< Psalms 58 >
1 Fún adarí orin. Tí ohùn “Má ṣe parun.” Ti Dafidi. Miktamu. Ẹ̀yin ha ń sọ òdodo nítòótọ́ ẹ̀yin ìjọ ènìyàn? Ǹjẹ́ ẹ̀yin ń ṣe ìdájọ́ tí ó ṣe títọ́ ẹ̀yìn ọmọ ènìyàn?
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Devid. Abụ miktam. Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi? O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?
2 Bẹ́ẹ̀ kọ́, nínú ọkàn yín ẹ̀yìn ń gbèrò àìṣòdodo, ọwọ́ yín sì tú ìwà ipá jáde ni ayé.
Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu, aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.
3 Ní inú ìyá wọn wá ni ènìyàn búburú tí ṣìnà, lójúkan náà tí a ti bí wọn, wọn a máa ṣèké.
Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.
4 Oró wọn dàbí oró ejò, wọn dàbí adití ejò paramọ́lẹ̀ tí ó di ara rẹ̀ ni etí,
Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,
5 tí kò ní gbọ́ ìpè àwọn atunilójú, bí ó ti wù kí ó máa fi ọgbọ́n ṣe ìtujú tó.
nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.
6 Ká eyín ẹnu wọn, Ọlọ́run; ní ẹnu wọn, ká ọ̀gàn àwọn ọmọ kìnnìún, Olúwa.
O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ; o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!
7 Jẹ́ kí wọn parẹ́ bí omi tó ń sàn lọ; nígbà tí ó bá fa ọfà rẹ̀, kí ọ̀kọ̀ wọn kí ó ṣẹ́.
Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.
8 Jẹ́ kí wọn rí bí ìgbín tí rẹ̀ dànù tí ó sì ṣègbé bí ọmọ tí oṣù rẹ̀ kò pé, kí wọn má ṣe rí oòrùn.
Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.
9 Kí ìkòkò yín kí ó tó mọ ìgbóná ẹ̀gún; bóyá ní tútù tàbí ní gbígbẹ, yóò fi ìjì gbá wọn lọ.
Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.
10 Olódodo yóò yọ̀ nígbà a bá ń gbẹ̀san wọn, nígbà tí wọn bá wẹ ẹsẹ̀ wọn nínú ẹ̀jẹ̀ ènìyàn búburú.
Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.
11 Àwọn ènìyàn yóò wí pé, “Lóòtítọ́ èrè àwọn ń bẹ fún olódodo; lóòtítọ́ òun ni Ọlọ́run tí ń ṣe ìdájọ́ ní ayé.”
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị, “Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ; nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”