< 何西阿書 6 >

1 「來,我們回到上主那裏去,因為衪撕碎了我們,也必要治愈;衪打傷了我們,也必要包紮。
“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị. Ya onwe ya adọkaala anyị, ọ ga-agwọkwa anyị; o tipụla anyị ọnya, ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.
2 兩天後衪必使田復生,第三天衪必使我們興起,生活在衪的慈顏下。
Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.
3 讓我們認識上主,讓我們努力認識上主! 衪定要像曙光一樣出現,衪要來到我們中間,有如秋雨,有如滋潤田地的春雨。」
Ka anyị mara Onyenwe anyị; ka anyị gbalịsie ike ịmata ya. Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite, nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ, ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”
4 厄弗辣因,我可對你們作什麼﹖因為你們的仁愛有如旱晨的浮雲,有如易於消散的朝露。
“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda? Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ, dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.
5 因此,我藉先知們砍伐了他們,以我口中的言語殺死戳了他們;我的的裁判出現有如光明:
Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha. Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha, ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.
6 因為我喜歡仁慈勝過祭獻,喜歡人認識天主勝過全燔祭。
Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja, ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.
7 但是他們在阿當就犯了罪,在那裏已背叛了我。
Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m; nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
8 基肋阿得是座作惡的城池,滿了血跡。
Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe, nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.
9 一隊司祭就如埋伏的強盜,在往舍根的路上行兇;的確,他們行了可恥的事
Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe, otu a ka ndị nchụaja si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem, leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.
10 在貝特耳我見了可惡的事:在那裏厄弗辣因行了淫,以色列玷污了自己
Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel. Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna, emerụọkwala Izrel.
11 當我轉變我百姓的命運時,猶大啊! 為你也注定了一個收割期。
“Ma nye gị onwe gị, Juda, owuwe ihe ubi nọ na-eche gị. “Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,

< 何西阿書 6 >