< Psalms 110 >

1 Ti Dafidi. Saamu. Olúwa sọ fún Olúwa mi pé, “Ìwọ jókòó ní ọwọ́ ọ̀tún mi, títí èmi yóò fi sọ àwọn ọ̀tá rẹ di àpótí ìtìsẹ̀ rẹ.”
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”
2 Olúwa yóò na ọ̀pá agbára rẹ̀ láti Sioni wá, ìwọ jẹ ọba láàrín àwọn ọ̀tá rẹ.
Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.
3 Àwọn ènìyàn rẹ jẹ́ ọ̀rẹ́ àtinúwá ní ọjọ́ ìjáde ogun rẹ, nínú ẹwà mímọ́, láti inú òwúrọ̀ wá ìwọ ni ìrì ẹwà rẹ.
Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.
4 Olúwa ti búra, kò sì í yí ọkàn padà pé, “Ìwọ ni àlùfáà, ní ipasẹ̀ Melkisedeki.”
Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.”
5 Olúwa, ọwọ́ ọ̀tún rẹ̀ ni yóò lu àwọn ọba bolẹ̀ ni ọjọ́ ìbínú rẹ̀.
Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.
6 Yóò ṣe ìdájọ́ láàrín kèfèrí, yóò kún ibùgbé wọn pẹ̀lú òkú ara; yóò fọ́n àwọn olórí ká sí orí ilẹ̀ ayé tí ó gbòòrò.
Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ, ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.
7 Yóò mu nínú odò ṣíṣàn ní ọ̀nà: nítorí náà ni yóò ṣe gbé orí sókè.
Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ; nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.

< Psalms 110 >