< Numbers 5 >

1 Olúwa sọ fún Mose pé,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 “Pàṣẹ fún àwọn ọmọ Israẹli pé kí wọn ó lé ẹnikẹ́ni tó bá ní ẹ̀tẹ̀, ìtújáde ara ní oríṣìíríṣìí tàbí ẹni tó jẹ́ aláìmọ́ nípa fífọwọ́ kan òkú.
“Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka.
3 Irú ẹni bẹ́ẹ̀ yálà ọkùnrin tàbí obìnrin, ẹ lé wọn jáde kúrò nínú ibùdó kí wọn má ba à ba ibùdó wọn jẹ́ níbi tí èmi ń gbé láàrín wọn.”
Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu.”
4 Àwọn ọmọ Israẹli sì ṣe bẹ́ẹ̀; wọ́n lé wọn jáde kúrò nínú ibùdó. Wọn ṣe gẹ́gẹ́ bí Olúwa ti sọ fún Mose.
Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
5 Olúwa sọ fún Mose pé,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
6 “Sọ fún àwọn ọmọ Israẹli: ‘Nígbà tí ọkùnrin kan tàbí obìnrin kan bá ṣẹ̀ ara wọn lọ́nà kan tàbí òmíràn, tí wọ́n sì ṣe àìṣòótọ́ sí Olúwa, ẹni náà jẹ̀bi.
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara.
7 Ó gbọdọ̀ jẹ́wọ́ ẹ̀ṣẹ̀ tí ó sẹ̀. Ó gbọdọ̀ san ẹ̀san rẹ̀ ní ojú owó, kí ó sì fi ìdámárùn-ún rẹ̀ lé e, kí ó sì fi fún ẹni tí òun jẹ̀bi rẹ̀.
Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise.
8 Ṣùgbọ́n bí irú ẹni bẹ́ẹ̀ kò bá ní ìbátan tí ó súnmọ́ ọn tí ó lè ṣe àtúnṣe àṣìṣe rẹ̀ náà fún, àtúnṣe náà jẹ́ ti Olúwa, ẹ sì gbọdọ̀ ko fún àlùfáà pẹ̀lú àgbò tí a fi ṣe ètùtù fún ẹni náà.
Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere.
9 Gbogbo ọrẹ ohun mímọ́ tí àwọn ọmọ Israẹli bá mú wá fún àlùfáà jẹ́ tirẹ̀.
Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ.
10 Ọrẹ ohun mímọ́ ẹnìkọ̀ọ̀kan jẹ́ ti òun nìkan, ṣùgbọ́n ohunkóhun tó bá fún àlùfáà yóò jẹ́ ti àlùfáà.’”
Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’”
11 Olúwa sọ fún Mose wí pé,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
12 “Bá àwọn ọmọ Israẹli sọ̀rọ̀ kí o sọ fún wọn pé, ‘Bí ìyàwó ọkùnrin kan bá yapa tó sì ṣe àìṣòótọ́ sí i,
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ
13 nípa mímú kí ọkùnrin mìíràn bá a lòpọ̀ tí ó sì fi èyí pamọ́ fún ọkọ rẹ̀, tí a kò si gbá a mú nínú ìwà àìmọ́ rẹ̀ (nítorí pé kò sí ẹlẹ́rìí àti pé wọn kò ká a mọ́ nígbà tí ó ń dẹ́ṣẹ̀ náà).
site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ),
14 Ṣùgbọ́n tí ẹ̀mí owú jíjẹ bá bà lé ọkọ rẹ̀ dé bi pé ó ń funra sí ìyàwó rẹ̀ yìí tí ìyàwó rẹ̀ sì wà ní àìmọ́ nítòótọ́, tàbí tí ẹ̀mí owú bá bà lé ọkùnrin kan tó sì ń jowú ìyàwó rẹ̀ bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé ó wà ní mímọ́,
ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya,
15 nígbà náà ni ọkùnrin yìí yóò mú ìyàwó rẹ̀ lọ sọ́dọ̀ àlùfáà. Ọkùnrin náà yóò sì mú ọrẹ tí a yàn fún obìnrin náà, ìdámẹ́wàá òsùwọ̀n efa ìyẹ̀fun barle. Kò gbọdọ̀ da òróró sí i, bẹ́ẹ̀ ni kò gbọdọ̀ fi tùràrí dídùn sí i nítorí pé ẹbọ ohun jíjẹ fún owú ni, èyí ti n mú ẹ̀ṣẹ̀ wá sí ìrántí.
nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.
16 “‘Àlùfáà yóò sì mú un wá síwájú Olúwa.
“‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị.
17 Àlùfáà yóò sì bu erùpẹ̀ ilẹ̀ àgọ́ sínú omi mímọ́ tó bù láti ìkòkò amọ̀.
Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ.
18 Lẹ́yìn èyí, àlùfáà yóò mú obìnrin náà dúró níwájú Olúwa yóò sì tú irun orí obìnrin náà lé e lọ́wọ́, èyí ni ẹbọ ohun jíjẹ ti owú, àlùfáà fúnra rẹ̀ yóò sì gbé omi kíkorò tí ń mú ègún lọ́wọ́.
Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ.
19 Àlùfáà yóò sì mú obìnrin náà búra, yóò wí pé, “Bí ọkùnrin mìíràn kò bá bá ọ lòpọ̀, tí ó kò sì yapa, tí o kò sì di aláìmọ́ níwọ̀n ìgbà tí ó wà lábẹ́ àṣẹ ọkọ rẹ̀, a jẹ́ pé omi kíkorò tí ń mú ègún wá yìí kò ní ṣe ọ́ níbi.
Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ.
20 Ṣùgbọ́n tí ìwọ bá ti yapa kúrò lọ́dọ̀ ọkọ rẹ, tí o bá ti ba ara rẹ jẹ́ nípa jíjẹ́ kí ọkùnrin tí kì í ṣe ọkọ rẹ bá ọ lòpọ̀,”
Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,”
21 nígbà náà ni àlùfáà yóò mú obìnrin náà búra, yóò sọ fún obìnrin náà pé, “Kí Olúwa sọ ọ́ di ẹni ègún àti ẹni ìbáwí láàrín àwọn ènìyàn rẹ nípa mímú kí itan rẹ jẹrà, kí ikùn rẹ̀ sì wú.
(nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka Onyenwe anyị mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko.
22 Ǹjẹ́ kí omi yìí tí ń mú ègún wá wọ inú ara rẹ, kí ó mú ikùn rẹ̀ wú, kí ó sì mú itan rẹ̀ jẹrà dànù.” “‘Obìnrin náà yóò sì wí pé, “Àmín. Bẹ́ẹ̀ ni kó rí.”
Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.” “‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.”
23 “‘Nígbà náà ni àlùfáà yóò kọ ègún yìí sínú ìwé kíká, yóò sì sìn ín sínú omi kíkorò náà.
“‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ.
24 Àlùfáà yóò sì mú kí obìnrin náà mu omi kíkorò tí ń mú ègún wá yìí, omi náà yóò wọ inú rẹ̀ yóò sì fa ìrora kíkorò fún obìnrin náà bí ó bá jẹ̀bi.
Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu.
25 Àlùfáà yóò gba ọrẹ ohun jíjẹ owú náà lọ́wọ́ rẹ̀, yóò fì í síwájú Olúwa, yóò sì mú iná sórí pẹpẹ.
Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja.
26 Àlùfáà yóò bu ẹ̀kúnwọ́ kan nínú ọrẹ ohun jíjẹ náà, yóò sun ún lórí pẹpẹ gẹ́gẹ́ bí ẹbọ ìrántí lẹ́yìn tí ó ti mú kí obìnrin náà mu omi.
Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.
27 Bí ó bá ti mú obìnrin yìí mu omi náà, bí ó bá sì jẹ́ pé obìnrin náà ti ba ara rẹ̀ jẹ́, tí ó sì ṣe àìṣòótọ́ sí ọkọ rẹ̀, omi tí ń mú ègún wá, yóò wọ ara rẹ̀, yóò fa ìrora kíkorò fún un, ikùn rẹ̀ yóò wú, itan rẹ̀ yóò sì jẹrà dànù, yóò sì di ẹni ègún láàrín àwọn ènìyàn rẹ̀.
Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.
28 Ṣùgbọ́n tó bá jẹ́ pé obìnrin náà kò ba ara rẹ̀ jẹ́, tó sì jẹ́ mímọ́, yóò bọ́ nínú ẹ̀bi, yóò sì le bímọ.
Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.
29 “‘Èyí ni òfin owú jíjẹ nígbà tí obìnrin tó wà lábẹ́ ọkọ bá ṣe a ṣe má ṣe, tí ó bá ba ara rẹ̀ jẹ́,
“‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.
30 tàbí nígbà tí ẹ̀mí owú jíjẹ bá bà lé ọkùnrin kan nítorí pé ó funra sí ìyàwó rẹ̀. Àlùfáà yóò mú obìnrin náà dúró níwájú Olúwa yóò sì ṣe gẹ́gẹ́ bí òfin ti wí fún un.
Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.
31 Ara ọkọ rẹ̀ mọ́ nínú ẹ̀ṣẹ̀ yìí ṣùgbọ́n obìnrin náà yóò ru ẹ̀bi ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀.’”
A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’”

< Numbers 5 >