< Psalms 72 >
1 Ti Solomoni. Fi ìdájọ́ fún àwọn ọba, Ọlọ́run, ọmọ-aládé ni ìwọ fi òdodo rẹ fún.
Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị.
2 Yóò ṣe ìdájọ́ àwọn ènìyàn rẹ̀ pẹ̀lú òdodo, yóò sì máa fi ẹ̀tọ́ ṣe ìdájọ́ àwọn tálákà rẹ̀.
Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.
3 Àwọn òkè ńlá yóò máa mú àlàáfíà fún àwọn ènìyàn àti òkè kéékèèké nípa òdodo.
Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.
4 Yóò dáàbò bo àwọn tí a pọ́n lójú láàrín àwọn ènìyàn yóò gba àwọn ọmọ aláìní; yóò sì fa àwọn aninilára ya.
Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu.
5 Àwọn òtòṣì àti aláìní yóò máa fi ọ̀wọ̀ ńlá fún ọ nígbà gbogbo, níwọ̀n ìgbà tí oòrùn àti òṣùpá bá ń ràn, yóò ti pẹ́ tó, láti ìrandíran.
Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide, dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.
6 Yóò dàbí òjò tí ó ń rọ̀ sórí pápá ìrẹ́mọ́lẹ̀, bí ọwọ́ òjò tó ń rin ilẹ̀.
Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
7 Àwọn olódodo yóò gbilẹ̀ ni ọjọ́ rẹ̀ ọ̀pọ̀lọpọ̀ àlàáfíà yóò sì wà; títí tí òṣùpá kò fi ní sí mọ́.
Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.
8 Yóò máa jẹ ọba láti òkun dé òkun àti láti odò Eufurate títí dé òpin ayé.
Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa
9 Àwọn tí ó wà ní aginjù yóò tẹríba fún un àwọn ọ̀tá rẹ̀ yóò máa lá erùpẹ̀ ilẹ̀.
Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya, ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.
10 Àwọn ọba Tarṣiṣi àti ti erékùṣù wọn yóò mú ọrẹ wá fún un; àwọn ọba Ṣeba àti Seba wọn ó mú ẹ̀bùn wá fún un.
Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya, ga-atụ ụtụ wetara ya; e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba, ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.
11 Gbogbo ọba yóò tẹríba fún un àti gbogbo orílẹ̀-èdè yóò sìn ín.
Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, mba niile ga-ejekwara ya ozi.
12 Nítorí yóò gba àwọn aláìní nígbà tí ó bá ń ké, tálákà àti ẹni tí kò ní olùrànlọ́wọ́.
Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.
13 Yóò káàánú àwọn aláìlera àti aláìní yóò pa aláìní mọ́ kúrò nínú ikú.
Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.
14 Yóò ra ọkàn wọn padà lọ́wọ́ ẹ̀tàn àti ipá nítorí ẹ̀jẹ̀ wọn ṣọ̀wọ́n níwájú rẹ̀.
Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike, nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.
15 Yóò sì pẹ́ ní ayé! A ó sì fún un ní wúrà Ṣeba. Àwọn ènìyàn yóò sì máa gbàdúrà fún un nígbà gbogbo kí a sì bùkún fún un lójoojúmọ́.
Ka ọ dị ogologo ndụ! Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba. Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile, ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.
16 Kí ìkúnwọ́ ọkà wà lórí ilẹ̀; ní orí òkè ni kí ó máa dàgbà kí èso rẹ̀ kí o gbilẹ̀ bí ti Lebanoni yóò máa gbá yìn bí i koríko ilẹ̀.
Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a; ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile. Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn; ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.
17 Kí orúkọ rẹ̀ kí ó wà títí láé; orúkọ rẹ̀ yóò máa gbilẹ̀ níwọ̀n bí oòrùn yóò ti pẹ́ tó. Wọn ó sì máa bùkún fún ara wọn nípasẹ̀ rẹ. Gbogbo àwọn orílẹ̀-èdè ní yóò máa pè mí ní alábùkún fún.
Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.
18 Olùbùkún ni Olúwa Ọlọ́run, Ọlọ́run Israẹli, ẹnìkan ṣoṣo tí ó ń ṣe ohun ìyanu.
Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.
19 Olùbùkún ni orúkọ rẹ̀ tí ó lógo títí láé; kí gbogbo ayé kún fún ògo rẹ̀.
Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.
20 Èyí ni ìparí àdúrà Dafidi ọmọ Jese.
Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.