< 马可福音 6 >

1 耶稣离开那里,与门徒一起回到自己位于拿撒勒的家乡。
Ọ sitere nʼebe ahụ pụọ laghachi nʼobodo nke a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa.
2 到了安息日那天,他开始在会堂里传道。很多人都来聆听,纷纷称奇:“他从哪里获得的这些思想?他获得了怎样的智慧?他从哪里获得实现奇迹的力量?
Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya. Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ?
3 他不是木匠的儿子吗?玛利亚的儿子,雅各、约西、犹大、西门的哥哥,他的妹妹们不是也住在这里?”他们被冒犯了,于是开始拒绝耶稣。
Onye a ọ bụghị onye kapinta ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef, Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ.
4 耶稣对他们说:“先知在任何地方都受人尊敬,但在自己的家乡、在亲朋好友面前却不行。”
Ma Jisọs zara ha sị, “Onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọbụla nʼobodo a mụrụ ya, na nʼetiti ndị ikwu ya na nʼezinaụlọ o siri pụta.”
5 这让耶稣无法在那里行使神迹,只是给几个病人按手,医好了他们。
Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha.
6 他很诧异人们如此缺乏信心。随后,耶稣到周围的乡村继续去教导那里的民众。
Enweghị okwukwe ha juru ya anya. O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe.
7 他叫来十二门徒,派他们两人一组出门,同时赐给他们战胜恶灵的力量。
Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha.
8 他吩咐他们除了手杖不要带任何随身物品,不要带粮食或口袋,腰袋里不要带钱,
Ndị a bụ iwu o nyere: “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, karịkwa mkpanaka. Unu ewela achịcha, maọbụ akpa, unu etinyela ego ọbụla nʼime belịt unu.
9 只穿一双鞋,不要带其他衣服。
Yirinụ akpụkpọụkwụ unu, unu eyikwala karịa otu uwe.
10 他对他们说:“无论到哪里,如果有人邀请你到家中,就住在那里,直到离开那个地方。
Mgbe ọbụla unu banyere nʼụlọ ọbụla, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ.
11 如果人们不欢迎你们,不听你们的,离开那地方时,跺下脚上的灰尘,作为放弃他们的信号。”
Ma ọ bụrụ na obodo ọbụla anabataghị unu maọbụ egeghị unu ntị, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.”
12 门徒们开始四处传道,劝人悔改,
Ha pụrụ kwusara ndị mmadụ ka ha chegharịa.
13 他们驱赶了许多恶灵,用油涂抹在很多病人的身上,将他们治愈。
Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.
14 当时耶稣的名声传了出去,希律王也听到了。有人说:“这是施洗约翰,他从死人中复活了,所以会有行使神迹的能力。”
Eze Herọd nụrụ akụkọ banyere ya, nʼihi na aha Jisọs aghọọla okwu a kpụ nʼọnụ. Ụfọdụ na-asị, na ọ bụ “Jọn omee baptizim; na e meela ka o site na ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa nke a mere ka ike ọrụ ebube ji dị nʼime ya.”
15 又有人说:“他是以利亚。”还有人说:“他是先知,就像古时的先知一样。”
Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ Ịlaịja.” Ma ndị ọzọkwa kwuru na ọ bụ onye amụma dị ka otu nʼime ndị amụma mgbe ochie.
16 但希律听到这一切,就说:“是约翰,我砍了他的头,他又活了!”
Ma mgbe Herọd nụrụ nke a, ọ sịrị, “Jọn onye ahụ m bipụrụ isi, emeela ka ọ site nʼọnwụ bilie!”
17 因为希律曾亲自派人捉拿约翰,把他丢进监狱。他之所以这样做,是因为他娶了弟弟菲力的妻子希罗底,
Nʼihi na Herọd nʼonwe ya nyererị iwu ka e jide Jọn kee ya agbụ tụba ya nʼụlọ mkpọrọ. O mere nke a nʼihi Herodịas bụrịị nwunye Filip nwanne ya, onye ọ kpọrọ dịka nwunye ya.
18 但约翰对希律说:“你娶兄弟的妻子,这不合律法。”
Nʼihi na Jọn gwara Herọd sị, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ nwunye nwanne gị nwoke.”
19 于是希罗底怀恨在心,想要杀他,但又找不到机会,
Nʼihi ya Herodịas bu iro nʼobi megide Jọn na-achọkwa ụzọ igbu ya, mana ọ pụghị ime nke a,
20 因为希律惧怕约翰,知道他是秉承正道的圣人,但也会保护约翰,虽然觉得他的话很不入耳,却仍然喜欢听。
nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya.
21 有一天希罗底的机会来了。在希律生日的那一天,他为大臣、千夫长和加利利的重要人物摆设了筵席。
Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili.
22 希罗底的女儿进来跳舞,希律和在座的宾客都很高兴。于是国王对女孩说:
Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.”
23 “你想要什么?只管向我求,我一定给你!”他甚至还发誓:“我甚至可以将我王国的一半送给你!”
O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m.”
24 于是女孩出去问母亲:“我该求什么呢?”希罗底告诉她:“施洗约翰的头!”
Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.”
25 她急忙跑到国王面前,对王说:“我想要你立刻把施洗约翰的头放在盘子上,送给我!”
Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.”
26 希律王非常烦恼,但因为这是他在众宾客面前说的誓言,所以无法拒绝她。
O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya.
27 希律王立刻差遣一个侍卫,让他把约翰的头拿来。侍卫便到监牢里斩了约翰的头,
Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ,
28 然后把头放在盘子上,拿来交给那女孩子,女孩又交给她的母亲。
tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya.
29 约翰的门徒听闻,便前来领走了他的遗体,葬于坟墓中。
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.
30 门徒们回来后,聚在耶稣面前,把他们所做之事和所见到的一切告诉耶稣。
Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri.
31 耶稣对他们说:“你们跟我来,到一个安静的地方休息一下。”因为来往的人很多,他们甚至没有时间吃饭。
Nʼoge ahụ, nʼihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa na-apụkwa nke mere na ha enweghị ohere iri nri, ọ sịrị ha, “Soronụ m, unu niile, ka anyị ga ebe dị jụụ, zuo ike nwa oge nta.”
32 于是他们上了船,去到一个可以独处的安静地点。
Ya mere ha pụrụ baa nʼime ụgbọ mmiri gaa nʼebe ha ga-anọdụrụ naanị onwe ha.
33 民众看见他们离开,认出了他们。于是周边城市的人们都赶过来,比耶稣他们还先赶到。
Ma ọtụtụ mmadụ ndị hụrụ ha mgbe ha na-apụ matara ha, sitekwara nʼobodo niile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ gbaruo ebe ahụ tupu ya na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo.
34 耶稣下船后看见众人,立刻心生怜悯,因为他们就像没有牧人的羊群。于是他开始教导他们。
Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe.
35 夜深了,门徒前来对耶稣说:“这里是荒郊野外,天色已晚,
Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala.
36 你可以让众人散开,到周围的田舍村庄去给自己找点东西吃。”
Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.”
37 但是耶稣回答:“你们给他们些吃的吧。”门徒说:“什么?如果给他们所有人准备饼,需要我们用六个月的薪水才行?”
Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.” Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?”
38 耶稣问:“你们现在有多少饼?去看看。”门徒们跑去查看一番,然后对耶稣说“还有五块饼和几条鱼。”
Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.”
39 耶稣让众人分组坐在草地上。
Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ.
40 于是众人坐下来,有的一百人一组,有的五十人一组。
Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ.
41 耶稣拿起这五个饼和两条鱼,望着天,感谢天赐食物,然后把饼掰开递给门徒,让他们把饼送给民众,然后又把两条鱼也分给民众。
Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile.
42 众人最终都吃饱了。
Ha niile riri rijuo afọ.
43 他们把剩下的食物捡起来,装满了十二个篮子。
Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ.
44 这晚共有五千名男人吃了食物,还有他们的家人。
Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.
45 随后,耶稣立刻让门徒回到船上,先到湖对岸的伯赛大去,他自己会叫众人散开。
Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ.
46 他和众人告别后,就上山祷告。
Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere.
47 那天晚上,门徒的船还在湖中航行,耶稣独自在岸上。
Mgbe uhuruchi bịara, ụgbọ mmiri ahụ nọ nʼetiti osimiri, ma naanị ya onwe ya nọ nʼelu ala.
48 由于不是顺风,他可以看到门徒们费力摇橹。凌晨时分,耶稣在水面上向门徒们走去,本来可以超过他们,
Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.
49 但门徒看见他在水面上走,以为是鬼怪。
Ma mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, tie mkpu akwa.
50 因为他们看见了他,感到非常恐惧,于是喊叫起来。耶稣立刻对他们说:“放心吧,是我,不要怕!”
Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha. Na-atụfughị oge, ọ gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”
51 然后他上了船与门徒们在一起,立刻风平浪静。门徒心里十分惊奇,
Emesịa, ọ rịgokwuru ha nʼime ụgbọ mmiri ahụ, otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ha anya nke ukwuu.
52 他们此刻仍然感到震惊,因为他们愚钝而坚硬的内心,还不明白这次分饼神迹的含义。
Obi ha mechiri emechi nʼihi na ha aghọtaghị ihe banyere ọrụ ebube ogbe achịcha ndị ahụ.
53 他们渡过海,在革尼撒勒靠岸。
Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha rutere nʼala Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha.
54 下船后,众人立刻认出耶稣。
Ma ngwangwa ha pụtara nʼụgbọ, ndị nọ nʼebe ahụ matara onye ọ bụ.
55 他们走到大街小巷,把患者放在垫子上,听说耶稣出现在哪里,就把患者抬到哪里。
Ha gbaara ọsọ gaa nʼobodo nta niile dị ebe ahụ gburugburu butere ya ndị ọrịa nʼute ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ.
56 无论耶稣在什么地方,无论是村庄、城市或乡野,众人都会把病患放在市场中,请求耶稣允许他们摸他衣服的褶子,摸一下病患就好了。
Ebe ọbụla ọ bara, nʼobodo ukwu maọbụ na obodo nta, maọbụ nʼubi, ndị mmadụ na-ebute ndị ọrịa nibe ha nʼahịa. Ha rịọrọ ya ka o kwere ka ha metụ ọ bụladị ọnụnụ uwe ya aka; ndị niile metụrụ ya aka nwetara ọgwụgwọ.

< 马可福音 6 >