< Psalms 96 >
1 Ẹ kọrin tuntun sí Olúwa, ẹ kọrin sí Olúwa gbogbo ayé.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.
2 Ẹ kọrin sí Olúwa, yin orúkọ rẹ̀ ẹ sọ ti ìgbàlà rẹ̀ ní ọjọ́ dé ọjọ́.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
3 Ẹ sọ ti ògo rẹ̀ láàrín àwọn orílẹ̀-èdè àti iṣẹ́ ìyanu rẹ̀ láàrín gbogbo ènìyàn.
Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
4 Nítorí títóbi ní Olúwa ẹni tí ìyìn tọ́ sí; òun ní o yẹ kí a bẹ̀rù ju gbogbo òrìṣà lọ.
Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
5 Nítorí asán ni gbogbo àwọn òrìṣà orílẹ̀-èdè ṣùgbọ́n Olúwa dá àwọn ọ̀run.
Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
6 Ọlá àti ọláńlá wà ní iwájú rẹ̀ agbára àti ògo wà ní ibi mímọ́ rẹ̀.
Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.
7 Ẹ fi fún Olúwa, ẹ̀yin ìbátan ènìyàn, ẹ fi agbára àti ògo fún Olúwa.
Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
8 Ẹ fi ògo tí ó tọ́ sí Olúwa fún un; ẹ mú ọrẹ wá, kí ẹ sì wá sí àgbàlá rẹ̀.
Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.
9 Ẹ máa sin Olúwa nínú ẹwà ìwà mímọ́ rẹ̀; ẹ wárìrì níwájú rẹ̀ gbogbo ayé.
Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.
10 Sọ láàrín àwọn orílẹ̀-èdè, “Olúwa jẹ ọba.” A fi ìdí ayé múlẹ̀, tí kò sì lè yí; ẹni tí yóò fi òtítọ́ ṣe ìdájọ́ ènìyàn.
Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
11 Jẹ́ kí àwọn ọ̀run kí ó yọ̀, kí ayé sì pariwo jẹ́ kí pápá òkun kí ó hó pẹ̀lú ohun gbogbo tí ń bẹ nínú rẹ̀.
Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya.
12 Jẹ́ kí oko kún fún ayọ̀, àti ohun gbogbo tí ń bẹ nínú rẹ̀; nígbà náà ni gbogbo igi igbó yóò máa yọ̀.
Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ.
13 Wọn yóò kọrin níwájú Olúwa, nítorí tí ó ń bọ̀ wá, ó ń bọ̀ wá ṣe ìdájọ́ ayé. Yóò fi òdodo ṣe ìdájọ́ ayé àti ti àwọn ènìyàn ni yóò fi òtítọ́ rẹ̀ ṣe.
Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.