< Jeremiah 7 >
1 Èyí ni ọ̀rọ̀ tó tọ Jeremiah wá láti ọ̀dọ̀ Olúwa.
Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
2 “Dúró ní ẹnu-ọ̀nà ilé Olúwa kí o sì kéde ọ̀rọ̀ yí: “‘Ẹ gbọ́ ọ̀rọ̀ Olúwa gbogbo ẹ̀yin ará Juda tí ń gba ọ̀nà yí wọlé láti wá sin Olúwa.
“Guzo nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọ Onyenwe anyị kwusaa ozi a nʼebe ahụ, “‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juda niile, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a niile na-abata ife Onyenwe anyị ofufe.
3 Èyí ni ọ̀rọ̀ tí Olúwa àwọn ọmọ-ogun Ọlọ́run Israẹli wí: Tún àwọn ọ̀nà yín ṣe, èmi yóò sì jẹ́ kí ẹ gbé ilẹ̀ yìí.
Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu. Mezienụ ụzọ unu na omume unu niile, m ga-ekwe ka unu biri nʼebe a.
4 Má ṣe gba ọ̀rọ̀ ẹ̀tàn gbọ́ kí ẹ sì wí pé, “Èyí ni tẹmpili Olúwa ilé tẹmpili Olúwa, ilé tẹmpili Olúwa!”
Unu atụkwasịla uche unu nʼokwu aghụghọ niile a na-agwa unu na-asị, “Nke a bụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị!”
5 Bí ẹ̀yin bá tún ọ̀nà yín àti iṣẹ́ yín ṣe nítòótọ́, tí ẹ sì ń bá ara yín lò ní ọ̀nà tó tọ́.
Ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu guzozie, ọ bụrụ na unu emesoo ibe unu mmeso nʼụzọ ikpe ziri ezi,
6 Bí ẹ kò bá fi ara ni àwọn àlejò, àwọn ọmọ aláìní baba àti àwọn opó tí ẹ kò sì ta ẹ̀jẹ̀ aláìṣẹ̀ sílẹ̀ ní ibí yìí, bí ẹ kò bá sì tọ ọlọ́run mìíràn lẹ́yìn sí ìpalára ara yín.
ọ bụrụ na unu ahapụ imegbu ndị ọbịa, na ndị na-enweghị nna, maọbụ nwanyị di ya nwụrụ; ọ bụrụ na unu ajụ iwufu ọbara onye aka ya dị ọcha nʼebe a, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaso chi ndị ọzọ nke na-ewetara unu nsogbu,
7 Nígbà náà ni èmi yóò jẹ́ kí ẹ gbé ìbí yìí, nílẹ̀ tí mo fún àwọn baba ńlá yín títí láé.
mgbe ahụ, aga m ekwere ka unu biri nʼebe a, nʼala a m nyere nna nna unu ha, ruo mgbe ebighị ebi.
8 Ẹ wò ó, ẹ ń gba ọ̀rọ̀ ẹ̀tàn tí kò níláárí gbọ́.
Ma lee, ihe unu na-eme ugbu a bụ ịtụkwasị uche unu nʼokwu aghụghọ nke na-enweghị isi.
9 “‘Ẹ̀yin yóò ha jalè, kí ẹ pànìyàn, kí ẹ ṣe panṣágà, kí ẹ búra èké, kí ẹ sun tùràrí sí Baali, kí ẹ sì tọ ọlọ́run mìíràn tí ẹ̀yin kò mọ̀ lọ?
“‘Unu ga-aga nʼihu na-ezu ohi, na-egbu mmadụ ibe unu, na-akwa iko, ma na-eji chi ndị ọzọ na-aṅụ iyi? Unu ga-anọgide na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, ma na-agbaso chi ndị ọzọ unu na-amaghị?
10 Nígbà náà ni kí ó wá dúró ní iwájú nínú ilé yìí tí a fi orúkọ mi pè, “Kí ẹ wá wí pé àwa yè,” àwa yè láti ṣe gbogbo àwọn nǹkan ìríra wọ̀nyí bí?
Unu ga-emecha bịa guzo nʼihu m nʼụlọnsọ a, nke a kpọkwasịrị aha m, na-asị, “Anyị nọ na nchekwa,” ọ bụ ịnọ na nchekwa maka ime ihe arụ niile ndị a?
11 Ṣé ilé yìí, tí a fi orúkọ mi pè ti di ihò àwọn ọlọ́ṣà lọ́dọ̀ yín ni? Èmi ti ń wò ó! ni Olúwa wí.
Ọ pụtara na ụlọ a, nke a kpọkwasịrị aha m aghọọla ogige nye ndị ohi? Ma anọkwa m ya na-ele unu anya, ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12 “‘Ẹ lọ nísinsin yìí sí Ṣilo níbi ti mo kọ́ fi ṣe ibùgbé fún orúkọ mi, kí ẹ sì rí ohun tí mo ṣe sí i nítorí ìwà búburú Israẹli tí í ṣe ènìyàn mi.
“‘Otu ọ dị, biko, Jeruonụ ebe ahụ dị na Shaịlo, ebe ahụ m buru ụzọ mee ka ọ bụrụ ebe a kpọkwasịrị aha m, ka unu chọpụta ihe m mere ya nʼihi ajọ omume ndị m, ụmụ Izrel.
13 Nígbà tí ẹ̀yin ń ṣe àwọn nǹkan wọ̀nyí ni èmi bá a yín sọ̀rọ̀ léraléra ni Olúwa wí ẹ̀yin kò gbọ́, èmi pè yín, ẹ̀yin kò dáhùn.
Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka Onyenwe anyị kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza.
14 Nítorí náà, èmi yóò ṣe ohun tí mo ṣe sí Ṣilo sí ilé náà tí a fi orúkọ mi pè, ilé tẹmpili nínú èyí tí ẹ ní ìgbẹ́kẹ̀lé, ààyè tí mo fún ẹ̀yin àti àwọn baba yín.
Nʼihi ya, ihe ahụ m mere na Shaịlo ka m ga-emekwa ọzọ megide ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. E, aga m eme ya megide ụlọnsọ ukwu ahụ unu na-atụkwasị obi unu nʼime ya, ụlọnsọ ukwu ahụ m nyere unu na nna nna unu ha.
15 Èmi yóò tú kúrò ní iwájú mi gẹ́gẹ́ bí mo ti ṣe sí àwọn arákùnrin yín, àwọn ará Efraimu.’
A ga-esite nʼihu m wezuga unu, tufuo unu, dịka m wezugara ma tufukwaa ụmụnna unu, bụ ndị Ifrem.’
16 “Nítorí náà má ṣe gbàdúrà fún àwọn ènìyàn wọ̀nyí tàbí kí o bẹ̀bẹ̀ fún wọn; ma ṣe bẹ̀ mí, nítorí èmi kì yóò tẹ́tí sí ọ.
“Ya mere, unu ekperela m ekpere nʼihi ndị a; unu atụfula oge unu ịrịọ m arịrịọ nʼihi ha. Agaghị m ege ntị nʼekpere na arịrịọ unu.
17 Ṣé ìwọ kò rí ohun tí wọ́n ń ṣe ní àwọn ìlú Juda àti ní òpópó Jerusalẹmu?
Ọ bụ na unu adịghị ahụ ihe na-eme nʼobodo niile nke Juda, na ihe ha na-eme nʼokporoụzọ niile nke Jerusalem?
18 Àwọn ọmọ ṣa igi jọ, àwọn baba fi iná sí i, àwọn ìyá sì po ìyẹ̀fun láti ṣe àkàrà fún ayaba ọ̀run, wọ́n tú ẹbọ ọrẹ mímu sí àwọn ọlọ́run àjèjì láti ru bínú mi sókè.
Ụmụ na-achịkọta nkụ nke nna ha ji emenye ọkụ, ebe nne ha na-eghe achịcha ha na-eche nʼihu Eze nwanyị mbara Eluigwe. Ha na-awụpụrụ chi ndị ọzọ mmanya nʼihi ịkpasu m iwe.
19 Ṣùgbọ́n ṣe èmi ni wọ́n fẹ́ mú bínú? ni Olúwa wí. Ǹjẹ́ kì í ṣe pé wọ́n kúkú ń pa ara wọn lára sí ìtìjú ara wọn?
Ọ bụ m ka ha na-akpasu iwe? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ bụghị onwe ha ka ha na-emesi ike, ka ihe ihere mee ha?
20 “‘Nítorí náà, èyí ni ohun tí Olúwa Olódùmarè wí, “Èmi yóò tú ìbínú àti ìrunú mi sí orílẹ̀ yìí ènìyàn àti ẹranko, igi, pápá àti èso orí ilẹ̀, yóò sì jó tí kò ní ṣe é pa.”
“‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Iwe m na ọnụma m ka a ga-awụkwasị nʼebe a, nʼelu ndị mmadụ, na anụmanụ, na osisi dị nʼọhịa, na mkpụrụ nke ala ubi. Ọ ga-ere ọkụ ma agaghị emenyụ ya.
21 “‘Èyí ni Olúwa Ọlọ́run àwọn ọmọ-ogun, Ọlọ́run Israẹli wí: Tẹ̀síwájú kí ẹ kó ẹbọ sísun yín àti àwọn ẹbọ yòókù papọ̀ kí ẹ̀yin kí ó sì jẹ ẹran wọ́n fúnra yín.
“‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Gaanụ nʼihu, tụkwasịnụ aja nsure ọkụ unu nʼelu aja unu ndị ọzọ niile. Riekwanụ anụ ndị a nʼonwe unu.
22 Ní tòsí nígbà tí mo mú àwọn baba ńlá yín jáde kúrò ní ilẹ̀ Ejibiti tí mo sì bá wọn sọ̀rọ̀. N kò pàṣẹ fún wọn lórí ẹbọ sísun lásán.
Nʼihi na mgbe m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha, gwa ha okwu, e nyeghị ha naanị iwu maọbụ gwa ha okwu banyere ịchụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ.
23 Mo pàṣẹ fún wọn báyìí pé; gbọ́ tèmi, èmi yóò sì jẹ́ Ọlọ́run yín ẹ̀yin yóò sì jẹ́ ènìyàn mi. Máa rìn ní ojú ọ̀nà tí mo pàṣẹ fún yín, kí ó lè dára fún yín.
Ma iwu m nyere ha bụ nke a, ruberenụ m isi, aga m abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị nke m. Bienụ ndụ nʼiwu niile m nyere unu, ka ihe gaara unu nke ọma.
24 Ṣùgbọ́n wọn kò gbọ́, wọn kò sì fetísílẹ̀ dípò èyí wọ́n ń tẹ̀ sí ọ̀nà agídí ọkàn wọn. Dípò kí wọn tẹ̀síwájú wọ́n ń rẹ̀yìn.
Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ.
25 Láti ìgbà tí àwọn baba ńlá yín ti jáde ní Ejibiti títí di òní, ni èmi ti ń rán àwọn ìránṣẹ́ mi, àwọn wòlíì sí yín.
Site na mgbe nna nna unu ha hapụrụ ala Ijipt, esepụbeghị m aka izitere unu ndị amụma bụ ndị ohu m.
26 Wọn kò gbọ́ wọn kò sì fetísílẹ̀. Wọ́n wa ọrùn le, wọn wa ọrùn kì, wọ́n sì hu ìwà ìbàjẹ́ ju àwọn baba ńlá wọn.’
Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’
27 “Nígbà tí ìwọ bá sọ gbogbo èyí fún wọn, wọn kì yóò gbọ́ tirẹ̀, nígbà tí ìwọ bá sì pè wọ́n, wọn kì yóò dáhùn.
“Mgbe ị gwara ha ihe ndị a niile, ha agaghị ege ntị. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ ha oku ha agaghị aza.
28 Nítorí náà, sọ fún wọn pé, ‘Èyí ni orílẹ̀-èdè tí kò gbọ́ ti Olúwa Ọlọ́run rẹ̀ tàbí kí ó ṣe ìgbọ́ràn sí ìbáwí. Ọ̀rọ̀ òtítọ́ kò sí ní ètè wọn.
Ya mere, ihe ndị a ka ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ mba na-enwebeghị oge ha ji rubere Onyenwe anyị Chineke ha isi. O nwebekwaghị oge ọbụla ha ji nabata ịdọ aka na ntị ya. Eziokwu ọbụla adịghịkwa; okwu ọnụ ha bụ naanị ụgha ụgha.
29 “‘Gé irun yín kí ẹ sì dàánù, pohùnréré ẹkún lórí òkè, nítorí Olúwa ti kọ ìran yìí tí ó wà lábẹ́ ìbínú rẹ̀ sílẹ̀.
“‘Kpụchaanụ agịrị isi unu, tufuo ya, nọọnụ nʼebe dị elu nke tọgbọrọ nʼefu bulie abụ akwa, nʼihi na Onyenwe anyị esitela nʼoke ọnụma ya jụ ọgbọ a. Ọ gbakụtala ha azụ bụ ọgbọ nke a iwe ya na-adakwasị.
30 “‘Àwọn ènìyàn Juda ti ṣe búburú lójú mi, ni Olúwa wí. Wọ́n ti to àwọn ère ìríra wọn jọ sí ilé tí a fi orúkọ mi pè wọ́n sì ti sọ ọ́ di àìmọ́.
“‘Onyenwe anyị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya.
31 Wọ́n ti kọ́ àwọn ibi gíga ti Tofeti ní àfonífojì Beni-Hinnomu láti sun àwọn ọmọkùnrin àti ọmọbìnrin wọn nínú iná èyí tí èmi kò pàṣẹ tí kò sì wá sí ọkàn mi.
Ha ewuolara onwe ha ebe ịchụ aja dị elu na Tofet, nke dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ebe ahụ ka ha na-anọ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ọkụ. Ihe dị otu a abụkwaghị ụdị ihe m nyere ha nʼiwu ka ha mee. O nwekwaghị oge ihe dị otu a batara m nʼobi.
32 Nítorí náà kíyèsára ọjọ́ ń bọ̀, ni Olúwa wí, nígbà tí àwọn ènìyàn kò ní pè é ní Tafeti tàbí àfonífojì ti Beni-Hinnomu; ṣùgbọ́n yóò ma jẹ àfonífojì ìparun, nítorí wọn yóò sin òkú sí Tofeti títí kò fi ní sí ààyè mọ́.
Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe ndị mmadụ na-agaghị akpọkwa ebe ahụ Tofet maọbụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Kama ha ga-akpọ ya ndagwurugwu ogbugbu mmadụ, nʼihi na ha ga-eli ọtụtụ ndị ha na Tofet ruo mgbe ha na-agaghị ahụkwa ebe ha ga-eli ndị fọdụrụ.
33 Nígbà náà ni òkú àwọn ènìyàn wọ̀nyí yóò di oúnjẹ fún àwọn ẹyẹ ojú ọ̀run àti ẹranko ilẹ̀, kò sì ní sí ẹnìkan tí yóò dẹ́rùbà wọ́n.
Mgbe ahụ, ozu ndị mmadụ ndị a ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.
34 Èmi yóò mú òpin bá ìró ayọ̀ àti ìdùnnú àti ohùn àwọn tọkọtaya ní àwọn ìlú Juda àti ní ìgboro Jerusalẹmu, nítorí tí ilẹ̀ náà yóò di ahoro.
Mgbe ahụ, aga m eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye nʼobodo niile nke Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem kwụsị. Ala ahụ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu.