Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Proverbs Chapter 5 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Proverbs/5 1) Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m, gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a. 2) Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma. 3) Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ. 4) Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ. 5) Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. (Sheol h7585) 6) Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a. 7) Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu. 8) Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ! Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso, 9) ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ, maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere. 10) Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị, ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ. 11) Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị. 12) Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị! “Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya! 13) Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m. 14) Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi nʼihu ọha mmadụ niile.” 15) Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị. 16) Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama? 17) Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị, nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya. 18) Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị. 19) Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla. 20) Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko? Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi? 21) Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya, ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ. 22) Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi; mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya. 23) Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị; ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!