< Philemon 1 >
1 Èmi Paulu, ẹni tí a fi sẹ́wọ̀n nítorí pé ó ń wàásù ìyìnrere Jesu Kristi àti Timotiu arákùnrin wa, Sí Filemoni ọ̀rẹ́ wa ọ̀wọ́n àti alábáṣiṣẹ́ wa,
Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na site nʼaka nwanna anyị Timoti, Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn.
2 sí Affia arábìnrin wa, sí Arkippu ẹni tó jẹ́ jagunjagun fún àgbélébùú náà àti sí ìjọ àwọn Kristiani tí ó ń pàdé nínú ilé rẹ:
Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipos onye anyị na ya so na-alụ agha a.
3 Oore-ọ̀fẹ́ fún un yín àti àlàáfíà láti ọ̀dọ̀ Ọlọ́run Baba wa àti Jesu Kristi.
Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị unu.
4 Èmi máa ń dúpẹ́ lọ́wọ́ Ọlọ́run nígbà tí mo bá rántí rẹ nínú àdúrà mi,
Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe.
5 nítorí mo ń gbọ́ nípa ìgbàgbọ́ rẹ nínú Jesu Olúwa àti nípa ìfẹ́ rẹ sí àwọn ènìyàn mímọ́.
Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile.
6 Èmi ń gbàdúrà pé, bí ìwọ ti ń ṣe alábápín nínú ìgbàgbọ́ rẹ pẹ̀lú àwọn ẹlòmíràn, pé kí ìgbàgbọ́ náà lè mú ọkàn wọn dúró gbọingbọin, gẹ́gẹ́ bí wọn ti rí àwọn ọ̀rọ̀ ohun rere tí ó ń bẹ nínú ayé rẹ, èyí tí ó ti ọ̀dọ̀ Kristi wá.
Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst.
7 Ìfẹ́ rẹ ti fún mi ní ayọ̀ púpọ̀ àti ìgboyà, nítorí ìwọ, arákùnrin ti tu ọkàn àwọn ènìyàn mímọ́ lára.
Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.
8 Nítorí náà, bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé nínú Kristi mo ní ìgboyà púpọ̀ láti pàṣẹ ohun ti ó yẹ kí ó ṣe fún ọ,
Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a.
9 síbẹ̀ nítorí ìfẹ́ èmí kúkú bẹ̀ ọ́. Èmi gẹ́gẹ́ bí Paulu, arúgbó, àti nísinsin yìí òǹdè Jesu Kristi.
Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a.
10 Èmí bẹ̀ ọ́ nítorí ọmọ mi Onesimu, ẹni tí ó di ọmọ nígbà tí mo wà nínú ìdè.
Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ.
11 Nígbà kan rí, kò wúlò fún ọ, ṣùgbọ́n ní báyìí, ó ti wúlò fún ọ àti fún èmi pàápàá.
Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru.
12 Èmi rán an nísinsin yìí, àní ẹni ọkàn mi padà sí ọ̀dọ̀ rẹ.
Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị.
13 Èmi ìbá fẹ́ láti dá a dúró sọ́dọ̀ mi níhìn-ín, kí ó ba à dípò rẹ láti máa ràn mí lọ́wọ́ nígbà tí mo wà nínú ìdè nítorí ìyìnrere
Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma.
14 ṣùgbọ́n èmi kò fẹ́ ṣe bẹ́ẹ̀ rárá láìgba ìyọ̀ǹda ní ọwọ́ rẹ, kí oore tí ìwọ bá ṣe má ba à jẹ́ ìfipámúniṣe bí kò ṣe ìfìfẹ́ṣe.
Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta.
15 Bóyá ìdí rẹ̀ tí òun fi yẹra kúrò lọ́dọ̀ rẹ fún ìgbà díẹ̀ ni pé kí ìwọ kí ó lè gbà á padà sọ́dọ̀ títí láé. (aiōnios )
Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. (aiōnios )
16 Kì í wá ṣe bí ẹrú mọ́, ṣùgbọ́n bí ẹni ti ó sàn ju ẹrú lọ, gẹ́gẹ́ bí arákùnrin. Ó ṣọ̀wọ́n fún mi jọjọ, ṣùgbọ́n ó ṣọ̀wọ́n fún ọ jù nípa ti ara àti gẹ́gẹ́ bí arákùnrin nínú Olúwa.
Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị.
17 Nítorí náà bí ìwọ bá kà mí sí ẹlẹgbẹ́ rẹ̀, tẹ́wọ́ gbà á bí ìwọ yóò ti tẹ́wọ́ gbà mí.
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m.
18 Bí ó bá ti ṣe ọ́ ní ibi kan tàbí jẹ ọ́ ní gbèsè ohun kan, kà á sí mi lọ́rùn.
Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị.
19 Èmi Paulu, ni mo fi ọwọ́ ara mi kọ ìwé yìí; èmi yóò san án padà láì tilẹ̀ ní í sọ nípa pé ìwọ pàápàá jẹ mi ní gbèsè ara rẹ.
Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị.
20 Èmi ń fẹ́ arákùnrin, pé kí èmi kí ó lè ni àǹfààní kan láti ọ̀dọ̀ rẹ nínú Olúwa; fi ayọ̀ rẹ kún ọkàn mi nínú Kristi.
Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi Onyenwe anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime Kraịst.
21 Ìgbẹ́kẹ̀lé ti mo ní pé ìwọ yóò gbọ́rọ̀, ni mo fi kọ ìwé yìí ránṣẹ́ sí ọ. Mo mọ̀ dájú pé ìwọ yóò ṣe ju bí mo ti béèrè lọ.
Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ.
22 Ó ku ohun kan, ṣe ìtọ́jú iyàrá àlejò rẹ sílẹ̀ fún mi, nítorí mo ní ìgbàgbọ́ pé a óò tú mi sílẹ̀ fún yín ní ìdáhùn sí àdúrà yín.
Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu.
23 Epafira, òǹdè ẹlẹgbẹ́ mi nínú Kristi Jesu kí ọ.
Epafras, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-ekele gị.
24 Marku kí ọ pẹ̀lú Aristarku, Dema àti Luku, àwọn alábáṣiṣẹ́ mi.
Mak, na Arịstakọs, na Dimas, na Luk, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu.
25 Kí oore-ọ̀fẹ́ Jesu Kristi Olúwa wa wà pẹ̀lú ẹ̀mí yín.
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.