< Numbers 23 >

1 Balaamu wí fún Balaki pé, “Kọ́ pẹpẹ méje fún mi níbí, kí o sì mú akọ màlúù méje àti àgbò méje wá fún mi.”
Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.”
2 Balaki ṣe bí Balaamu ti sọ, àwọn méjèèjì fi akọ màlúù kọ̀ọ̀kan àti àgbò kọ̀ọ̀kan rú ẹbọ lórí pẹpẹ kọ̀ọ̀kan.
Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu.
3 Nígbà náà Balaamu sọ fún Balaki pé, “Dúró ti ẹbọ sísun rẹ kí èmi sì lọ sí ẹ̀gbẹ́ kan. Bóyá Olúwa yóò farahàn mí. Ohunkóhun tí ó bá fihàn mí, èmi yóò wí fún ọ.” Nígbà náà ó sì lọ sí ibi gíga.
Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị.
4 Ọlọ́run sì pàdé rẹ̀, Balaamu sì sọ pé, “Mo tí ṣe pẹpẹ méje, lórí pẹpẹ kọ̀ọ̀kan mo ti fi akọ màlúù àti àgbò kọ̀ọ̀kan rú ẹbọ.”
Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.”
5 Olúwa sì fi ọ̀rọ̀ sí ẹnu Balaamu ó wí pé, “Padà sí ọ̀dọ̀ Balaki kí o sì jẹ́ iṣẹ́ yìí fún un.”
Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”
6 Ó sì padà sí ọ̀dọ̀ rẹ̀ ó sì ba tí ó dúró ti ẹbọ sísun rẹ̀, pẹ̀lú gbogbo àwọn ìjòyè Moabu.
Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile.
7 Nígbà náà ni Balaamu sọ ọ̀rọ̀-ìjìnlẹ̀ jáde wí pé, “Balaki mú mi láti Aramu wá, ọba Moabu láti òkè ìlà-oòrùn wá Ó wí pé, ‘Wá fi Jakọbu bú fún mi; wá, kí o sì jẹ́rìí sí Israẹli.’
Nke a bụ ozi Belam ziri: “Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m. Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m. Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ bịa kwutọọ Izrel.
8 Báwo ní èmi ó ṣe fi bú àwọn tí Ọlọ́run kò fi bú? Báwo ni èmi ó ṣe bá wọn wí àwọn tí Olúwa kò bá wí?
M ga-esi aṅaa bụọ onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ? M ga-esi aṅaa kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?
9 Láti ṣóńṣó ibi gíga orí àpáta ni mo ti rí wọn, láti orí ibi gíga ni mo ti ń wò wọ́n. Mo rí àwọn ènìyàn tí ń gbé lọ́tọ̀ wọn kò sì ka ará wọn kún ara àwọn orílẹ̀-èdè.
Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha. Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ, hụ na ha bụ ndị biri onwe ha, ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ.
10 Ta ni ó lè ka eruku Jakọbu tàbí ka ìdámẹ́rin Israẹli? Jẹ́ kí èmi kú ikú olódodo, kí ìgbẹ̀yìn mi kí ó dà bí tirẹ̀!”
Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị? Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị. Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume. Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!”
11 Balaki sọ fún Balaamu pé, “Kí lo ṣe fún mi? Mo gbé ọ wá láti fi àwọn ọ̀tá mi bú, ṣùgbọ́n o kò ṣe nǹkan kan, ṣùgbọ́n o bùkún wọn!”
Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”
12 Ó sì dáhùn wí pé, “Ṣé kí n má sọ nǹkan tí Olúwa fi sí mi lẹ́nu?”
Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”
13 Nígbà náà Balaki sọ fún un pé, “Wá pẹ̀lú mi sí ibòmíràn tí o ti lè rí wọn; wà á rí díẹ̀, ṣùgbọ́n kì í ṣe gbogbo wọn. Láti ibẹ̀, wá fi wọ́n bú fún mi.”
Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
14 Ó sì lọ sí pápá Sofimu ní orí òkè Pisga, ó sì kọ́ pẹpẹ méje síbẹ̀ ó sì fi akọ màlúù àti àgbò kọ̀ọ̀kan rú ẹbọ lórí pẹpẹ kọ̀ọ̀kan.
Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.
15 Balaamu ṣo fún Balaki pé, “Dúró níbí ti ẹbọ sísun rẹ nígbà tí mo bá lọ pàdé rẹ̀ níbẹ̀.”
Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”
16 Olúwa pàdé Balaamu ó sì fi ọ̀rọ̀ sí ní ẹnu wí pé, “Padà lọ sí ọ̀dọ̀ Balaki kí o sì jíṣẹ́ fún un.”
Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.”
17 Nígbà náà ó lọ sí ọ̀dọ̀ rẹ̀ ó sì bá à tí ó dúró ti ẹbọ sísun rẹ̀ pẹ̀lú àwọn ìjòyè Moabu. Balaki sì béèrè lọ́wọ́ rẹ̀ pé, “Kí ni Olúwa wí?”
Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?”
18 Nígbà náà ó bẹ̀rẹ̀ ọ̀rọ̀ sísọ, “Dìde, Balaki; kí o sì gbọ́ mi ọmọ Sippori.
Ma Belam zaghachiri sị ya: “Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi. Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa.
19 Ọlọ́run kì í ṣe ènìyàn, tí yóò fi purọ́, tàbí ọmọ ènìyàn, tí ó lè yí ọkàn rẹ̀ padà. Ǹjẹ́ ó sọ̀rọ̀ kí ó má ṣe é? Ǹjẹ́ ó ti ṣèlérí kí ó má mu un ṣẹ?
Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ. Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ. O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru? O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?
20 Èmi gba àṣẹ láti bùkún; Ó sì ti bùkún, èmi kò sì lè yípadà.
Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha. Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!
21 “Kò rí ẹ̀ṣẹ̀ kankan nínú Jakọbu, kò sì rí búburú kankan nínú Israẹli. Olúwa Ọlọ́run wọn sì wà pẹ̀lú wọn. Ìhó ọba sì wà pẹ̀lú wọn.
“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb, ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel. Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha. Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.
22 Ọlọ́run mú wọn jáde láti Ejibiti wá, wọ́n ní agbára màlúù ẹhànnà.
Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt. Ha dị ike dịka ehi ọhịa.
23 Kò ní àfọ̀ṣẹ sí Jakọbu, tàbí àfọ̀ṣẹ sí àwọn Israẹli. Nísinsin yìí a ó sọ nípa ti Jakọbu àti Israẹli, ‘Wo ohun tí Ọlọ́run ti ṣe!’
Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha. Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel. Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’
24 Àwọn ènìyàn náà yóò dìde bí abo kìnnìún; wọ́n yóò sì gbé ara wọn sókè bí i kìnnìún òun kì yóò sì dùbúlẹ̀ títí yóò fi jẹ ohun ọdẹ títí yóò sì fi mu nínú ẹ̀jẹ̀ ohun pípa.”
Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm, ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm, nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu, ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”
25 Nígbà náà ni Balaki wí fún Balaamu pé, “O kò kúkú fi wọ́n bú, bẹ́ẹ̀ ni o kò súre fún wọn rárá!”
Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”
26 Balaamu dáhùn ó sì wí fún Balaki pé, “Ǹjẹ́ èmi kò ha ti wí fún ọ pé, gbogbo èyí tí Olúwa bá sọ, òun ni èmi yóò ṣe?”
Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”
27 Nígbà náà Balaki sọ fún Balaamu pé, “Wá jẹ́ kí èmi kí ó mú ọ lọ sí ibòmíràn bóyá yóò tẹ́ Ọlọ́run lọ́rùn kí ó fi wọ́n bú láti ibẹ̀ lọ.”
Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
28 Balaki gbé Balaamu wá sí orí òkè Peori, tí ó kọjú sí aginjù.
Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya.
29 Balaamu sì wí fún Balaki pé, “Mọ pẹpẹ méje fún mi níbí kí o sì pèsè akọ màlúù àti àgbò fún mi.”
Belam gwara Balak okwu sị ya, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa ọzọ. Doziekwa ụmụ oke ehi asaa na ebule asaa e ji achụ aja.”
30 Balaki sì ṣe bí Balaamu ti sọ fún un, ó sì gbé akọ màlúù kan àti àgbò lórí pẹpẹ kọ̀ọ̀kan.
Balak mere dịka Belam gwara ya. O ji otu oke ehi na otu ebule chụọ aja nʼebe ịchụ aja ahụ nʼotu na otu.

< Numbers 23 >