< Joshua 22 >
1 Joṣua sì pe àwọn ẹ̀yà Reubeni, ẹ̀yà Gadi àti ìdajì ẹ̀yà Manase
Emesịa, Joshua kpọkọtara ndị agha si nʼebo Ruben, na Gad, na ọkara Manase, gwa ha okwu sị:
2 ó sì sọ fún wọn pé, “Ẹ̀yin ti ṣe gbogbo èyí tí Mose ìránṣẹ́ Olúwa pàṣẹ, ẹ sì ti ṣe ìgbọ́ràn sí ohun gbogbo tí mo pàṣẹ.
“Unu emeela ihe niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu. Unu egeela ntị nʼolu m, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu.
3 Ẹ kò fi àwọn arákùnrin yín sílẹ̀ láti ìgbà yí títí di òní, ṣùgbọ́n ẹ ti kíyèsára láti pa òfin Olúwa Ọlọ́run yín mọ́.
E, unu arụzuola ọrụ ahụ Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile.
4 Nísinsin yìí tí Olúwa Ọlọ́run yín ti fún àwọn arákùnrin yín ní ìsinmi gẹ́gẹ́ bí ó ti ṣèlérí, ẹ padà sí ilẹ̀ yín níbi tí Mose ìránṣẹ́ Olúwa fi fún yin ní òdìkejì Jordani.
Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.
5 Ṣùgbọ́n ẹ ṣọ́ra gidigidi láti pa àṣẹ àti òfin tí Mose ìránṣẹ́ Olúwa fi fún yin mọ́. Láti fẹ́ràn Olúwa Ọlọ́run yín, láti rìn nínú gbogbo ọ̀nà rẹ̀, láti gbọ́rọ̀ sí àṣẹ rẹ̀, láti dìímú ṣinṣin àti láti sìn ín pẹ̀lú gbogbo ọkàn yín àti gbogbo àyà yín.”
Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu: nke bụ ịhụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe.”
6 Nígbà náà ni Joṣua súre fún wọn, ó sì jẹ́ kí wọn máa lọ sí ilẹ̀ wọn.
Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha.
7 (Mose ti fi ilẹ̀ fún ìdajì ẹ̀yà Manase ní Baṣani, Joṣua sì ti fún ìdajì ẹ̀yà yòókù ní ilẹ̀ ní ìwọ̀-oòrùn Jordani, pẹ̀lú àwọn arákùnrin wọn). Joṣua súre fún wọn ó sì jẹ́ kí wọn máa lọ sí ilẹ̀ wọn,
Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị,
8 Ó sì wí pé, “Ẹ padà sí ilẹ̀ ẹ yín pẹ̀lú ọrọ̀ púpọ̀ yín, pẹ̀lú agbo ẹran ọ̀sìn, pẹ̀lú fàdákà, wúrà, idẹ àti irin, àti ọ̀pọ̀lọpọ̀ aṣọ, kí ẹ sì pín ìkógun tí ẹ rí gbà láti ọ̀dọ̀ àwọn ọ̀tá yín pẹ̀lú àwọn arákùnrin yín.”
“Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche.
9 Báyìí ni àwọn ẹ̀yà Reubeni, ẹ̀yà Gadi àti ìdajì ẹ̀yà Manase fi àwọn ará Israẹli sílẹ̀ ní Ṣilo ní Kenaani láti padà sí Gileadi, ilẹ̀ wọn, èyí tí wọ́n ti gbà gẹ́gẹ́ bí àṣẹ Olúwa láti ẹnu Mose wá.
Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
10 Nígbà tí wọ́n wá dé Geliloti ní ẹ̀bá Jordani ní ilẹ̀ Kenaani, àwọn ẹ̀yà Reubeni, ẹ̀yà Gadi àti ìdajì ẹ̀yà Manase mọ pẹpẹ ńlá tí ó tóbi kan ní ẹ̀bá Jordani.
Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan.
11 Nígbà tí àwọn ọmọ Israẹli gbọ́ pé àwọn ọmọ Reubeni, àti àwọn ọmọ Gadi àti ìlàjì ẹ̀yà Manase mọ pẹpẹ kan dojúkọ ilẹ̀ Kenaani ní Geliloti ní ẹ̀bá Jordani ní ìhà kejì àwọn ọmọ Israẹli,
Mgbe ndị Izrel nụrụ na ha e wuola ebe ịchụ aja nʼoke ala Kenan, na Gelilọt, nʼebe dị nso Jọdan, nʼofe ala ndị Izrel,
12 gbogbo àjọ Israẹli péjọ ní Ṣilo láti lọ bá wọn jagun.
ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha.
13 Àwọn ọmọ Israẹli rán Finehasi ọmọ Eleasari àlùfáà, sí ilẹ̀ Gileadi, sí Reubeni, sí Gadi àti sí ìdajì ẹ̀yà Manase.
Ya mere, ụmụ Izrel zigara Finehaz, nwa Elieza, bụ onye nchụaja ka ọ ga nʼala Gilead, ya bụ ijekwuru ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase.
14 Pẹ̀lú rẹ̀ wọ́n rán àwọn ọkùnrin olóyè mẹ́wàá, ẹnìkan fún ẹ̀yà Israẹli kọ̀ọ̀kan, olórí ọ̀kọ̀ọ̀kan tiwọn jẹ́ olórí ìdílé láàrín àwọn ọmọ Israẹli.
Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel.
15 Nígbà tí wọ́n lọ sí Gileadi—sí Reubeni, Gadi àti ìdajì ẹ̀yà Manase—wọ́n sì sọ fún wọn pé,
Mgbe ndị a rutere nʼala Gilead, ha kpọkọtara ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase gwa ha okwu sị,
16 “Gbogbo àjọ ènìyàn Olúwa wí pe, ‘A fẹ́ mọ ìdí tí ẹ fi sẹ̀ sí Ọlọ́run Israẹli nípa yíyí padà kúrò lọ́dọ̀ rẹ̀ tí ẹ sì kọ́ pẹpẹ ìṣọ̀tẹ̀ ní ìlòdì sí Olúwa?
“Otu a ka ọgbakọ niile nke Onyenwe anyị sịrị, ‘Olee ụdị njehie dị nke a, nke unu mere megide Chineke? Olee otu unu si wezuga onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, gaa wuore onwe unu ebe ịchụ aja, si otu a nupu isi megide ya?
17 Ẹ̀ṣẹ̀ Peori kò ha tó fún wa bí? Títí di òní yìí àwa kò tí ì wẹ ara wa mọ́ kúrò nínú ẹ̀ṣẹ̀ náà, bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé àjàkálẹ̀-ààrùn ti jà láàrín ènìyàn Olúwa!
Ọ pụtara na mmehie Peoa ezubereghị anyị? Ruo taa anyị asachapụbeghị onwe anyị site na mmehie ahụ, ọ bụ ezie nʼọrịa na-efe efe dakwasịrị nzukọ nke Onyenwe anyị.
18 Ṣé ẹ tún wá ń padà kúrò lẹ́yìn Olúwa ni báyìí? “‘Tí ẹ̀yin bá ṣọ̀tẹ̀ sí Olúwa ní òní, ní ọ̀la ní òun o bínú sí gbogbo ìpéjọpọ̀ Israẹli.
Ugbu a, unu na-achọkwa isite nʼebe Onyenwe anyị nọ chigharịa. “‘Ọ bụrụ na unu enupu isi megide Onyenwe anyị taa, matakwanụ na echi ya, ọ ga-eweso nzukọ Izrel niile iwe.
19 Bí ilẹ̀ ìní yín bá di àìmọ́, ẹ wá sí orí ilẹ̀ ìní Olúwa, ní ibi tí àgọ́ Olúwa dúró sí, kí ẹ sì pín ilẹ̀ náà pẹ̀lú wa. Ṣùgbọ́n kí ẹ má ṣe ṣọ̀tẹ̀ sí Olúwa tàbí sí wa nípa mímọ pẹpẹ fún ara yín, lẹ́yìn pẹpẹ Olúwa Ọlọ́run wa.
Ọ bụrụ na unu wuru ebe ịchụ aja ahụ nʼihi na ala unu rụrụ arụ, bịakwutenụ anyị nʼakụkụ nke ọzọ, nke osimiri a, ebe Onyenwe anyị bi nʼetiti anyị, nʼime ụlọ nzute obibi ya. Anyị ga-ekenyekwa unu ala anyị. Ma unu enupula isi megide Onyenwe anyị site nʼiwu ebe ịchụ aja ọzọ, ebe ọ bụ na e nwere otu ebe bụ ezi ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke anyị.
20 Nígbà tí Akani ọmọ Sera ṣe àìṣòótọ́ nípa ohun ìyàsọ́tọ̀, ǹjẹ́ ìbínú kò wá sí orí gbogbo àjọ ènìyàn Israẹli nítorí rẹ̀ bí? Òun nìkan kọ́ ni ó kú fún ẹ̀ṣẹ̀ ẹ rẹ̀.’”
Mgbe Ekan, nwa Zera, zipụtara onwe ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe metụtara ihe e doro nsọ, ọ bụ na nzukọ Izrel niile esoghị keta oke nʼahụhụ dakwasịrị ya? Ọ bụghị naanị ya nwụrụ nʼihi mmehie ahụ.’”
21 Nígbà náà ni Reubeni, Gadi àti ẹ̀yà Manase sọ nínú ìdáhùn wọn fún àwọn olórí Israẹli pé.
Nke a bụ nzaghachi ụmụ Ruben, na ụmụ Gad na ọkara ebo ụmụ Manase, nyere ndị ndu ụmụ Izrel niile;
22 Olúwa Ọlọ́run àwọn ọlọ́run! Olúwa Ọlọ́run àwọn ọlọ́run, Òun mọ̀, jẹ́ kí Israẹli pẹ̀lú kí ó mọ̀! Bí èyí bá wà ní ìṣọ̀tẹ̀ tàbí àìgbọ́ràn sí Olúwa, ẹ má ṣe gbà wa ní òní yìí.
“Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Chineke onye kachasị chi niile, bụ Onyenwe anyị! Ya onwe ya maara, ka Izrel niile matakwa. A sị na nke a bụ nnupu isi, a sịkwarị na ọ bụ enweghị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, unu ahapụla anyị ka anyị dịrị ndụ.
23 Bí àwa bá ti mọ pẹpẹ wa láti yí padà kúrò ní ọ̀dọ̀ Olúwa àti láti rú ẹbọ sísun àti ẹbọ oúnjẹ jíjẹ, tàbí ẹbọ àlàáfíà ní orí rẹ, kí Olúwa fún ara rẹ̀ gba ẹ̀san.
Ọ bụrụ na anyị sitere na nnupu isi wuo ebe ịchụ aja a maka ịchụ aja udo maọbụ aja mkpụrụ ọka, ka Onyenwe anyị nʼonwe ya taa anyị ahụhụ.
24 “Bẹ́ẹ̀ kọ́! Àwa ṣe èyí ní ìbẹ̀rù pé ní ọjọ́ tí àwọn ọmọ yín yóò wí fún wa pé, ‘Kí ni ẹ̀yin ní ṣe pẹ̀lú Olúwa, Ọlọ́run Israẹli?
“Ma nke ahụ abụghị ihe anyị bu nʼobi! Anyị wuru ya nʼihi na anyị tụrụ ụjọ na nʼoge dị nʼihu, ụmụ unu ga-agwa ụmụ anyị okwu sị, ‘Gịnị ka unu na Onyenwe anyị, Chineke Izrel nwekọrọ?
25 Olúwa ti fi Jordani ṣe ààlà láàrín àwa àti ẹ̀yin—àwọn ọmọ Reubeni àti àwọn ọmọ Gadi! Ẹ kò ni ní ìpín nínú Olúwa.’ Bẹ́ẹ̀ ni àwọn ọmọ yín lè mú kí àwọn ọmọ wa dẹ́kun láti máa bẹ̀rù Olúwa.
Onyenwe anyị e jirila osimiri Jọdan kpaa oke nʼetiti anyị na unu, unu ụmụ Ruben na Gad. Unu enweghị oke nʼime Onyenwe anyị!’ Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu nwere ike ime ụmụ anyị ka ha kwụsị ịtụ egwu Onyenwe anyị.
26 “Nítorí èyí ni àwa ṣe wí pé, ‘Ẹ jẹ́ kí àwa múra láti mọ pẹpẹ kan, ṣùgbọ́n kì í ṣe fún ẹbọ sísun, tàbí fún àwọn ìrúbọ.’
“Ọ bụ nke a mere anyị ji kpebie sị, ‘Ka anyị jikere wuo ebe ịchụ aja, ma ọ bụghị ebe ịchụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ndị ọzọ,’
27 Ní ọ̀nà mìíràn, yóò jẹ́ ẹ̀rí kan láàrín àwa àti ẹ̀yin àti àwọn ìran tí ń bọ̀, pé àwa yóò jọ́sìn fún Olúwa ní ibi mímọ́ rẹ̀ pẹ̀lú ẹbọ sísun wa, ẹbọ àti ọrẹ àlàáfíà. Nígbà náà ni ẹ̀yìn ọ̀la, àwọn ọmọ yín kò ní lè sọ fún tiwa pé, ‘Ẹ kò ní ìpín nínú ti Olúwa.’
Kama, ọ bụ ebe ịchụ aja ịhụba ama nʼetiti unu na anyị, nakwa ọgbọ ndị nke ga-esote anyị, na anyị ga-efe Onyenwe anyị ofufe nʼụlọnsọ ya, site na ịchụrụ ya aja nsure ọkụ, na aja udo. Mgbe ahụ, nʼoge dị nʼihu, ụmụ ụmụ unu agaghị asị ụmụ ụmụ anyị, ‘Unu enweghị oke nʼime Onyenwe anyị Chineke.’
28 “Àwa sì wí pé, ‘Tí wọ́n bá tilẹ̀ sọ èyí fún wa, tàbí sí àwọn ọmọ wa, a ó dáhùn pé, “Ẹ wo àpẹẹrẹ pẹpẹ Olúwa, èyí tí àwọn baba wa mọ, kì í ṣe fún ẹbọ sísun àti ẹbọ ṣùgbọ́n fún ẹ̀rí láàrín àwa àti ẹ̀yin.”’
“Echiche obi anyị bụ na ọ bụrụ na ụmụ ụmụ unu ekwuo ihe dị otu a, ụmụ anyị ga-azaghachi ha sị, ‘Lee ebe ịchụ aja nna anyị ha wuru, nke yiri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. E wughị ya maka ịchụ aja nsure ọkụ, kama e wuru ya dịka ihe ama na-egosi nnwekọ dị nʼetiti anyị na unu.’
29 “Kí Ọlọ́run má jẹ́ kí àwa kí ó ṣọ̀tẹ̀ sí Olúwa, kí àwa sì yípadà kúrò ní ọ̀dọ̀ rẹ ní òní nípa mímọ pẹpẹ ẹbọ sísun, ọrẹ oúnjẹ jíjẹ àti ẹbọ lẹ́yìn pẹpẹ Olúwa Ọlọ́run wa tí ó dúró níwájú àgọ́ rẹ̀.”
“Anyị agaghị enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ; anyị agaghị esitekwa nʼiso Onyenwe anyị Chineke wezuga onwe anyị, site nʼiwuru onwe anyị ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka maọbụ ụdị aja ọzọ dị iche iche. Ebe ịchụ aja anyị maara bụ ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke anyị, nke guzo nʼihu ụlọ nzute ya.”
30 Nígbà tí Finehasi àlùfáà àti àwọn olórí ìjọ ènìyàn, àwọn olórí ìdílé Israẹli gbọ́ ohun tí Reubeni, Gadi àti Manase ti sọ, ó dùn mọ́ wọn.
Mgbe Finehaz onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ ahụ, bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Izrel nụrụ ihe ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ụmụ Manase kwuru, ọ masịrị ha.
31 Finehasi ọmọ Eleasari, àlùfáà wí fún Reubeni, Gadi àti Manase pé, “Ní òní ni àwa mọ̀ pé Olúwa wà pẹ̀lú wa, nítorí tí ẹ̀yin kò hùwà àìṣòótọ́ sí Olúwa ní orí ọ̀rọ̀ yí nísinsin yìí, ẹ̀yin ti yọ àwọn ará Israẹli kúrò ní ọwọ́ Olúwa”.
Ya mere, Finehaz nwa Elieza, bụ onye nchụaja, sịrị Ruben, na Gad, na Manase, “Taa ka anyị maara na Onyenwe anyị nọ nʼetiti anyị, nʼihi na unu emehieghị megide Onyenwe anyị dịka anyị chere. Ya mere, unu azọpụtala ndị Izrel site na mbibi gaara abịakwasị ha site nʼaka Onyenwe anyị.”
32 Nígbà náà ni Finehasi ọmọ Eleasari àlùfáà àti àwọn olórí padà sí Kenaani láti ibi ìpàdé wọn pẹ̀lú àwọn ẹ̀yà Reubeni àti ẹ̀yà Gadi ní Gileadi, wọ́n sì mú ìròyìn tọ àwọn ọmọ Israẹli lọ.
Mgbe ahụ Finehaz, nwa Elieza, onye nchụaja, na ndị ndu ahụ laghachitere Kenan site na nzukọ ha na ụmụ Ruben na Gad na ọkara Manase mere nʼala Gilead kọọrọ Izrel ihe ha gatara.
33 Inú wọn sì dùn láti gbọ́ ìròyìn náà, wọ́n sì yin Ọlọ́run. Wọn kò sì sọ̀rọ̀ mọ́ nípa lílọ bá wọn jagun láti run ilẹ̀ tí àwọn ẹ̀yà Reubeni àti ẹ̀yà Gadi ń gbé.
Okwu a tọrọ ụmụ Izrel ụtọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, too Chineke otuto. Ha ekwukwaghị okwu ibu agha megide ụmụ Ruben, ụmụ Gad na ụmụ Manase, banyere ibibi ala ha bi nʼime ya.
34 Ẹ̀yà Reubeni àti ẹ̀yà Gadi sì fún pẹpẹ náà ní orúkọ yìí, “Ẹ̀rí láàrín wa pé Olúwa ni Ọlọ́run.”
Ya mere, ụmụ Ruben na ụmụ Gad kpọrọ ebe ịchụ aja ha wuru, “Ebe ịchụ aja akaebe,” nʼihi na ha sịrị, “Ọ bụ ihe akaebe igosi mmadụ niile na Onyenwe anyị bụkwa Chineke anyị.”