< Nehemiah 12 >
1 Àwọn wọ̀nyí ni àwọn àlùfáà àti àwọn ọmọ Lefi tí ó bá Serubbabeli ọmọ Ṣealitieli àti Jeṣua padà: Seraiah, Jeremiah, Esra,
Ndị a bụ ndị nchụaja na ndị Livayị ndị so Zerubabel nwa Shealtiel na Jeshua lọta. Seraya, Jeremaya, Ezra,
2 Amariah, Malluki, Hattusi,
Amaraya, Maluk, Hatush,
3 Ṣekaniah, Rehumu, Meremoti,
Shekanaya, Rehum, Meremot,
4 Iddo, Ginetoni, Abijah,
Ido, Gineton, Abija
5 Mijamini, Moadiah, Bilgah,
Mijamin, Maadaya, Bilga,
6 Ṣemaiah, Joiaribu, Jedaiah,
Shemaya, Joiarib, Jedaya,
7 Sallu, Amoki, Hilkiah, àti Jedaiah. Wọ̀nyí ni olórí àwọn àlùfáà àti àwọn ẹlẹgbẹ́ ẹ wọn ní ìgbà ayé e Jeṣua.
Salu, Amok, Hilkaya na Jedaya. Ndị a niile bụ ndị ndu ndị nchụaja na ndị na-enyere ndị ndụ aka nʼụbọchị Jeshua.
8 Àwọn ọmọ Lefi ni Jeṣua, Binnui, Kadmieli, Ṣerebiah, Juda àti Mattaniah ẹni tí òun pẹ̀lú àwọn ẹlẹgbẹ́ rẹ̀, ni wọn ṣe àkóso orin ìdúpẹ́.
Ndị Livayị so ha bụ ndị a: Jeshua, Binui, Kadmiel, Sherebaya, Juda nakwa Matanaya, onye ya na ndị otu ya na-elekọta ofufe ekele.
9 Bakbukiah àti Unni, àwọn ẹlẹgbẹ́ wọn dúró sí òdìkejì wọn nínú ìsìn.
Bakbukaya, na Unni, ndị otu ha nọ na ncherita ihu nʼofufe ahụ.
10 Jeṣua ni baba Joiakimu, Joiakimu ni baba Eliaṣibu, Eliaṣibu ni baba Joiada,
Jeshua mụrụ Joiakim, Joiakim mụrụ Eliashib, Eliashib mụrụ Joiada,
11 Joiada ni baba Jonatani, Jonatani sì ni baba Jaddua.
Joiada mụrụ Jonatan, ebe Jonatan mụrụ Jadua.
12 Ní ìgbé ayé Joiakimu, wọ̀nyí ni àwọn olórí àwọn ìdílé àwọn àlùfáà: ti ìdílé Seraiah, Meraiah; ti ìdílé Jeremiah, Hananiah;
Ndị a bụ ndịisi ikwu ndị nchụaja nʼoge ndụ Joiakim. Meraia bụ onyeisi ụmụ Seraya, Hananaya bụ onyeisi ụmụ Jeremaya,
13 ti ìdílé Esra, Meṣullamu; ti ìdílé Amariah, Jehohanani;
Meshulam bụ onyeisi ụmụ Ezra, Jehohanan, onyeisi ụmụ Amaraya;
14 ti ìdílé Malluki, Jonatani; ti ìdílé Ṣekaniah, Josẹfu;
Jonatan, onyeisi ụmụ Maluk; Josef bụ onyeisi ụmụ Shekanaya;
15 ti ìdílé Harimu, Adna; ti ìdílé Meraioti Helikai;
nke Harim, Adna, nke Meremot, Helkai;
16 ti ìdílé Iddo, Sekariah; ti ìdílé Ginetoni, Meṣullamu;
Zekaraya, onyeisi ụmụ Ido; Meshulam, onyeisi ụmụ Gineton
17 ti ìdílé Abijah, Sikri; ti ìdílé Miniamini àti ti ìdílé Moadiah, Piltai;
Zikri, onyeisi ụmụ Abija; Piltai, onyeisi ụmụ Modaya na Miniamin
18 ti ìdílé Bilgah, Ṣammua; ti ìdílé Ṣemaiah, Jehonatani;
Shamua, onyeisi ụmụ Bilga, Jehonatan, onyeisi ụmụ Shemaya;
19 ti ìdílé Joiaribu, Mattenai; ti ìdílé Jedaiah, Ussi;
Matenai, onyeisi ụmụ Joiarib; Uzi, onyeisi ụmụ Jedaya;
20 ti ìdílé Sallu, Kallai; ti ìdílé Amoki, Eberi;
Kalai, onyeisi ụmụ Salu; Eba, onyeisi ụmụ Amok,
21 ti ìdílé Hilkiah, Haṣabiah; ti ìdílé Jedaiah, Netaneli.
Hashabaya, onyeisi ụmụ Hilkaya; Netanel, onyeisi ndị Jedaya.
22 Àwọn olórí ìdílé àwọn ọmọ Lefi ní ìgbà ayé Eliaṣibu, Joiada, Johanani àti Jaddua, àti pẹ̀lú ti àwọn àlùfáà ni a kọ sílẹ̀ ní ìgbà ìjọba Dariusi ará Persia.
E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa.
23 Àwọn olórí ìdílé láàrín àwọn ọmọ Lefi títí di àkókò Johanani ọmọ Eliaṣibu ni a kọ sílẹ̀ nínú ìwé ìtàn.
E dekwara aha ndịisi ndị Livayị niile nʼakwụkwọ tutu ruo nʼoge Johanan nwa Eliashib dị ndụ.
24 Àti àwọn olórí àwọn ọmọ Lefi ni Haṣabiah, Ṣerebiah, Jeṣua ọmọ Kadmieli, àti àwọn ẹlẹgbẹ́ wọn, tí wọ́n dúró ní ìdojúkojú wọn láti fi ìyìn àti láti dúpẹ́, apá kan ń dá èkejì lóhùn, gẹ́gẹ́ bí àṣẹ Dafidi ènìyàn Ọlọ́run.
Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.
25 Mattaniah, Bakbukiah, Obadiah, Meṣullamu, Talmoni àti Akkubu ni aṣọ́nà tí wọ́n ń sọ yàrá ìkó nǹkan pamọ́ sí ní ẹnu-ọ̀nà.
Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub.
26 Wọ́n ṣiṣẹ́ ìránṣẹ́ ní ìgbà ayé e Joiakimu ọmọ Jeṣua, ọmọ Josadaki, àti ní ọjọ́ ọ Nehemiah baálẹ̀ àti ní ọjọ́ Esra àlùfáà àti akọ̀wé.
Ha jere ozi ha nʼoge Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, dị ndụ, na nʼoge Nehemaya bụ onyeisi ọchịchị, na nʼoge Ezra bụkwa onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke.
27 Nígbà ìyàsímímọ́ odi Jerusalẹmu a mú àwọn ọmọ Lefi jáde wá láti ibi tí wọ́n ń gbé, wọ́n sì mú wọn wá sí Jerusalẹmu láti fi ayọ̀ ṣe ayẹyẹ ìyàsímímọ́ pẹ̀lú orin ìdúpẹ́ àti pẹ̀lú ohun èlò orin kimbali, haapu àti ohun èlò orin olókùn.
Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke.
28 A kó àwọn akọrin náà jọ papọ̀ láti àwọn ìletò tí ó yí Jerusalẹmu náà ká—láti àwọn abúlé Netofa,
Ndị ọbụ abụ sitekwara nʼobodo niile dị gburugburu Jerusalem bịa, ọ bụladị site nʼobodo niile ndị Netofa,
29 láti Beti-Gilgali, àti láti àwọn agbègbè Geba àti Asmafeti, nítorí àwọn akọrin ti kọ́ àwọn ìletò fúnra wọn ní agbègbè Jerusalẹmu.
na Bet-Gilgal, na akụkụ Geba na Azmavet, nʼihi na ha ewuorola onwe ha obodo nta dị iche iche gburugburu Jerusalem.
30 Nígbà tí àwọn àlùfáà àti àwọn ọmọ Lefi ti ya ara wọn sí mímọ́, wọ́n ya àwọn ènìyàn sí mímọ́, àti ẹnu ibodè àti odi pẹ̀lú.
Mgbe ndị nchụaja na ndị Livayị dochara onwe ha ọcha, ha dokwara ndị Izrel niile, na ọnụ ụzọ ama niile, na mgbidi ahụ ọcha.
31 Mo sì tún yan àwọn olórí Juda láti gun orí odi náà. Mo sì tún yan àwọn ẹgbẹ́ akọrin ńlá méjì láti dúpẹ́. Àwọn kan yóò gòkè odi lọ sí apá ọ̀tún sí ọ̀nà ibodè Ààtàn.
E mere m ka ndị ndu Juda niile rigoro nʼelu mgbidi ahụ. Nʼebe ahụ ka m kenyere otu ndị ọbụ abụ abụọ inye ekele. Otu ụzọ gara akụkụ aka nri nke elu mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Ikpofu Ahịhịa.
32 Hoṣaiah àti ìdajì àwọn olórí Juda tẹ̀lé wọn,
Hoshaya na ọkara ndị ndu Juda na-eso ha nʼazụ,
33 àwọn wọ̀nyí náà sì lọ pẹ̀lú wọn, Asariah, Esra, Meṣullamu,
ha na Azaraya, Ezra, Meshulam,
34 Juda, Benjamini, Ṣemaiah, Jeremiah,
Juda, Benjamin, Shemaya, Jeremaya
35 pẹ̀lú àwọn àlùfáà díẹ̀ pẹ̀lú ìpè, pẹ̀lú u Sekariah ọmọ Jonatani, ọmọ Ṣemaiah, ọmọ Mattaniah, ọmọ Mikaiah, ọmọ Sakkuri, ọmọ Asafu,
na ndị nchụaja ndị a ndị na-afụ opi, tinyere Zekaraya nwa Jonatan, nwa Shemaya. Ndị bụ nna nna Zekaraya bụ Matanaya, Mikaya na Zakua, ndị ikwu Asaf.
36 àti àwọn ẹlẹgbẹ́ rẹ̀, Ṣemaiah, Asareeli, Milalai, Gilalai, Maai, Netaneli, Juda àti Hanani—pẹ̀lú ohun èlò orin bí àṣẹ Dafidi ènìyàn Ọlọ́run. Esra akọ̀wé ni ó ṣáájú wọn bí wọ́n ti ń tò lọ lọ́wọ̀ọ̀wọ́.
Ndị otu ya, bụ Shemaya, Azarel, Milalai, Gilalai, Maai, Netanel, Juda na Hanani. Ha niile ji ngwa egwu ha, ụdị ngwa egwu ndị ahụ Devid onye nke Chineke nyere nʼiwu na ndị ọbụ abụ ga-eji. Ezra, bụ ode akwụkwọ nọ nʼihu na-edu ha.
37 Ní ẹnu ibodè orísun wọ́n ti ń lọ tààrà sí ọ̀nà ní orí àtẹ̀gùn ìlú Dafidi ní orí òkè tí ó kángun sí odi, wọ́n sì gba ẹ̀gbẹ́ ilé Dafidi kọjá títí dé ẹnu ibodè omi ní ìhà ìlà-oòrùn.
Mgbe ha rutere nʼỌnụ Ụzọ ama Isi Iyi, ha rigooro nʼelu nkwasa nrigo ụlọ elu e si abata nʼobodo Devid, si ebe ahụ gafee ụlọeze Devid, gaakwa lọghachi nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.
38 Àwọn ẹgbẹ́ akọrin kejì gba ọ̀nà òdìkejì lọ. Mo tẹ̀lé wọn ní orí odi, pẹ̀lú ìdajì àwọn ènìyàn, kọjá ilé ìṣọ́ ìléru lọ sí odi fífẹ̀,
Ndị ọbụ abụ nke ọzọ bụ ndị na-enye ekele gara ụzọ aka ekpe. Mụ onwe m sooro ha nʼelu mgbidi ahụ, tinyere ọkara ndị mmadụ ahụ, gafee Ụlọ elu Ite Ọkụ jeruo Mgbidi Sara Mbara.
39 kọjá ẹnu ibodè Efraimu ibodè Jeṣana, ẹnu ibodè ẹja, ilé ìṣọ́ Hananeli àti ilé ìṣọ́ ọgọ́rùn-ún, títí dé ẹnu ibodè àgùntàn. Wọ́n sì dúró ní ibodè ìṣọ́.
Anyị sitekwara nʼebe ahụ gafee Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem, Ọnụ Ụzọ ama Jeshana, Ọnụ Ụzọ Ama Azụ, Ọnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Hananel, ruokwa nʼỌnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Narị na ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ, kwụsị nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndị Nche.
40 Àwọn ẹgbẹ́ akọrin méjèèjì tí wọ́n dúpẹ́ wà ní ààyè nínú ilé Ọlọ́run, èmi náà sì dúró ní ààyè mi pẹ̀lú ìdajì àwọn ìjòyè,
Ya mere, ụzọ ndị mmadụ abụọ na-abụ abụ ekele nye Chineke zukọtara bata nʼụlọnsọ ukwu. Esokwa m ha bata, mụ na ọkara ndị ndu,
41 àti àwọn àlùfáà Eliakimu, Maaseiah, Miniamini, Mikaiah, Elioenai, Sekariah àti Hananiah pẹ̀lú àwọn ìpè wọn.
tinyere ndị nchụaja ndị a: Eliakịm, Maaseia, Miniamin, Mikaya, Elioenai, Zekaraya na Hananaya. Ndị a niile ji opi ha.
42 Àti pẹ̀lú Maaseiah, Ṣemaiah, Eleasari àti Ussi, àti Jehohanani, àti Malkiah, àti Elamu, àti Eseri. Àwọn akọrin kọrin sókè ní abẹ́ alábojútó Jesrahiah.
Ndị ọzọ sokwa bata bụ ndị a: Maaseia, Shemaya, Elieza, Uzi, Jehohanan, Malkija, Elam na Eza. Onyendu ndị ọbụ abụ ahụ niile bụ Jezrahaya.
43 Ní ọjọ́ náà wọ́n rú ẹbọ ńlá, wọ́n ṣe àjọyọ̀ nítorí Ọlọ́run ti fún wọn ní ayọ̀ ńlá. Àwọn obìnrin àti àwọn ọmọdé sì yọ̀ pẹ̀lú. A lè gbọ́ ariwo ayọ̀ tí ó jáde láti Jerusalẹmu ní jìnnà réré.
Ha chụrụ ọtụtụ aja nʼụbọchị ahụ nʼihi na Chineke nyere ha oke ọṅụ. Ụmụnta na ndị inyom sokwa ṅụrịa ọṅụ. Ha nụkwara ụda ọṅụ ndị Jerusalem site nʼebe dị anya.
44 Ní àkókò náà, a yan àwọn ènìyàn láti jẹ́ alábojútó yàrá ìṣúra fún àwọn ọrẹ àkọ́so èso àti àwọn ìdámẹ́wàá. Láti inú àwọn oko tí ó wà ní àyíká ìlú ni wọ́n ti ní láti mú wá sínú yàrá ìṣúra, ìpín tí òfin sọ fún àwọn àlùfáà àti àwọn ọmọ Lefi, nítorí inú àwọn ará a Juda yọ́ sí àwọn àlùfáà àti àwọn ọmọ Lefi tó ń ṣiṣẹ́ ìránṣẹ́.
Nʼoge ahụ ka a họpụtara ndị ikom na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe, ebe a na-achịkọba onyinye mkpụrụ mbụ, na onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri. A na-esite nʼobodo gbara Jerusalem gburugburu na-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe onyinye niile e nyere nʼiwu maka ọdịmma ndị nchụaja na ndị Livayị. E si otu a na-ewebata ya nʼihi na ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị na-arụ na-atọ ndị Juda ụtọ nke ukwuu.
45 Wọ́n ń ṣiṣẹ́ Ọlọ́run wọn àti iṣẹ́ ìyàsímímọ́, bẹ́ẹ̀ náà ni fún àwọn akọrin àti àwọn aṣọ́nà, wọ́n ń ṣe gẹ́gẹ́ bí Dafidi àti Solomoni ọmọ rẹ̀ ti pàṣẹ fún wọn.
Nʼihi na ha na-arụ ọrụ Chineke ahụ ha ketara ịrụ, ya na ọrụ ido ndị mmadụ na ihe ọbụla nsọ. Otu a kwa ka ndị ọbụ abụ, na ndị na-eche nche sị arụkwa ọrụ a dịka iwu Devid na Solomọn nwa ya nyere si dị.
46 Ní ọjọ́ pípẹ́ sẹ́yìn ní ìgbà Dafidi àti Asafu, ni àwọn atọ́nisọ́nà ti wà fún àwọn akọrin àti fún orin ìyìn àti orin ọpẹ́ sí Ọlọ́run.
Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke.
47 Nítorí náà ní ìgbà ayé Serubbabeli àti Nehemiah, gbogbo Israẹli ni ó ń dá ìpín lójoojúmọ́ fún àwọn akọrin àti àwọn aṣọ́nà. Wọ́n sì tún yan ìpín mìíràn sọ́tọ̀ fún àwọn ọmọ Lefi tókù, àwọn ọmọ Lefi náà tún ya ìpín ti àwọn ọmọ Aaroni sọ́tọ̀ fún wọn.
Ya mere, nʼoge Zerubabel na Nehemaya, ndị Izrel niile na-ewebata onyinye e ji akwagide ọrụ ndị ọbụ abụ, na ndị nche, na ndị Livayị. Ha kewapụtakwara oke ruru ndị Livayị ndị ọzọ iche, ndị Livayị nʼonwe ha kwa, kewapụtara oke ruru ụmụ Erọn nʼime ihe e nyere ha dịka e si nye ya nʼiwu.