Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Job Chapter 13 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Job/13 1) “Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile, ntị m anụla ma ghọtakwa ha. 2) Mụ onwe m makwa ihe unu maara; abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ. 3) Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu, ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m. 4) Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ; unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru. 5) Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị, nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe. 6) Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m; geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta. 7) Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide? Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya? 8) Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe? Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke? 9) Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu? Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ? 10) Ọ ghaghị ịbara unu mba ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka. 11) Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji? Egwu ya ọ dịghị atụ unu? 12) Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ; okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ. 13) “Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu; ihe ọ pụtara ya pụta. 14) Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu, werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m? 15) A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m. Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha. 16) Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya. 17) Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m. Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị. 18) Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro, amatala m na ikpe agaghị ama m. 19) Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo? Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ. 20) “Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke, mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị. 21) Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ. Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji. 22) Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị. Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m. 23) Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere? Gosi m ajọ omume m na mmehie m. 24) Gịnị mere i ji gbakụta m azụ? Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị? 25) Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ? Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ? 26) Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m, na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m. 27) Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ; na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ. 28) “Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere, na dịka akwa nke nla riri. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!