< Psalms 81 >

1 Fún adarí orin. Gẹ́gẹ́ bí ti gittiti. Ti Asafu. Kọrin sókè sí Ọlọ́run agbára wa ẹ hó ìhó ayọ̀ sí Ọlọ́run Jakọbu!
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ nke Asaf nʼusoro gittit. Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ, tikusie Chineke Jekọb mkpu ike!
2 Ẹ mú orin mímọ́, kí ẹ sì mú ìlù wá, tẹ dùùrù dídùn pẹ̀lú ohun èlò orin mímọ́.
Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une.
3 Ẹ fún ìpè ní oṣù tuntun àní nígbà tí a yàn; ní ọjọ́ àjọ wa tí ó ní ìrònú.
Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị;
4 Èyí ni àṣẹ fún Israẹli, àti òfin Ọlọ́run Jakọbu.
nke a bụ iwu dịrị Izrel, ụkpụrụ Chineke nke Jekọb.
5 Ó fi múlẹ̀ gẹ́gẹ́ bí ìlànà fún Josẹfu nígbà tí ó la ilẹ̀ Ejibiti já. Níbi tí a ti gbọ́ èdè tí kò yé wa.
O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị:
6 Ó wí pé, “Mo gbé àjàgà kúrò ní èjìká yín, a tú ọwọ́ wọn sílẹ̀ kúrò nínú apẹ̀rẹ̀.
“Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ.
7 Nínú ìnilára ni ẹ pè mo sì gbà yín là, mo dá a yín lóhùn nínú ìkọ̀kọ̀ àrá, mo dán an yín wò ní odò Meriba. (Sela)
Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke Meriba. (Sela)
8 “Gbọ́, ẹ̀yin ènìyàn mi, èmi ó sì kìlọ̀ fún un yín, bí ìwọ bá fetí sí mi, ìwọ Israẹli.
“Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel!
9 Ẹ̀yin kì yóò ní Ọlọ́run ilẹ̀ mìíràn láàrín yín; ẹ̀yin kì yóò foríbalẹ̀ fún Ọlọ́run àjèjì.
Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ.
10 Èmi ni Olúwa Ọlọ́run rẹ, ẹni tí ó mú un yín jáde láti Ejibiti. Ẹ la ẹnu yín gbòòrò, èmi yóò sì kún un.
Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.
11 “Ṣùgbọ́n àwọn ènìyàn mi kì yóò gbọ́ tèmi; Israẹli kò ní tẹríba fún mi.
“Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha.
12 Nítorí náà ni mo ṣe fi wọ́n fún ọkàn líle wọn láti máa rìn ní ọ̀nà ẹ̀tàn wọn.
Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha.
13 “Bí àwọn ènìyàn mi yóò bá gbọ́ tèmi bí Israẹli yóò bá tẹ̀lé ọ̀nà mi,
“Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile.
14 ní kánkán ni èmi yóò ṣẹ́gun àwọn ọ̀tá wọn kí n sì yí ọwọ́ mi padà sí ọ̀tá wọn!
Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile.
15 Àwọn tí ó kórìíra Olúwa yóò tẹríba níwájú rẹ̀. Ìjìyà wọn yóò sì pẹ́ títí láé.
Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi.
16 Ṣùgbọ́n a ó fi ọkà tí ó dára bọ́ ọ yín èmi ó tẹ́ ẹ yín lọ́rùn pẹ̀lú oyin inú àpáta.”
Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”

< Psalms 81 >