的仇敵如何眾多,他們都兇狠地痛恨著我。
Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị.
20 求你保謢我的生命,向我施救,別叫我因投奔你而蒙受羞辱。
Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ
21 願清白和正直護衛我!上主,因我唯有仰望你。
Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.
22 天主,求你拯救以色列,使他脫離一切的禍災
O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.

< 詩篇 25 >