< 何西阿書 7 >

1 當我著手醫治以色列時,厄弗辣因的罪孽就顯露出來,撒馬利亞的惡也顯露出來,因為他們行了詭詐的事:竊賊潛入內室,而外遇強盜;
mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel, mmehie Ifrem na-apụta ihe, a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria. Ha na-aghọ aghụghọ, ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ.
2 但他們並不存心細想:我記住他們的一切惡行。現今他們的行為圍繞著他們,一一擺在我眼前。
Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara na m na-echeta mmehie ha niile. Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu. Ana m ahụkwa ha niile.
3 他們使君王喜歡,是出於惡意,使首領快樂,是出於詭詐。
“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha; ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.
4 個個燃起了怒火,像一座火爐,伙夫暫停煽火,直到和好的麵團發酵。
Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
5 在他們君王的慶日上,當官長們酒勁發作,不能支持的時候,君王便和惡徒勾結起來。
Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị, ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke, ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.
6 他們的心雖因陰謀而焦慮得像火爐一樣,但他們的怒火卻整夜停息;一到早晨,卻又如烈火復燃。
Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha, ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya. Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ, nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
7 個個像火爐一樣,熾燃起來,吞噬了他們的官長;他們的君王都倒斃了,但沒有一個向我呼求。
Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ. Ha na-eripịa ndị eze ha. Ndị eze ha niile na-ada, ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.
8 厄弗辣因想混雜在列邦之中,厄弗辣因成了一塊尚未翻過的烤餅。
“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
9 外邦人耗盡了她的力量,她尚不自覺,頭上已佈滿了白髮,她還不知曉。
Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha, ma ha adịghị aghọta ya. Isi awọ apụtala ha nʼisi, ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị.
10 [雖然如此,以色列的驕傲仍呈現在自己面上,他們仍不歸依,仍不尋求上主,他們的天主]。
Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya, maọbụ chọọ ya.
11 厄弗辣因像愚蠢無知的鴿子,一時求救埃及,一時又投奔亞述;
“Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.
12 可是不論他們往何處去,我要向他們撒開我的羅網,使他們像天上的飛鳥跌下:一聽到他們聚齊待飛,我便將他們捕捉。
Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
13 他們有禍了! 因為他們遠離離了我;他們必遭受毀滅,因為他們背叛了我。我原想拯救他們,但他們卻對我撒謊,
Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m.
14 並沒有真心呼求我,只是在祭壇旁悲歎;為了五榖和新酒,仍自割己身,仍背叛我。
Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.
15 我雖然加強了他們的手臂,然而他們仍圖謀邪惡反抗我。
Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike, ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.
16 他們歸向了虛無,變成了歪曲的弓;他們的首領因自己的狂言,必喪身刀下,且在埃及地為人恥笑。
Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu. Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla. Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha, nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta. Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị nʼala Ijipt.

< 何西阿書 7 >