< Psalms 147 >
1 Ẹ fi ìyìn fún Olúwa. Nítorí ohun rere ni láti máa kọrin ìyìn sí Ọlọ́run wa, ó yẹ láti kọrin ìyìn sí i!
Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!
2 Olúwa kọ́ Jerusalẹmu; Ó kó àwọn Israẹli tí a lé sọnù jọ.
Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.
3 Ó wo àwọn tí ọkàn wọ́n bàjẹ́ sàn ó sì di ọgbẹ́ wọ́n.
Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
4 Ó ka iye àwọn ìràwọ̀ ó sì pe ọ̀kọ̀ọ̀kan wọn ní orúkọ.
Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu.
5 Títóbi ni Olúwa wa ó sì pọ̀ ní agbára òye rẹ̀ kò sì ní òpin.
Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ.
6 Olúwa wa pẹ̀lú àwọn onírẹ̀lẹ̀ bẹ́ẹ̀ ni ó rẹ̀ àwọn ènìyàn búburú sílẹ̀.
Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
7 Fi ọpẹ́ kọrin sí Olúwa fi ohun èlò orin olókùn yin Ọlọ́run.
Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
8 Ó fi ìkùùkuu bo àwọ̀ sánmọ̀ ó rọ òjò sí orílẹ̀ ayé ó mú kí koríko hù lórí àwọn òkè
Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
9 Ó pèsè oúnjẹ fún àwọn ẹranko àti fún àwọn ọmọ ẹyẹ ìwò ní ìgbà tí wọ́n bá ń ké.
Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.
10 Òun kò ní inú dídùn nínú agbára ẹṣin, bẹ́ẹ̀ ni Òun kò ní ayọ̀ sí ẹ̀ṣẹ̀ ọkùnrin
Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
11 Olúwa ni ayọ̀ nínú àwọn tí ó bẹ̀rù rẹ̀, sí àwọn tí ó ní ìrètí nínú àánú rẹ̀.
Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
12 Yin Olúwa, ìwọ Jerusalẹmu; yin Ọlọ́run rẹ, ìwọ Sioni.
O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị.
13 Nítorí tí ó ti mú ọ̀pá ìdábùú ibodè rẹ̀ lágbára, Òun sì ti bùkún fún àwọn ọmọ rẹ̀ nínú rẹ
Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
14 Òun jẹ́ kí àlàáfíà wà ní àwọn ẹnu ibodè rẹ̀, òun sì fi jéró dáradára tẹ́ ọ lọ́rùn.
Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.
15 Òun sì rán àṣẹ rẹ̀ sí ayé ọ̀rọ̀ rẹ̀ sáré tete.
Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.
16 Ó fi yìnyín fún ni bi irun àgùntàn ó sì fọ́n ìrì dídì ká bí eérú
Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.
17 Ó rọ òjò yìnyín rẹ̀ bí òkúta wẹ́wẹ́ ta ni ó lè dúró níwájú òtútù rẹ̀
Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?
18 Ó rán ọ̀rọ̀ rẹ̀ jáde ó sì mú wọn yọ̀ ó mú kí afẹ́fẹ́ rẹ̀ fẹ́ ó sì mú odò rẹ̀ sàn.
Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha; ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị.
19 Ó sọ ọ̀rọ̀ rẹ̀ di mí mọ̀ fún Jakọbu àwọn òfin àti ìlànà rẹ̀ fún Israẹli.
O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.
20 Òun kó tí ṣe irú èyí sí orílẹ̀-èdè kan rí, bí ó ṣe ti ìdájọ́ rẹ̀ wọn ko mọ òfin rẹ̀. Ẹ fi ìyìn fún Olúwa.
O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị!