< Jeremiah 45 >
1 Èyí ni ọ̀rọ̀ tí Jeremiah wòlíì sọ fún Baruku ọmọ Neriah ní ọdún kẹrin ti Jehoiakimu ọmọ Josiah ọba Juda. Lẹ́yìn tí Baruku ti kọ sínú ìwé kíká àwọn ọ̀rọ̀ tí Jeremiah ti ń sọ:
Okwu ndị Jeremaya onye amụma gwara Baruk nwa Neraya, mgbe o dere okwu ndị a nʼakwụkwọ dịka Jeremaya na-akpọpụta ha, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda. Jeremaya gwara Baruk sị,
2 “Èyí ni ohun tí Olúwa Ọlọ́run Israẹli sọ fún ọ, Baruku.
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel na-agwa gị, gị Baruk,
3 Ìwọ wí pé, ‘Ègbé ni fún mi! Olúwa ti fi ìbànújẹ́ kún ìrora mi, àárẹ̀ mú mi nínú ẹ̀dùn mi, èmi kò sì rí ìsinmi.’”
Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’
4 Olúwa wí pé sọ èyí fún un, “Èyí ni Ọlọ́run sọ: ‘Èyí tí èmi ti kọ́ ni èmi yóò wò lulẹ̀, àti èyí tí èmi ti gbìn ni èmi yóò fàtu, àní ní orí gbogbo ilẹ̀.
Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile.
5 Ṣé ìwọ sì ń wá ohun títóbi fún ara rẹ? Nítorí náà, má ṣe wá wọn. Èmi yóò mú ibi wá sí orí àwọn ènìyàn gbogbo ni Olúwa wí, ṣùgbọ́n níbikíbi tí ìwọ bá lọ ni èmi yóò jẹ́ kí o sá àsálà pẹ̀lú ẹ̀mí rẹ.’”
Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka ị jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ị ga-eje.’”