< Jeremiah 47 >
1 Èyí ni ọ̀rọ̀ Olúwa tó tọ wòlíì Jeremiah wá nípa àwọn Filistini, kí ó tó di pé Farao dojúkọ Gasa.
Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha.
2 Báyìí ni Olúwa wí: “Wo bí omi ti ń ru sókè ní àríwá, wọn ó di odò tí ń bo bèbè mọ́lẹ̀. Wọn kò ní borí ilẹ̀ àti ohun gbogbo tó wà lórí rẹ̀, ìlú àti àwọn tó ń gbé nínú wọn. Àwọn ènìyàn yóò kígbe, gbogbo olùgbé ilẹ̀ náà yóò hu
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu; ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke. Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya, ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya. Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa, mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.
3 nígbà tí wọ́n bá gbọ́ ìró títẹ̀lé pátákò ẹsẹ̀ ẹṣin alágbára nígbà tí wọ́n bá gbọ́ ariwo kẹ̀kẹ́ ogun ọ̀tá ńlá àti iye kẹ̀kẹ́ wọn. Àwọn baba kò ní lè ran àwọn ọmọ lọ́wọ́; ọwọ́ wọn yóò kákò.
Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ, mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro, na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha. Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka, nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.
4 Nítorí tí ọjọ́ náà ti pé láti pa àwọn Filistini run, kí a sì mú àwọn tí ó là tí ó lè ran Tire àti Sidoni lọ́wọ́ kúrò. Olúwa ti ṣetán láti pa Filistini run, àwọn tí ó kù ní agbègbè Kafitori.
Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile, mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ, ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka. Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia, o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto.
5 Gasa yóò fá irun orí rẹ̀ nínú ọ̀fọ̀. A ó pa Aṣkeloni lẹ́nu mọ́; ìyókù ní pẹ̀tẹ́lẹ̀, ìwọ yóò ti sá ara rẹ lọ́gbẹ́ pẹ́ tó?
Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ. A ga-eme ka Ashkelọn dere duu. Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ, unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?
6 “Ẹ̀yin kígbe, ‘Yé è, idà Olúwa, yóò ti pẹ́ tó tí ìwọ yóò sinmi? Padà sínú àkọ̀ rẹ; sinmi kí o sì dákẹ́ jẹ́ẹ́.’
“‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị, ole mgbe ị ga-ezu ike? Mịnye onwe gị nʼọbọ gị, kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’
7 Ṣùgbọ́n báwo ni yóò ṣe sinmi, nígbà tí Olúwa ti pàṣẹ fún un, nígbà tí ó ti pa á láṣẹ láti dojúkọ Aṣkeloni àti agbègbè rẹ̀.”
Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike, ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu ibu agha megide Ashkelọn, na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”