< Revelation 14 >

1 Mo sì wo, si kíyèsi i, Ọ̀dọ́-Àgùntàn náà dúró lórí òkè Sioni, àti pẹ̀lú rẹ̀ ọ̀kẹ́ méje ó lé ẹgbàajì ènìyàn; wọ́n ní orúkọ rẹ̀, àti orúkọ baba rẹ̀ tí a kọ sí iwájú orí wọn.
Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha.
2 Mo sì gbọ́ ohùn kan láti ọ̀run wá, bí ariwo omi púpọ̀, àti bí sísán àrá ńlá, mo sì gbọ́ àwọn aludùùrù tí wọn ń lu dùùrù.
Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.
3 Wọ́n sì ń kọ bí ẹni pé orin tuntun níwájú ìtẹ́ náà, àti níwájú àwọn ẹ̀dá alààyè mẹ́rin n nì àti àwọn àgbà náà, kò sì ṣí ẹni tí o lè kọ orin náà, bí kò ṣe àwọn ọ̀kẹ́ méje ó lé ẹgbàajì ènìyàn, tí a tí rà padà láti inú ayé wá.
Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta.
4 Àwọn wọ̀nyí ni a kò fi obìnrin sọ di èérí, nítorí tí wọ́n jẹ́ wúńdíá. Àwọn wọ̀nyí ni o ń tọ Ọ̀dọ́-àgùntàn náà lẹ́yìn níbikíbi tí o bá ń lọ. Àwọn wọ̀nyí ni a rà padà láti inú àwọn ènìyàn wá, wọ́n jẹ́ àkọ́so fún Ọlọ́run àti fún Ọ̀dọ́-Àgùntàn náà.
Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.
5 A kò sì rí èké lẹ́nu wọn, wọn jẹ́ aláìlábùkù.
Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
6 Mo sì rí angẹli mìíràn ń fò ní àárín méjì ọ̀run, pẹ̀lú ìyìnrere àìnípẹ̀kun láti wàásù fún àwọn tí ń gbé orí ilẹ̀ ayé, àti fún gbogbo orílẹ̀, àti ẹ̀yà, àti èdè, àti ènìyàn. (aiōnios g166)
Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa. (aiōnios g166)
7 Ó ń wí ni ohùn rara pé, “Ẹ bẹ̀rù Ọlọ́run, kí ẹ sì fi ògo fún un, nítorí tí wákàtí ìdájọ́ rẹ̀ dé: ẹ sì foríbalẹ̀ fún ẹni tí o dá ọ̀run, àti ayé, àti Òkun, àti àwọn orísun omi!”
O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.”
8 Angẹli mìíràn sì tẹ̀lé e, ó ń wí pé, “o ṣubú, Babeli ńlá ṣubú, èyí ti o tí ń mú gbogbo orílẹ̀-èdè mu nínú ọtí wáìnì àìmọ́ àgbèrè rẹ̀!”
Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”
9 Angẹli mìíràn, ẹ̀kẹta, sì tẹ̀lé wọn, ó ń wí ni ohùn rara pé, “Bí ẹnikẹ́ni bá ń foríbalẹ̀ fún ẹranko náà àti àwòrán rẹ̀, tí ó sì gba àmì sí iwájú orí rẹ̀ tàbí sí ọwọ́ rẹ̀.
Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya,
10 Òun pẹ̀lú yóò mú nínú ọtí wáìnì ìbínú Ọlọ́run, tí a dà ní ẹ̀kúnrẹ́rẹ́ sínú ago ìrunú rẹ̀; a ó sì fi iná sulfuru dá a lóró níwájú àwọn angẹli mímọ́, àti níwájú Ọ̀dọ́-àgùntàn.
ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.
11 Èéfín ìdálóró wọn ń lọ sókè títí láéláé wọn kò sì ní ìsinmi ni ọ̀sán àti ní òru, àwọn tí ń foríbalẹ̀ fún ẹranko náà àti fún àwòrán rẹ̀, àti ẹnikẹ́ni tí o ba sì gba àmì orúkọ rẹ̀.” (aiōn g165)
Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya. (aiōn g165)
12 Níhìn-ín ni sùúrù àwọn ènìyàn mímọ́ gbé wà: àwọn tí ń pa òfin Ọlọ́run àti ìgbàgbọ́ Jesu mọ́.
Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”
13 Mo sì gbọ́ ohùn kan láti ọ̀run wá ń wí fún mi pé, “Kọ̀wé rẹ̀, Alábùkún fún ni àwọn òkú tí o kú nínú Olúwa láti ìhín lọ.” Alábùkún ni wọ́n nítòótọ́, bẹ́ẹ̀ ni, Ẹ̀mí wí, “Nítorí tí wọn yóò sinmi kúrò nínú làálàá wọn, nítorí iṣẹ́ wọn ń tọ̀ wọn lẹ́yìn.”
Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.
14 Mo sì wo, sì kíyèsi i, ìkùùkuu àwọsánmọ̀ funfun kan, àti lórí ìkùùkuu àwọsánmọ̀ náà ẹnìkan jókòó tí o dàbí “ọmọ ènìyàn,” tí òun ti adé wúrà ní orí rẹ̀, àti dòjé mímú ni ọwọ́ rẹ̀.
Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya.
15 Angẹli mìíràn sì tí inú tẹmpili jáde wa tí ń ké lóhùn rara sí ẹni tí ó jókòó lórí ìkùùkuu àwọsánmọ̀ náà pé, “Tẹ dòjé rẹ bọ̀ ọ́, kí ó sì máa kórè; nítorí àkókò àti kórè dé, nítorí ìkórè ayé ti gbó tán.”
Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.”
16 Ẹni tí ó jókòó lórí ìkùùkuu àwọsánmọ̀ náà sì tẹ dòjé rẹ̀ bọ orí ilẹ̀ ayé; a sì ṣe ìkórè ilẹ̀ ayé.
Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi.
17 Angẹli mìíràn sì tí inú tẹmpili tí ń bẹ ni ọ̀run jáde wá, òun pẹ̀lú sì ní dòjé mímú, kan.
Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.
18 Angẹli mìíràn sì tí ibi pẹpẹ jáde wá, tí ó ní agbára lórí iná; ó sì ké ni ohùn rara sí ẹni tí o ni dòjé mímú náà, wí pé, “Tẹ dòjé rẹ mímú bọ̀ ọ́, ki ó sì rẹ́ àwọn ìdì àjàrà ayé, nítorí àwọn èso rẹ̀ tí pọ́n.”
Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.”
19 Angẹli náà sì tẹ dòjé rẹ̀ bọ ilẹ̀ ayé, ó sì gé àjàrà ilẹ̀ ayé, ó sì kó o lọ sínú ìfúntí, ìfúntí ńlá ìbínú Ọlọ́run.
Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.
20 A sì tẹ ìfúntí náà lẹ́yìn òde ìlú náà, ẹ̀jẹ̀ sì ti inú ìfúntí náà jáde, ó sì ga sókè dé okùn ìjánu ẹṣin, èyí tí ìnàsílẹ̀ rẹ to ẹ̀gbẹjọ̀ ibùsọ̀.
A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.

< Revelation 14 >