< Joshua 13 >

1 Nígbà tí Joṣua sì darúgbó tí ọjọ́ orí rẹ̀ sì pọ̀ jọjọ, Olúwa sọ fún un pé, “Ìwọ ti darúgbó púpọ̀, bẹ́ẹ̀ ni ilẹ̀ sì kù lọ́pọ̀lọ́pọ̀ fún yín láti gbà.
Nʼoge a, Joshua aghọọla agadi nwoke, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadi, ụbọchị ọgwụgwụ ndụ gị abịala nso, ma ọtụtụ ala fọdụrụ ndị a ga-emeri.
2 “Èyí ni ilẹ̀ tí ó kù: “gbogbo àwọn agbègbè àwọn Filistini, àti ti ara Geṣuri:
“Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta: “ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile,
3 láti odò Ṣihori ní ìlà-oòrùn Ejibiti sí agbègbè Ekroni ìhà àríwá, gbogbo rẹ̀ ni a kà kún Kenaani (agbègbè ìjòyè Filistini márùn-ún ní Gasa, Aṣdodu, Aṣkeloni, Gitti àti Ekroni; ti àwọn ará Affimu);
site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn; nakwa ala ndị Ava,
4 láti gúúsù; gbogbo ilẹ̀ àwọn ará Kenaani, láti Arah ti àwọn ará Sidoni títí ó fi dé Afeki, agbègbè àwọn ará Amori,
site na ndịda ala ahụ niile dị nʼugwu; nʼala ndị Kenan, na Meara, nke bụ ala ndị Saịdọn, ruo nʼAfek, na oke ala ndị Amọrait;
5 àti ilẹ̀ àwọn ará Gebali; àti gbogbo àwọn Lebanoni dé ìlà-oòrùn, láti Baali-Gadi ní ìsàlẹ̀ òkè Hermoni dé Lebo-Hamati.
na ala ndị Gebal niile; na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat.
6 “Ní ti gbogbo àwọn olùgbé agbègbè òkè, láti Lebanoni sí Misrefoti-Maimu, àní, gbogbo àwọn ará Sidoni, èmi fúnra mi ní yóò lé wọn jáde ní iwájú àwọn ará Israẹli. Kí o ri dájú pé o pín ilẹ̀ yí fún Israẹli ní ilẹ̀ ìní, gẹ́gẹ́ bí mo ṣe fi àṣẹ fún ọ,
“Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu.
7 pín ilẹ̀ yìí ní ilẹ̀ ìní fún àwọn ẹ̀yà mẹ́sàn-án àti ìdajì ẹ̀yà Manase.”
Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.”
8 Àwọn ìdajì ẹ̀yà Manase tí ó kù, àti àwọn Reubeni àti àwọn Gadi ti gba ilẹ̀ ìní, tí Mose ti fún wọn ní ìhà ìlà-oòrùn Jordani bí Mose ìránṣẹ́ Olúwa ti fi fún wọn.
Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha.
9 Ó sì lọ títí láti Aroeri tí ń bẹ létí àfonífojì Arnoni, àti láti ìlú náà tí ń bẹ ní àárín àfonífojì náà, àti pẹ̀lú gbogbo pẹ̀tẹ́lẹ̀ Medeba títí dé Diboni.
Ala ha gbatịrị site nʼAroea nke dị na ndagwurugwu Anọn, na site nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ, ruo nʼala dị larịị nke gbatịrị site na Medeba ruo Dibọn.
10 Gbogbo ìlú Sihoni ọba àwọn Amori, tí ó ṣe àkóso ní Heṣboni, títí dé ààlà àwọn ará Ammoni.
Ọ gbatịkwara ruo nʼoke ala ndị Amọn, tinyere obodo niile nke Saịhọn, eze ndị Amọrait na-achị mgbe o bi na Heshbọn.
11 Àti Gileadi, ní agbègbè àwọn ènìyàn Geṣuri àti Maakati, gbogbo òkè Hermoni àti gbogbo Baṣani títí dé Saleka,
Ọ gụnyekwara Gilead, nʼoke ala ndị Geshua, na ndị Maaka, na ugwu Hemon niile, na Bashan niile, ruokwa Saleka.
12 ìyẹn, gbogbo ilẹ̀ ọba Ogu ní Baṣani, tí ó jẹ ọba ní Aṣtarotu àti Edrei, ẹni tí ó kù nínú àwọn Refaimu ìyókù. Mose ti ṣẹ́gun wọn, ó sì ti gba ilẹ̀ wọn.
Ya bụ, obodo niile nke Ọg eze ndị Bashan na-achị, mgbe isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. (Ọ bụ eze ikpeazụ nʼagbụrụ ndị Refaim.) Mosis busoro Saịhọn na Ọg agha, tigbuo ha, napụkwa ha ala ha.
13 Ṣùgbọ́n àwọn ará Israẹli kò lé àwọn ará Geṣuri àti Maakati jáde, bẹ́ẹ̀ ni wọ́n ń gbé ní àárín àwọn ará Israẹli títí di òní yìí.
Ma ndị Izrel achụpụghị ndị Geshua na ndị Maaka, ya mere, ha nọgidere na-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo taa.
14 Ṣùgbọ́n àwọn ẹ̀yà Lefi ni kò fi ogún kankan fún, níwọ̀n ìgbà tí ó ti jẹ́ pé ọrẹ àfinásun sí Olúwa Ọlọ́run Israẹli ni ogún tiwọn, gẹ́gẹ́ bí o ti ṣèlérí fún wọn.
O nweghị ala o kenyere ebo Livayị. Nʼihi na Onyenwe anyị kwere ha nkwa na ihe nketa ha ga-abụ ihe aja onyinye niile e si nʼọkụ na-ewetara Onyenwe anyị Chineke Izrel.
15 Èyí ni Mose fi fún ẹ̀yà Reubeni ni agbo ilé sí agbo ilé,
Nke a bụ ala Mosis nyere ebo Ruben dịka agbụrụ ha si dị, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
16 láti agbègbè Aroeri ní etí Arnoni Jọ́ọ́jì àti láti ìlú tí ń bẹ láàrín Jọ́ọ́jì, àti gbogbo pẹ̀tẹ́lẹ̀ ní ìkọjá Medeba
Ala ha gbatịrị site nʼAroea, na ndagwurugwu iyi Anọn, sitekwa nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ na ala dị larịị gabiga gafee Medeba,
17 sí Heṣboni àti gbogbo ìlú rẹ̀ ní pẹ̀tẹ́lẹ̀, pẹ̀lú Diboni, Bamoti Baali, Beti-Baali-Mioni,
ruo Heshbọn, na obodo ndị ọzọ dị nʼala larịị ahụ, tinyere obodo Dibọn, na Bamot Baal, na Bet-Baal-Meon,
18 Jahisa, Kedemoti, Mefaati,
na Jahaz, na Kedemot, na Mefaat,
19 Kiriataimu, Sibma, Sereti Ṣahari lórí òkè ní àfonífojì.
na Kiriatem, na Sibma, na Zeret Shaha, nke dị nʼugwu nta dị na ndagwurugwu ahụ;
20 Beti-Peori, gẹ̀rẹ́gẹ̀rẹ́ Pisga, àti Beti-Jeṣimoti
na Bet-Peoa, na Bet-Jeshimọt, nke dị nʼebe dị na mgbada ugwu Pisga;
21 gbogbo ìlú tí ó wà ní pẹ̀tẹ́lẹ̀ àti gbogbo agbègbè Sihoni ọba Amori, tí ó ṣe àkóso Heṣboni. Mose sì ti ṣẹ́gun rẹ̀ àti àwọn ọmọ ìjòyè Midiani, Efi, Rekemu, Suri, Huri àti Reba, àwọn ọmọ ọba pawọ́pọ̀ pẹ̀lú Sihoni tí ó gbé ilẹ̀ náà.
na obodo niile dị nʼala larịị ahụ, na ala Saịhọn niile, onye bụ eze ndị Amọrị nke chịrị na Heshbọn. Mosis lụgburu ya, lụgbukwaa ndịisi Midia bụ Evi, na nke Rekem, na nke Zua, na nke Hua, na nke Reba, ụmụ ndị eze ha na Saịhọn jikọtara aka buo agha.
22 Ní àfikún àwọn tí a pa ní ogun, àwọn ọmọ Israẹli fi idà pa Balaamu ọmọ Beori alásọtẹ́lẹ̀.
Tinyere ndị ha gburu nʼọgbọ agha, ụmụ Izrel ji mma agha gbuo Belam nwa Beoa, onye na-agba aja.
23 Ààlà àwọn ọmọ Reubeni ni etí odò Jordani. Àwọn ìlú wọ̀nyí àti abúlé rẹ̀ ni ilẹ̀ ìní àwọn ọmọ Reubeni ní agbo ilé ní agbo ilé.
Ya mere, oke ala ebo Ruben dị nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Obodo ukwu na obodo nta ndị a bụ ihe ha nwetara dịka ihe nketa ha. Ezinaụlọ ọbụla nwetakwara oke nke ha dịka ikwu ha si dị.
24 Èyí ni ohun tí Mose ti fi fún ẹ̀yà Gadi, ní agbo ilé ní agbo ilé.
Mosis nyekwara ebo Gad ala nke ha site nʼala ahụ ha lụgburu, dịka ikwu ha si dị.
25 Agbègbè ìlú Jaseri, gbogbo ìlú Gileadi àti ìdajì orílẹ̀-èdè àwọn ọmọ ará Ammoni títí dé Aroeri, ní ẹ̀bá Rabba;
Ndị a bụ ala ebo Gad nwetara: ala ahụ niile dị na Jeza, na obodo Gilead niile, na ọkara ala ndị Amọn nke ruru Areoa, nʼakụkụ Raba.
26 àti láti Heṣboni lọ sí Ramati-Mispa àti Betonimu, àti láti Mahanaimu sí agbègbè ìlú Debiri,
Na ala sitere Heshbọn ruo Ramat Mizpa, na Betonim, na sitekwa Mahanaim ruo oke ala Debịa.
27 àti ní àfonífojì Beti-Haramu, Beti-Nimra, Sukkoti àti Safoni pẹ̀lú ìyókù agbègbè ilẹ̀ Sihoni ọba Heṣboni (ní ìhà ìlà-oòrùn Jordani, agbègbè rẹ̀ títí dé òpin Òkun Kinnereti).
Nʼime ndagwurugwu ala ha bụ Bet-Haram, na Bet-Nimra, na Sukọt, na Zafọn, na ala fọdụrụ nʼalaeze Saịhọn eze Heshbọn, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼoke ala ya ruokwa nsọtụ osimiri Galili.
28 Àwọn ìlú wọ̀nyí àti abúlé rẹ̀ jẹ́ ogún àwọn ọmọ Gadi, ní agbo ilé ní agbo ilé.
Obodo ndị a na obodo nta ndị ọzọ bụ ihe nketa ụmụ Gad dịka agbụrụ ha si dị.
29 Èyí ni ohun tí Mose ti fi fún ìdajì ẹ̀yà Manase, èyí ni pé, fún ìdajì ìdílé irú-ọmọ Manase, ní agbo ilé ní agbo ilé.
Mosis nyekwara ikwu ọbụla dị nʼọkara ebo Manase ala nke ha, dịka mkpa ha si dị.
30 Ilẹ̀ náà fẹ̀ dé Mahanaimu àti gbogbo Baṣani, gbogbo agbègbè ilẹ̀ Ogu ọba Baṣani, èyí tí í ṣe ibùgbé Jairi ní Baṣani, ọgọ́ta ìlú,
Ala ha ketara gbatịrị ruo Mahanaim. Ọ bụ ha nwekwa ala Bashan niile, na ala niile Ọg, eze Bashan, na-achị, tinyere iri obodo nta isii dị na Bashan, nke Jaịa wuru. Ha nwetakwara
31 ìdajì Gileadi, àti Aṣtarotu àti Edrei (àwọn ìlú ọba Ogu ní Baṣani). Èyí ni fún irú àwọn ọmọ Makiri ọmọ Manase fún ààbọ̀ àwọn ọmọ Makiri, ní agbo ilé ní agbo ilé.
ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan. Ala ndị a niile ka e nyere ọkara ebo Manase, ya bụ ikwu niile e nwere site nʼụmụ Makia, ọkpara Manase.
32 Èyí ni ogún tí Mose fi fún wọn nígbà tí ó wà ní pẹ̀tẹ́lẹ̀ Moabu ní ìhà kejì Jordani ní ìlà-oòrùn Jeriko.
Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko.
33 Ṣùgbọ́n fún ẹ̀yà Lefi, Mose kò fi ogún fún un; Olúwa, Ọlọ́run Israẹli, ní ogún wọn, gẹ́gẹ́ bí ó ti ṣe ìlérí fún wọn.
Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na Onyenwe anyị, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa.

< Joshua 13 >