< Leviticus 5 >
1 “‘Bí ẹnìkan bá dẹ́ṣẹ̀ nítorí pé kò sọ̀rọ̀ nígbà tí a bi í ní gbangba pé kó jẹ́rìí nípa nǹkan tó rí tàbí nǹkan tó mọ̀ nípa ìṣẹ̀lẹ̀ kan, a ó di ẹ̀bi rẹ̀ rù ú.
“‘Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie nʼihi na ọ jụrụ ikwupụta mgbe ọ nụrụ ọkwa amaara nʼọha maka ịgba ama banyere ihe ọ hụrụ maọbụ ihe ọ maara, ọ bụ onye ikpe mara.
2 “‘Tàbí bí ẹnìkan bá fọwọ́ kan ohun tí a kà sí àìmọ́ yálà òkú ẹranko aláìmọ́ tàbí òkú ẹran ọ̀sìn aláìmọ́ tàbí òkú ẹ̀dá yówù tó ń rìn lórí ilẹ̀ bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé ẹni náà kò mọ̀, ó ti di aláìmọ́, ó sì ti jẹ̀bi.
“‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara.
3 Tàbí bí ó bá fọwọ́ kan ohun àìmọ́ ti ènìyàn, ohunkóhun tó lè mú ènìyàn di aláìmọ́, bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé ẹni náà kò mọ̀, nígbà tí ó bá mọ̀ nípa rẹ̀ yóò jẹ̀bi.
Ma ọ bụrụ na ha emetụ ihe ọbụla rụrụ arụ si nʼahụ mmadụ pụta aka, ihe ọbụla ga-eme ya ka ọ hapụ ịdị ọcha, ọ bụ ezie na ha amaghị na ọ bụ ihe rụrụ arụ, mgbe ọ matara ya, ọ ga-abụ onye ikpe mara.
4 Tàbí bí ẹni kan bá búra láti ṣe ohun kan láì ronú lé e lórí, yálà ohun tó dára tàbí ohun búburú, nínú ọ̀rọ̀ yówù tó ti búra láì kíyèsi ara, bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé, kò mọ̀ nípa rẹ̀ tẹ́lẹ̀, bí ó ti wù kó rí, nígbà tó bá mọ̀ yóò jẹ̀bi.
Ọ bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na ọ bụ iyi nzuzu ka ọ ṅụrụ, ọ bụrụla onye ikpe mara.
5 Bí ẹnikẹ́ni bá jẹ̀bi ọ̀kan nínú àwọn nǹkan wọ̀nyí, ó gbọdọ̀ jẹ́wọ́ irú ọ̀nà tó ti dẹ́ṣẹ̀
Onye ọbụla sitere nʼụzọ dị otu a bụrụ onye ikpe mara, ga-ekwupụta mmehie ya, dịka o si dị.
6 àti pé gẹ́gẹ́ bí ìtánràn fún ẹ̀ṣẹ̀ tí ó ṣẹ̀, ó gbọdọ̀ mú wa fún Olúwa, abo àgùntàn tàbí abo ewúrẹ́ láti inú agbo ẹran wá gẹ́gẹ́ bí ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀, àlùfáà yóò sì ṣe ètùtù fún ẹ̀ṣẹ̀ tí ó ṣẹ̀.
Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha.
7 “‘Bí kò bá lágbára àti mú ọ̀dọ́-àgùntàn wá, kí ó mú àdàbà méjì tàbí ọmọ ẹyẹlé méjì fún Olúwa gẹ́gẹ́ bí ìtánràn fún ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀—ọ̀kan fún ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀, èkejì fún ẹbọ sísun.
“‘Ọ bụrụ na o nweghị ike iweta atụrụ, ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, dịka ihe ikpe ọmụma mmehie ha. Otu nʼime nnụnụ ndị a ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
8 Kí ó kó wọn wá fún àlùfáà tí yóò kọ́kọ́ rú ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ kí ó yín in lọ́rùn, ṣùgbọ́n kí ó má já orí rẹ̀ tan,
Ọ ga-eweta ha nye onye nchụaja. Onye ga-ewere nnụnụ nke mbụ chụọ aja mmehie. Ọ ga-atụbipụ olu ya, kama ọ gaghị ekewapụcha isi nnụnụ ahụ site nʼahụ ya.
9 kí ó sì wọ́n díẹ̀ lára ẹ̀jẹ̀ ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ náà sí ẹ̀gbẹ́ pẹpẹ, ìyókù ẹ̀jẹ̀ náà ni kí ó ro sí ìsàlẹ̀ pẹpẹ. Ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ ni.
Ọ ga-efesa ụfọdụ ọbara aja mmehie ahụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ma ọbara fọdụrụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Nke a ga-abụ aja mmehie.
10 Lẹ́yìn èyí àlùfáà yóò wá rú ẹbọ sísun gẹ́gẹ́ bí ìlànà, yóò sì ṣe ètùtù fún un nítorí ẹ̀ṣẹ̀ tí ó ṣẹ̀, a ó sì dáríjì í.
Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. Ọ ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha.
11 “‘Bí ó bá sì jẹ́ pé kò ní agbára àti mú àdàbà méjì tàbí ọmọ ẹyẹlé méjì wá, kí ó mú ìdámẹ́wàá òsùwọ̀n ìyẹ̀fun kíkúnná dáradára wá fún ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ rẹ, kò gbọdọ̀ fi òróró tàbí tùràrí sí i nítorí pé ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ ni.
“‘Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka ọ bụrụ onyinye aja mmehie. Ọ gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na ọ bụ aja mmehie.
12 Kí ó gbé e wá sí ọ̀dọ̀ àlùfáà, àlùfáà yóò sì bu ẹ̀kúnwọ́ ìyẹ̀fun gẹ́gẹ́ bí ẹbọ ìrántí, kí ó sì sun ún lórí pẹpẹ, gẹ́gẹ́ bí ẹbọ tí a fi iná sun sí Olúwa. Ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ ni.
Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya.
13 Báyìí ni àlùfáà yóò ṣe ètùtù fún ẹni náà fún èyíkéyìí nínú àwọn ẹ̀ṣẹ̀ tí ó dá, a ó sì dáríjì í: ìyókù sì jẹ́ ti àlùfáà, bí ẹbọ ohun jíjẹ.’”
Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’”
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
15 “Nígbà tí ẹnìkan bá dẹ́ṣẹ̀ ìrékọjá tí ó sì ṣe láìmọ̀ ní ti àwọn ohun mímọ́ Olúwa, kí ó mú àgbò láti inú agbo ẹran wá fún Olúwa gẹ́gẹ́ bí ìtánràn, àgbò tí kò lábùkù tí ó sì níye lórí gẹ́gẹ́ bí iye owó ibi mímọ́. Ẹbọ ẹ̀bi ni.
“Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
16 Kí ó ṣe àtúnṣe nítorí ẹ̀ṣẹ̀ tí ó ti ṣẹ̀ nínú ti àwọn ohun mímọ́, kí ó sì fi ìdámárùn-ún kún iye rẹ̀, kí ó sì kó gbogbo rẹ̀ fún àlùfáà. Àlùfáà yóò sì fi àgbò ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ náà ṣe ètùtù fún, a ó sì dáríjì í.
Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya.
17 “Bí ẹnìkan bá dẹ́ṣẹ̀ tí ó sì ṣe ohun tí kó yẹ ko ṣe sí ọ̀kan nínú òfin Olúwa, bí kò tilẹ̀ mọ̀, ó jẹ̀bi, yóò sì ru ẹ̀bi ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀
“Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya.
18 kí ó mú àgbò kan láti inú agbo ẹran wá sọ́dọ̀ àlùfáà, fún ẹbọ ẹ̀ṣẹ̀ àgbò tí kò lábùkù tí ó sì níye lórí bí iye owó ibi mímọ́. Báyìí ni àlùfáà yóò ṣe ètùtù fún ẹni náà, fún àṣìṣe tí ó ṣe láìmọ̀, a ó sì dáríjì í.
Ọ ga-ewetara onye nchụaja ihe aja ikpe ọmụma nke bụ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ga-abụ ihe o ruru. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja mkpuchi mmehie nʼihi ihe ọjọọ o mere na-amaghị ama. A ga-agbaghara ya mmehie ya.
19 Ẹbọ ẹ̀bi ni, ó ti jẹ̀bi ẹ̀ṣẹ̀ tí ó ṣẹ̀ sí Olúwa.”
Ọ bụ aja ikpe ọmụma, nʼihi na onye mehiere megide Onyenwe anyị ka ọ bụ.”