Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Job Chapter 9 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Job/9 1) Job zara sị: 2) “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke? 3) Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya? 4) Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ? 5) Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya. 6) Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji. 7) Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye. 8) Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri. 9) Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe. 10) Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta. 11) Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya. 12) Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’ 13) Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya. 14) “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka? 15) Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere. 16) A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị. 17) Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya. 18) Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m. 19) Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya. 20) A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara. 21) “Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị ejighị m onwe m kpọrọ ihe; nʼezie ana m eleda ndụ m anya. 22) Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’ 23) Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị. 24) Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya? 25) “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya. 26) Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri. 27) Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’ 28) Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha. 29) Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu? 30) A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ, 31) ị ga-enuba m nʼolulu apịtị nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị. 32) “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe. 33) A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị, onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya, 34) onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ, ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ. 35) Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu; ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!