Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 20 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/20 1) Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị. 2) Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị. 3) Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. (Sela) 4) Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. 5) Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile. 6) Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya. 7) Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi. 8) Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa, ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm. 9) O Onyenwe anyị, zọpụta eze! Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị! Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!