< Joshua 7 >

1 Ṣùgbọ́n àwọn ará Israẹli ṣe àìṣòótọ́ nípa ohun ìyàsọ́tọ̀, Akani ọmọ Karmi, ọmọ Sabdi, ọmọ Sera, ẹ̀yà Juda, mú nínú wọn. Bẹ́ẹ̀ ni ìbínú Olúwa ru sí àwọn ará Israẹli.
Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye Onyenwe anyị. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu megide ụmụ Izrel.
2 Joṣua rán àwọn ọkùnrin láti Jeriko lọ sí Ai, tí ó súnmọ́ Beti-Afeni ní ìlà-oòrùn Beteli, ó sì sọ fún wọn pé, “Ẹ gòkè lọ kí ẹ sì ṣe ayọ́lẹ̀wò.” Bẹ́ẹ̀ ni àwọn arákùnrin náà lọ, wọ́n sì yọ́ Ai wò.
Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai.
3 Nígbà tí wọ́n padà sí ọ̀dọ̀ Joṣua, wọ́n wí pé, “Kì í ṣe gbogbo àwọn ènìyàn ni ó ni láti gòkè lọ bá Ai jà. Rán ẹgbẹ̀rún méjì tàbí ẹgbẹ̀rún mẹ́ta ọkùnrin láti gbà á, kí ó má ṣe dá gbogbo àwọn ènìyàn ní agara, nítorí ìba ọkùnrin díẹ̀ ní ó wà níbẹ̀.”
Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”
4 Bẹ́ẹ̀ ní àwọn bí ẹgbẹ̀rún mẹ́ta ọkùnrin lọ; ṣùgbọ́n àwọn ọkùnrin Ai lé wọn sá.
Nʼihi nke a, ihe dịka puku ndị agha atọ ka e zigara imeri obodo Ai. Ma ngwangwa, ndị agha obodo Ai meriri ndị agha ụmụ Izrel, chụọ ha ọsọ.
5 Àwọn ènìyàn Ai sì pa àwọn bí mẹ́rìndínlógójì nínú wọn. Wọ́n sì ń lépa àwọn ará Israẹli láti ibodè ìlú títí dé Ṣebarimu, wọ́n sì pa àwọn tí ń sọ̀kalẹ̀. Àyà àwọn ènìyàn náà sì já, ọkàn wọn sì pami.
Ihe dịka iri mmadụ atọ na isii nʼetiti ndị agha Izrel ka e gburu nʼagha ahụ. Ndị Ai chụrụ ha ọsọ site nʼụzọ ama obodo ruo nʼebe a na-awa nkume, gbuo ha na mgbada ugwu ahụ. Nʼihi nke a, ndị agha Izrel dara mba, obi lọkwara ha mmiri.
6 Joṣua sì fa aṣọ rẹ̀ ya, ó sì dojúbolẹ̀ níwájú àpótí ẹ̀rí Olúwa títí di àṣálẹ́. Àwọn àgbà Israẹli sì ṣe bákan náà, wọ́n ku eruku sí orí wọn.
Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha.
7 Joṣua sì wí pé, “Háà, Olúwa Olódùmarè, nítorí kín ni ìwọ ṣe mú àwọn ènìyàn yìí kọjá Jordani, láti fi wọ́n lé àwọn ará Amori lọ́wọ́, láti pa wọn run? Àwa ìbá mọ̀ kí a dúró ní òdìkejì Jordani?
Mgbe ahụ kwa, Joshua sịrị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Nʼihi gịnị ka i ji mee ka ndị a gabiga osimiri Jọdan, inyefe anyị nʼaka ndị Amọrait, ime ka ha tigbuo anyị? Ọ gaara adị anyị mma nke ọma ma ọ bụrụ na anyị nọdụrụ nʼofe ọzọ nke Jọdan.
8 Olúwa, kín ni èmi yóò sọ nísinsin yìí tí Israẹli sì ti sá níwájú ọ̀tá a rẹ̀?
Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ?
9 Àwọn Kenaani àti àwọn ènìyàn ìlú tí ó kù náà yóò gbọ́ èyí, wọn yóò sì yí wa ká, wọn yóò sì ké orúkọ wa kúrò ní ayé. Kí ni ìwọ ó ha ṣe fún orúkọ ńlá à rẹ?”
Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?”
10 Olúwa sì sọ fún Joṣua pé, “Dìde! Kín ni ìwọ ń ṣe tí ó fi dojúbolẹ̀?
Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?
11 Israẹli ti ṣẹ̀, wọ́n sì ti ba májẹ̀mú mi jẹ́, èyí tí mo pàṣẹ fún wọn pé kí wọn pamọ́. Wọ́n ti mú nínú ohun ìyàsọ́tọ̀, wọ́n ti jí, wọ́n pa irọ́, wọ́n ti fi wọ́n sí ara ohun ìní wọn.
Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye Onyenwe anyị. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha.
12 Ìdí nì èyí tí àwọn ará Israẹli kò fi lè dúró níwájú àwọn ọ̀tá wọn; wọ́n yí ẹ̀yìn wọn padà, wọ́n sì sálọ níwájú ọ̀tá a wọn nítorí pé àwọn gan an ti di ẹni ìparun. Èmi kì yóò wà pẹ̀lú u yín mọ́, bí kò ṣe pé ẹ̀yin pa ohun ìyàsọ́tọ̀ run kúrò ní àárín yín.
Ọ bụ nʼihi nke a mere na ụmụ Izrel enwekwaghị ike iguzo nʼihu ndị iro ha. Ọ bụkwa nke a mere ha ji tụgharịa gbaa ọsọ, nʼihi na ha aghọọla ndị kwesiri ka e bibie. Ya mere, agaghị m anọnyere unu ọzọ, tutu ruo mgbe unu wezugara ma mebie site nʼetiti onwe unu, ihe ọbụla e debere iche maka mbibi.
13 “Lọ, ya àwọn ènìyàn náà sí mímọ́. Sọ fún wọn pé, ‘Ẹ ya ara yín sí mímọ́ fún ọ̀la, nítorí báyìí ni Olúwa, Ọlọ́run Israẹli wí, ohun ìyàsọ́tọ̀ kan ń bẹ ní àárín yín, Israẹli. Ẹ̀yin kì yóò lè dúró níwájú àwọn ọ̀tá a yín títí ẹ̀yin yóò fi mú kúrò.
“Bilie! Doo Izrel nsọ. Gwa ndị m okwu sị ha, ‘Onye ọbụla nʼetiti unu ga-ejikere doo onwe ya nsọ maka echi. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu sị, Ihe ndị e doro nsọ dị nʼetiti unu, Izrel. Unu apụghịkwa iguzosi ike nʼihu ndị iro unu, tutu ruo mgbe unu ga-esite nʼetiti onwe unu wezuga ihe ndị ahụ.’
14 “‘Ní òwúrọ̀, kí ẹ mú ará yín wá síwájú ní ẹ̀yà kọ̀ọ̀kan. Ẹ̀yà tí Olúwa bá mú yóò wá sí iwájú ní agbo ilé kọ̀ọ̀kan, agbo ilé tí Olúwa bá mú yóò wá sí iwájú ní ìdílé kọ̀ọ̀kan, ìdílé tí Olúwa bá sì mú yóò wá sí iwájú ní ẹni kọ̀ọ̀kan.
“‘Nʼụtụtụ echi, unu ga-apụta nʼebo nʼebo. Ebo ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta nʼikwu nʼikwu, ikwu ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta bịa nʼezinaụlọ nʼezinaụlọ, ụlọ ọbụla nke Onyenwe anyị họọrọ, ndị ikom ya ga-apụta nʼotu nʼotu.
15 Ẹnikẹ́ni tí a bá ká mọ́ pẹ̀lú ohun ìyàsọ́tọ̀ náà, a ó fi iná pa á run, pẹ̀lú gbogbo ohun tí ó ní. Ó ti ba májẹ̀mú Olúwa jẹ́, ó sì ti ṣe nǹkan ìtìjú ní Israẹli!’”
Ma onye ọbụla e jidere ji ihe ndị ahụ e doro nsọ ka a ga-akpọ ọkụ, ya onwe ya, na ihe niile ọ nwere, nʼihi o mebiela iwu ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, meekwa ihe jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel.’”
16 Ní kùtùkùtù òwúrọ̀ ọjọ́ kejì, Joṣua mú Israẹli wá síwájú ní ẹ̀yà kọ̀ọ̀kan, a sì mú ẹ̀yà Juda.
Nʼihi nke a, Joshua biliri nʼisi ụtụtụ. O mere ka ebo niile dị nʼIzrel bịaruo nso nʼebo nʼebo, ebo Juda ka a họọrọ.
17 Àwọn agbo ilé e Juda wá sí iwájú, ó sì mú agbo ilé Sera. Ó sì mú agbo ilé Sera wá síwájú ní ìdílé kọ̀ọ̀kan, a sì mú ìdílé Sabdi.
Mgbe ahụ, e mere ka ikwu niile dị nʼebo Juda bịaruo nso, ikwu Zera ka ahọpụtara. Mgbe e mere ka ikwu Zera pụta nʼezinaụlọ ha niile nʼotu nʼotu, ezinaụlọ Zimri bụ nke ahọpụtara.
18 Joṣua sì mú ìdílé Simri wá síwájú ní ọkùnrin kọ̀ọ̀kan, a sì mú Akani ọmọ Karmi, ọmọ Sabdi, ọmọ Sera ti ẹ̀yà Juda.
Joshua mere ka ndị ikom niile dị nʼezinaụlọ Zimri pụta nʼotu nʼotu, ma e jidere Ekan, nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera onye ebo Juda.
19 Nígbà náà ní Joṣua sọ fún Akani pé, “Ọmọ mi fi ògo fún Olúwa, Ọlọ́run Israẹli, kí o sì fi ìyìn fún un. Sọ fún mi ohun tí ìwọ ti ṣe, má ṣe fi pamọ́ fún mi.”
Mgbe ahụ, Joshua sịrị Ekan, “Nwa m, nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel otuto, nyekwa ya nsọpụrụ. Gwa m ihe i mere. Ezonarịkwala m ihe ọjọọ i mere.”
20 Akani sì dáhùn pé, “Òtítọ́ ni! Mo ti ṣẹ̀ sí Olúwa, Ọlọ́run Israẹli. Nǹkan tí mo ṣe nìyìí,
Mgbe ahụ, Ekan zara Joshua sị ya, “Ọ bụ eziokwu! Emehiela m megide Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Lee ihe m mere.
21 nígbà tí mo rí ẹ̀wù Babeli kan tí ó dára nínú ìkógun, àti igba ṣékélì fàdákà àti odindi wúrà olóṣùnwọ́n àádọ́ta ṣékélì, mo ṣe ojúkòkòrò wọn mo sì mú wọn. Mo fi wọ́n pamọ́ ní abẹ́ àgọ́ mi àti fàdákà ní abẹ́ rẹ̀.”
Mgbe m hụrụ nʼetiti ihe ndị a kwatara nʼagha, otu uwe mwụda Babilọn mara mma, na narị Shekel ọlaọcha abụọ, na mkpirisi ọlaedo ịdị arọ ya ruru iri shekel ise. E nwere m anya ukwu nʼebe ihe ndị a dị, chịrị ha. Lee, ezoro m ha nʼime ala nʼụlọ ikwu m, ọlaọcha ahụ dịkwa nʼokpuru ya.”
22 Bẹ́ẹ̀ ni Joṣua ran àwọn òjíṣẹ́, wọ́n sì sáré wọ inú àgọ́ náà, ó sì wà níbẹ̀, a sì fi pamọ́ nínú àgọ́ ọ rẹ̀, àti fàdákà ní abẹ́ ẹ rẹ̀.
Ya mere, Joshua zigara ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa chọọ ihe ahụ Ekan zoro. Ndị a gara nʼụlọ ikwu ahụ, chọpụta ihe ahụ ezuru nʼohi. Dịka Ekan kwuru, ihe ikpeazụ ha hụrụ bụ ọlaọcha ahụ.
23 Wọ́n sì mú àwọn nǹkan náà jáde láti inú àgọ́ rẹ̀, wọ́n mú wọn wá fún Joṣua àti gbogbo àwọn ọmọ Israẹli, wọ́n sì fi wọ́n lélẹ̀ níwájú Olúwa.
Ha chịkọtara ha niile chịtara ha Joshua. Mgbe ha bịaruru ebe Joshua na ndị Izrel niile nọ, ha chịsara ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.
24 Nígbà náà ni Joṣua pẹ̀lú gbogbo Israẹli, mú Akani ọmọ Sera, fàdákà, ẹ̀wù àti wúrà tí a dà, àwọn ọmọ rẹ̀ ọkùnrin àti obìnrin, màlúù rẹ̀, kẹ́tẹ́kẹ́tẹ́ àti àgùntàn àgọ́ rẹ̀ àti gbogbo ohun tí ó ni, wọ́n sì kó wọn lọ sí ibi àfonífojì Akori.
Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ.
25 Joṣua sì wí pé, “Èéṣe tí ìwọ mú wàhálà yìí wá sí orí wa? Olúwa yóò mú ìpọ́njú wá sí orí ìwọ náà lónìí.” Nígbà náà ni gbogbo Israẹli sọ ọ́ ní òkúta pa, lẹ́yìn ìgbà tí wọ́n sọ àwọn tókù ní òkúta pa tán, wọ́n sì jó wọn níná.
Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ.
26 Wọ́n sì kó òkìtì òkúta ńlá lé Akani lórí títí di òní yìí. Nígbà náà ní Olúwa sì yí ìbínú gbígbóná rẹ̀ padà. Nítorí náà ni a ṣe ń pe orúkọ ibẹ̀ ní àfonífojì Akori láti ìgbà náà.
Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ Onyenwe anyị ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa.

< Joshua 7 >