< Jeremiah 9 >

1 Háà! Orí ìbá jẹ́ orísun omi kí ojú mi sì jẹ́ orísun omijé! Èmi yóò sì sọkún tọ̀sán tòru nítorí ìparun àwọn ènìyàn mi.
Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta; ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya. Agaara m akwagide akwa ehihie na abalị nʼihi ndị m niile e gburu egbu.
2 Háà, èmi ìbá ní ni aginjù ilé àgbàwọ̀ fún àwọn arìnrìn-àjò, kí n ba à lè fi àwọn ènìyàn mi sílẹ̀ kí n sì lọ kúrò lọ́dọ̀ wọn: nítorí gbogbo wọn jẹ́ panṣágà àjọ aláìṣòótọ́ ènìyàn.
Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara. Ka m nwee ike hapụ ndị m site nʼebe ha nọ pụọ. Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko, igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
3 Wọ́n ti pèsè ahọ́n wọn sílẹ̀ bí ọfà láti fi pa irọ́; kì í ṣe nípa òtítọ́ ni wọ́n fi borí ní ilẹ̀ náà. Wọ́n ń lọ láti inú ẹ̀ṣẹ̀ kan sí òmíràn; wọn kò sì náání mi, ní Olúwa wí.
“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta, ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ; Ọ bụghị site nʼeziokwu ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ. Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ; ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4 “Ṣọ́ra fún àwọn ọ̀rẹ́ rẹ; má ṣe gbẹ́kẹ̀lé àwọn arákùnrin rẹ. Nítorí pé oníkálùkù arákùnrin jẹ́ atannijẹ, oníkálùkù ọ̀rẹ́ sì jẹ́ abanijẹ́.
“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.
5 Ọ̀rẹ́ ń dalẹ̀ ọ̀rẹ́. Kò sì ṣí ẹni tó sọ òtítọ́, wọ́n ti kọ́ ahọ́n wọn láti máa purọ́. Wọ́n sọ ara wọn di onírẹ̀wẹ̀sì pẹ̀lú ẹ̀ṣẹ̀
Enyi na-aghọgbu enyi ya, ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu. Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha; ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie.
6 Ó ń gbé ní àárín ẹ̀tàn; wọ́n kọ̀ láti mọ̀ mí nínú ẹ̀tàn wọn,” ni Olúwa wí.
I bi nʼetiti aghụghọ. Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
7 Nítorí náà, èyí ni ohun tí Olúwa Ọlọ́run Àwọn ọmọ-ogun wí: “Wò ó, èmi dán wọn wo; nítorí pé kí ni èmi tún le è ṣe? Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ àwọn ènìyàn mi?
Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m?
8 Ahọ́n wọn dàbí ọfà olóró; ó ń sọ ẹ̀tàn. Oníkálùkù sì ń fi ẹnu rẹ̀ sọ̀rọ̀ àlàáfíà sí aládùúgbò rẹ̀, ní inú ọkàn rẹ̀, ó dẹ tàkúté sílẹ̀.
Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”
9 Èmi kì yóò ha fi ìyà jẹ wọ́n nítorí èyí?” ni Olúwa wí. “Èmi kì yóò ha gbẹ̀san ara mi lórí irú orílẹ̀-èdè yìí bí?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”
10 Èmi yóò sì sọkún, pohùnréré ẹkún fún àwọn òkè àti ẹkún ìrora lórí pápá oko aginjù wọ̀n-ọn-nì. Nítorí wọ́n di ahoro, wọn kò sì kọjá ní ibẹ̀. A kò sì gbọ́ igbe ẹran ọ̀sìn. Àwọn ẹyẹ ojú ọ̀run sì ti sálọ, bẹ́ẹ̀ náà ni àwọn ẹranko sì ti lọ.
Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa. Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara. Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya. A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ. Ụmụ nnụnụ efefusịala. Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.
11 “Èmi yóò sì sọ Jerusalẹmu di òkìtì àlàpà àti ihò àwọn ìkookò. Èmi ó sì sọ ìlú Juda di ahoro tí ẹnikẹ́ni kò sì ní le è gbé.”
“Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi. Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri. Aga m ekposa obodo niile nke Juda. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.”
12 Ta ni ẹni náà tí ó ní ọgbọ́n láti mòye nǹkan wọ̀nyí? Ta ni Olúwa ti sọ èyí fún, tí ó sì lè ṣàlàyé rẹ̀? Èéṣe tí ilẹ̀ náà fi ṣègbé bí aginjù, tí ẹnìkankan kò sì le là á kọjá?
Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?
13 Olúwa sì wí pé, nítorí pé wọ́n ti kọ òfin mi sílẹ̀, èyí tí mo gbé kalẹ̀ níwájú wọn, wọn ṣe àìgbọ́ràn sí wọn, wọn kò sì rìn nínú òfin mi.
Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.
14 Dípò èyí, wọ́n ti tẹ̀lé agídí ọkàn wọn, wọ́n ti tẹ̀lé Baali gẹ́gẹ́ bí àwọn baba wọn ṣe kọ́ wọn.
Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.”
15 Nítorí náà, èyí ni ohun tí Olúwa àwọn ọmọ-ogun, Ọlọ́run Israẹli wí, “Wò ó, Èmi yóò mú kí àwọn ènìyàn wọ̀nyí jẹ oúnjẹ kíkorò àti láti mu omi májèlé.
Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi.
16 Èmi yóò sì tú wọn ká láàrín àwọn orílẹ̀-èdè, nínú èyí tí àwọn tàbí àwọn baba wọn kò mọ̀. Èmi yóò sì lépa wọn pẹ̀lú idà títí èmi yóò fi pa wọ́n run.”
Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.”
17 Èyí sì ni ohun tí Olúwa Ọlọ́run àwọn ọmọ-ogun wí: “Sá à wò ó nísinsin yìí! Ké sí obìnrin ti ń ṣọ̀fọ̀ nì kí ó wá; sì ránṣẹ́ pe àwọn tí ó mòye nínú wọn.
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa. E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa.
18 Jẹ́ kí wọn wá kíákíá, kí wọn wá pohùnréré ẹkún lé wa lórí títí ojú wa yóò fi sàn fún omijé tí omi yóò sì máa sàn àwọn ìpéǹpéjú wa.
Ha bịa ngwangwa kwaa akwa nʼihi anyị, tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya, tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị.
19 A gbọ́ igbe ìpohùnréré ẹkún ní Sioni: ‘Àwa ti ṣègbé tó! A gbọdọ̀ fi ilẹ̀ wa sílẹ̀, nítorí pé àwọn ilé wa ti parun.’”
Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn ‘Lee ka anyị si laa nʼiyi! Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu! Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị, nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’”
20 Nísinsin yìí, ẹ̀yin obìnrin ẹ gbọ́ ọ̀rọ̀ Olúwa; ṣí etí yín sí ọ̀rọ̀ ẹnu rẹ. Kọ́ àwọn ọmọbìnrin yín ní ìpohùnréré ẹkún, kí ẹ sì kọ́ ara yín ní arò.
Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị, megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ. Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa, kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.
21 Ikú ti gba ojú fèrèsé wa wọlé ó sì ti wọ odi alágbára wa ó ti ké àwọn ọmọ kúrò ní àdúgbò àti àwọn ọ̀dọ́mọkùnrin kúrò ní gbọ̀ngàn ìta gbangba.
Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị. O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ, gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.
22 Sọ pé, “Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “‘Òkú àwọn ènìyàn yóò ṣubú bí ààtàn ní oko gbangba àti bí ìbùkúnwọ́ lẹ́yìn olùkórè láìsí ẹnìkankan láti kó wọn jọ.’”
Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ dịka unyi e kpofuru nʼọhịa, dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi, nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’”
23 Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “Má ṣe jẹ́ kí ọlọ́gbọ́n yangàn nítorí agbára ọgbọ́n rẹ̀, tàbí alágbára nítorí agbára rẹ̀, tàbí ọlọ́rọ̀ nítorí ọrọ̀ rẹ̀.
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya, ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya, ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya,
24 Ẹ jẹ́ kí ẹni tí ń ṣògo nípa èyí nì wí pé: òun ní òye, òun sì mọ̀ mí wí pé, Èmi ni Olúwa tí ń ṣe òtítọ́, ìdájọ́ àti òdodo ní ayé, nínú èyí ni mo ní inú dídùn sí,” Olúwa wí.
kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a: na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ, Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere, na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa. Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
25 “Ọjọ́ ń bọ̀,” ni Olúwa wí, “tí Èmi yóò fi ìyà jẹ gbogbo àwọn tí a kọ ilà fún nínú ara nìkan.
“Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ.
26 Ejibiti, Juda, Edomu, Ammoni, Moabu àti gbogbo àwọn tí ń gbé ní ọ̀nà jíjìn réré ní aginjù. Nítorí pé gbogbo àwọn orílẹ̀-èdè wọ̀nyí jẹ́ aláìkọlà gbogbo àwọn ará ilé Israẹli sì jẹ́ aláìkọlà ọkàn.”
Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”

< Jeremiah 9 >