< 詩篇 45 >

1 科辣黑後裔的訓誨歌,交與樂官。 我的心靈湧溢優雅的言辭,向我君王傾吐我的讚美詩;我舌好像書寫流利的妙筆。
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Okoko osisi lili.” Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ. Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m, mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze; ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.
2 你在世人中最為美麗,你口中流著慈惠,因此天主永遠祝福你。
I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ, e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ, ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.
3 英雄!請在腰間佩帶你的刀劍,就是佩帶上你的榮耀和威嚴。
Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.
4 願你為了信實和正義驅駕順利,願你的右手指導你驚人的奇事!
Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
5 萬民必因你的銳箭屈服於你,君王的眾仇敵必要膽破心悸。
Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze; ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.
6 上主! 你的御座永遠常存,你治國的權杖無比公允。
O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
7 你愛護正義,你又憎恨罪辜:為這個緣故,你的天主,以喜油傅你,勝過你的伴侶。
Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.
8 你的衣冠散布沒藥、沉香、與肉桂的芬芳。由象牙宮中奏出絃樂的聲音,使你歡暢;
Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.
9 列王的公主都成群結隊前來歡迎你,王后佩帶敖非爾金飾,在你右邊侍立。
Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
10 女兒!請聽,請看,也請側耳細聽:忘卻你的民族和你的家庭!
Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
11 因為君王戀慕你的美艷雅麗,祂是你主,你應向祂俯道至地!
Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”
12 提洛的女兒都前來奉獻禮品,民間的顯要都想得你的歡心。
Ada Taịa ga-eji onyinye bịa; ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.
13 公主穿戴齊備,姍姍來迎,她的衣服全是金絲繡成。
Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.
14 她身穿繡衣華服,被弔到君王面前,成群的童女陪伴著她,也到你身邊:
Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.
15 在歡樂歌舞聲中,一齊進入了王宮。
E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze.
16 你的子孫要承嗣你的先祖;立他們為王,統治普天率土。
Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.
17 我要使你的名永垂不朽;萬民將歌頌你至永久。
Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.

< 詩篇 45 >