< Leviticus 1 >

1 Olúwa sì pe Mose, ó sì bá a sọ̀rọ̀ láti inú àgọ́ àjọ. Ó wí pé,
Onyenwe anyị sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị,
2 “Bá àwọn ọmọ Israẹli sọ̀rọ̀ kí o sì wí fún wọn pé, ‘Bí ẹnikẹ́ni nínú yín bá mú ọrẹ ẹbọ wá fún Olúwa, kí ọrẹ ẹbọ yín jẹ́ ẹran ọ̀sìn láti inú agbo ẹran tàbí láti inú ọ̀wọ́ ẹran.
“Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ.
3 “‘Bí ọrẹ ẹbọ náà bá jẹ́ ẹbọ sísun láti inú agbo ẹran kí òun kí ó mú akọ màlúù tí kò lábùkù. Ó sì gbọdọ̀ mú un wá sí ẹnu-ọ̀nà àgọ́ àjọ kí ó ba à lè jẹ́ ìtẹ́wọ́gbà níwájú Olúwa
“‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata.
4 kí ó gbé ọwọ́ rẹ̀ lé orí ẹbọ sísun náà yóò sì jẹ́ ìtẹ́wọ́gbà dípò o rẹ̀, yóò sì jẹ́ ètùtù fún un.
Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya.
5 Kí ó pa ọ̀dọ́ akọ màlúù náà níwájú Olúwa, lẹ́yìn náà ni àwọn àlùfáà tí í ṣe ọmọ Aaroni yóò gbé ẹ̀jẹ̀ ẹran náà, wọn yóò sì wọ́n ẹ̀jẹ̀ náà yí pẹpẹ tí ó wà ní ẹnu-ọ̀nà àgọ́ àjọ ká.
Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ.
6 Òun yóò bó awọ ara ẹbọ sísun náà, òun yóò sì gé e sí wẹ́wẹ́.
Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị.
7 Àwọn ọmọ Aaroni tí í ṣe àlùfáà yóò fi iná sí orí pẹpẹ, wọn yóò sì to igi sórí pẹpẹ náà.
Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya.
8 Lẹ́yìn náà ni àwọn ọmọ Aaroni tí í ṣe àlùfáà yóò tó ègé ẹran náà, pẹ̀lú orí àti ọ̀rá rẹ̀ sí orí igi tó ń jó lórí pẹpẹ.
Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ.
9 Kí ó fi omi sàn nǹkan inú àti àwọn ẹsẹ̀ rẹ̀, kí àlùfáà sì sun gbogbo rẹ̀ lórí pẹpẹ, ó jẹ́ ọrẹ ẹbọ sísun, ọrẹ ẹbọ tí a fi iná ṣe, àní òórùn dídùn sí Olúwa.
Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
10 “‘Bí ọrẹ ẹbọ náà bá jẹ́ ẹbọ sísun láti inú ọ̀wọ́ ẹran, láti ara àwọn àgùntàn tàbí ewúrẹ́ tàbí àgùntàn, kí ó mú akọ tí kò lábùkù,
“‘Ọ bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ọ ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ.
11 kí ó pa á ní apá àríwá pẹpẹ níwájú Olúwa, kí àwọn ọmọ Aaroni tí í ṣe àlùfáà sì wọ́n ẹ̀jẹ̀ rẹ̀ yí gbogbo ẹ̀gbẹ́ pẹpẹ náà ká.
Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu Onyenwe anyị nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
12 Kí ó gé e sí wẹ́wẹ́, kí àlùfáà sì to ègé ẹran náà; orí àti ọ̀rá rẹ̀ sí orí igi tó ń jó lórí pẹpẹ.
Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja.
13 Kí ó fi omi ṣan nǹkan inú àti àwọn ẹsẹ̀ rẹ̀, kí àlùfáà sì gbé gbogbo rẹ̀ wá láti sun lórí pẹpẹ. Ó jẹ́ ẹbọ sísun tí a fi iná ṣe, àní òórùn dídùn sí Olúwa.
Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
14 “‘Bí ó bá sì ṣe pé ti ẹyẹ ni ẹbọ sísun ọrẹ ẹbọ rẹ̀ sí Olúwa, ǹjẹ́ kí ó mú ọrẹ ẹbọ rẹ̀ wá nínú àdàbà tàbí ọmọ ẹyẹlé.
“‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu.
15 Kí àlùfáà mu wá sí ibi pẹpẹ, kí ó yín in lọ́rùn, kí ó sì sun ún lórí pẹpẹ, kí ó sì ro ẹ̀jẹ̀ rẹ̀ ní ẹ̀gbẹ́ pẹpẹ.
Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja.
16 Kí ó yọ àjẹsí ẹyẹ náà pẹ̀lú gbogbo ohun tí ó wà nínú rẹ̀, kí ó gbe lọ ṣí apá ìlà-oòrùn pẹpẹ níbi tí eérú wà.
Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ.
17 Kí ó gbá apá rẹ̀ méjèèjì mú, kí ó fà á ya, ṣùgbọ́n kí ó má ya á tan pátápátá. Lẹ́yìn náà ni àlùfáà yóò sun ún lórí igi tí ó ń jó lórí pẹpẹ, ẹbọ sísun ni ọrẹ tí a fi iná ṣe, àní òórùn dídùn sí Olúwa.
Ọ ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma ọ gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.

< Leviticus 1 >