< Psalms 11 >

1 Fún adarí orin. Ti Dafidi. Ìgbẹ́kẹ̀lé mi wà nínú Olúwa. Báwo ní ẹ̀yin ó ṣe sọ fún ọkàn mi pé, “Fò gẹ́gẹ́ bi ẹyẹ lọ si orí òkè rẹ.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m. Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, “Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”
2 Wò ó nítorí náà, ènìyàn búburú fa ọfà rẹ̀; wọn ti fi ọfà wọn sí ojú okùn láti tafà níbi òjìji sí àyà ẹni ìdúró ṣinṣin.
Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.
3 Nígbà tí ìpìlẹ̀ bá bàjẹ́ kí ni olódodo yóò ṣe?”
Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?
4 Olúwa ń bẹ nínú tẹmpili mímọ́ rẹ̀; Olúwa ń bẹ lórí ìtẹ́ rẹ̀ ní ọ̀run. Ó ń wo àwọn ọmọ ènìyàn; ojú rẹ̀ ń yẹ̀ wọ́n wò.
Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.
5 Olúwa ń yẹ olódodo wò, ṣùgbọ́n ènìyàn búburú àti àwọn tí o fẹ́ ìwà ipá ni ọkàn rẹ̀ kórìíra.
Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.
6 Sí orí àwọn ènìyàn búburú ni yóò rọ̀jò ẹ̀yín iná àti imí-ọjọ́ tí ń jó; àti ìjì gbígbóná ní yóò jẹ ìpín wọn.
Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.
7 Nítorí, olódodo ní Olúwa, o fẹ́ràn òdodo; ẹni ìdúró ṣinṣin yóò sì rí i.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

< Psalms 11 >