< Hebrews 13 >
1 Kí ìfẹ́ ará kí o wà títí.
Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide.
2 Ẹ má ṣe gbàgbé láti máa ṣe àlejò; nítorí pé nípa bẹ́ẹ̀ ni àwọn ẹlòmíràn ṣe àwọn angẹli ní àlejò láìmọ̀.
Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.
3 Ẹ máa rántí àwọn òǹdè bí ẹni tí a dè pẹ̀lú wọn, àti àwọn tí a ń pọn lójú bí ẹ̀yin tìkára yín pẹ̀lú tí ń bẹ nínú ara.
Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu.
4 Kí ìgbéyàwó lọ́lá láàrín gbogbo ènìyàn, kí àkéte si jẹ́ aláìléèérí, nítorí àwọn àgbèrè àti àwọn panṣágà ni Ọlọ́run yóò dá lẹ́jọ́.
Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
5 Kí ọkàn yín má ṣe fà sí ìfẹ́ owó, ki ohun tí ẹ ní tó yin; nítorí òun tìkára rẹ̀ ti wí pé, “Èmi kò jẹ́ fi ọ́ sílẹ̀, bẹ́ẹ̀ ni èmi kò jẹ́ kọ̀ ọ́ sílẹ̀.”
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
6 Nítorí náà ni àwa ṣe ń fi ìgboyà wí pé, “Olúwa ni olùrànlọ́wọ́ mi, èmi kì yóò bẹ̀rù; kín ni ènìyàn lè ṣe sí mi?”
Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
7 Ẹ máa rántí àwọn tiwọn jẹ́ aṣáájú yín, tiwọn ti sọ ọ̀rọ̀ Ọlọ́run fún yín; kí ẹ máa ro òpin ìwà ayé wọn, kí ẹ sì máa ṣe àfarawé ìgbàgbọ́ wọn.
Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
8 Jesu Kristi ọ̀kan náà ni lánàá, àti lónìí, àti títí láé. (aiōn )
Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn )
9 Ẹ má ṣe jẹ́ kí a fi onírúurú àti àjèjì ẹ̀kọ́ gbá yin kiri. Nítorí ó dára kí a mú yin lọ́kàn le nípa oore-ọ̀fẹ́, kì í ṣe nípa oúnjẹ nínú èyí tí àwọn tí ó ti rìn nínú wọn kò ní èrè.
Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya.
10 Àwa ní pẹpẹ kan, níbi èyí tí àwọn ti ń sin àgọ́ kò ni agbára láti máa jẹ.
Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya.
11 Nítorí nígbà tí olórí àlùfáà bá mú ẹ̀jẹ̀ àwọn ẹran wá si Ibi Mímọ́ Jùlọ gẹ́gẹ́ bí ìrúbọ ẹ̀ṣẹ̀, òkú àwọn ẹran náà ni a o sun lẹ́yìn ibùdó.
Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu.
12 Nítorí náà Jesu pẹ̀lú, kí ó lè fi ẹ̀jẹ̀ ara rẹ̀ sọ àwọn ènìyàn di mímọ́, ó jìyà lẹ́yìn ibodè.
Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ.
13 Nítorí náà ẹ jẹ́ kí a jáde tọ̀ ọ́ lọ lẹ́yìn ibùdó, kí a máa ru ẹ̀gàn rẹ̀.
Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri.
14 Nítorí pé àwa kò ní ìlú tí o wa títí níhìn-ín, ṣùgbọ́n àwa ń wá èyí tí ń bọ.
Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa.
15 Ǹjẹ́ nípasẹ̀ rẹ̀, ẹ jẹ́ kí a máa rú ẹbọ ìyìn si Ọlọ́run nígbà gbogbo, èyí yìí ni èso ètè wa, tí ń jẹ́wọ́ orúkọ rẹ̀.
Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
16 Ṣùgbọ́n ẹ má ṣe gbàgbé láti máa ṣoore àti láti máa pín fun ni nítorí irú ẹbọ wọ̀nyí ni inú Ọlọ́run dùn sí jọjọ.
Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
17 Ẹ máa gbọ́ ti àwọn tí ń ṣe olórí yín, kí ẹ sì máa tẹríba fún wọ́n, nítorí wọn ń ṣọ́ ẹ̀ṣọ́ nítorí ọkàn yín, bí àwọn ti yóò ṣe ìṣirò, kí wọn lè fi ayọ̀ ṣe èyí, kì í ṣe pẹ̀lú ìbànújẹ́, nítorí èyí yìí yóò jẹ àìlérè fún yín.
Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru.
18 Ẹ máa gbàdúrà fún wa, nítorí àwa gbàgbọ́ pé àwa ni ẹ̀rí ọkàn rere, a sì ń fẹ́ láti máa hùwà títọ́ nínú ohun gbogbo.
Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile.
19 Ṣùgbọ́n èmi ń bẹ̀ yín gidigidi sí i láti máa ṣe èyí, kí a ba lè tètè fi mi fún yín padà.
Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ.
20 Ǹjẹ́ Ọlọ́run àlàáfíà, ẹni tí o tún mu olùṣọ́-àgùntàn ńlá ti àwọn àgùntàn, ti inú òkú wá, nípa ẹ̀jẹ̀ májẹ̀mú ayérayé, àní Olúwa wa Jesu. (aiōnios )
Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, (aiōnios )
21 Kí ó mú yín pé nínú iṣẹ́ rere gbogbo láti ṣe ìfẹ́ rẹ̀, kí ó máa ṣiṣẹ́ ohun tí i ṣe ìtẹ́wọ́gbà níwájú rẹ̀ nínú yín nípasẹ̀ Jesu Kristi; ẹni tí ògo wà fún láé àti láéláé. Àmín. (aiōn )
mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn )
22 Èmi sì ń bẹ̀ yín ará, ẹ gbà ọ̀rọ̀ ìyànjú mi; nítorí ìwé kúkúrú ni mo kọ sí yín.
Ụmụnna m, arịọọ m unu, ka unu were ntachiobi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nʼime akwụkwọ a na-etoghị ogologo.
23 Ẹ mọ pé a sá titu Timotiu arákùnrin wa sílẹ̀; bí ó ba tètè dé, èmí pẹ̀lú rẹ̀ yóò rí yín, àti gbogbo àwọn ènìyàn mímọ́.
Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya.
24 Ẹ ki gbogbo àwọn tí ń ṣe olórí yín, àti gbogbo àwọn ènìyàn mímọ́. Àwọn tí o ti Itali wá ki yín.
Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile. Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha.
25 Kí oore-ọ̀fẹ́ wà pẹ̀lú gbogbo yín.
Ka amara dịnyere unu niile.