< Ezekiel 7 >

1 Ọ̀rọ̀ Olúwa tọ̀ mí wá:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 “Ọmọ ènìyàn, báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí sí ilé Israẹli: “‘Òpin! Òpin ti dé sí igun mẹ́rẹ̀ẹ̀rin ilẹ̀ náà!
“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel: “‘Ọgwụgwụ! Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ.
3 Òpin tí dé sí ọ báyìí, èmi yóò sì tú ìbínú mi jáde sí ọ, èmi yóò dájọ́ rẹ gẹ́gẹ́ bí ìwà rẹ, èmi yóò sì san án fún ọ gẹ́gẹ́ bí gbogbo ìwà ìríra rẹ.
Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu. Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu; aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị, aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile.
4 Ojú mi kò ní i dá ọ sì, bẹ́ẹ̀ ni èmi kì yóò ṣàánú; ṣùgbọ́n èmi yóò san án fún ọ gẹ́gẹ́ bí ọ̀nà rẹ àti gbogbo ìwà ìríra tó wà láàrín rẹ. Nígbà náà ní ẹ̀yin yóò mọ̀ pé èmi ni Olúwa.’
Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ, agaghị m emekwara gị ebere, kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu na arụ niile dị nʼetiti unu. “‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
5 “Èyí ni Olúwa Olódùmarè wí: “‘Ibi! Ibi kan ṣoṣo. Kíyèsi, ó bọ̀ ní orí rẹ!
“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa.
6 Òpin ti dé! Òpin ti dé! Ó ti dìde lòdì sí ọ. Kíyèsi, ó ti dé!
Ọgwụgwụ abịala! Ọgwụgwụ abịala! Ọ kpalitela onwe ya imegide unu. Lee, ka ọ na-abịa!
7 Ìparun ti dé sórí rẹ, ìwọ tó ń gbé ní ilẹ̀ náà. Àkókò náà dé! Ọjọ́ wàhálà ti súnmọ́ etílé! Kì í ṣe ọjọ́ ariwo ayọ̀ lórí òkè.
Oke nsogbu abịakwasịla gị, gị onwe gị bi nʼala ahụ. Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso! Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile.
8 Mo ṣetán láti tú ìbínú gbígbóná mi lé ọ lórí àti láti lo ìbínú mi lórí rẹ gẹ́gẹ́ bí gbogbo ọ̀nà rẹ, èmi yóò sì dá ọ lẹ́jọ́ gẹ́gẹ́ bí ọ̀nà rẹ àti gẹ́gẹ́ bí ìwà ìríra rẹ ni èmi yóò sì san án fún ọ.
Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile. Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile.
9 Ojú mi kò ní i dá ọ sí, Èmi kò sì ní wò ọ́ pẹ̀lú àánú; èmi yóò san án fún ọ gẹ́gẹ́ bí ọ̀nà rẹ àti fún gbogbo ìwà ìríra tí wà láàrín rẹ. “‘Nígbà náà ní ẹ o mọ̀ pé Èmi Olúwa lo kọlù yín.
Agaghị m emere gị ebere, agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ. Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu. “‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a.
10 “‘Ọjọ́ náà dé! Kíyèsi ó ti dé! Ìparun ti bú jáde, ọ̀pá ti tanná, ìgbéraga ti rúdí!
“‘Lee, ụbọchị ahụ! Lee, ka ọ na-abịa! Oke nsogbu enupụtala, mkpanaka agbala okoko nganga amaala ifuru!
11 Ìwà ipá ti di ọ̀pá ìwà búburú; ọ̀pá láti jẹ ẹni búburú ní ìyà. Kò sí nínú wọn tí yóò ṣẹ́kù, tàbí nínú ọ̀pọ̀lọpọ̀ wọn, kò sí nínú ọrọ̀ wọn, kò sí ohun tí ó ní iye.
Ihe ike ebilitala, mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ. O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ, maọbụ igwe mmadụ maọbụ ụba ha, o nweghịkwa nke bara uru.
12 Àkókò náà dé! Ọjọ́ náà ti dé! Kí òǹrajà má ṣe yọ̀, bẹ́ẹ̀ ni ki òǹtajà má ṣe ṣọ̀fọ̀; nítorí, ìbínú gbígbóná wà lórí gbogbo ènìyàn.
Mgbe ahụ abịala! Ụbọchị ahụ abịakwala nso. Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ, nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile.
13 Nítorí pé òǹtajà kì yóò rí gbà padà dúkìá èyí tó tà níwọ̀n ìgbà ti àwọn méjèèjì bá wà láààyè. Nítorí ìran tó kan gbogbo ènìyàn yìí kò ní yí padà. Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ wọn, kò sí ọ̀kan nínú wọn tí yóò gba ara rẹ̀ là.
Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi ngwa ahịa nke erere ere ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ. Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile bụ nke a na-apụghị ịgbanwe. Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha nke pụrụ ichebe ndụ ya.
14 “‘Wọ́n ti fọn ìpè ogun, tí wọ́n sì pèsè ohun gbogbo sílẹ̀, ṣùgbọ́n kò sí ẹni tí yóò lọ ojú ogun, nítorí ìbínú gbígbóná mi ti wà lórí gbogbo ènìyàn.
“‘Ha afụọla opi ike, ha edoziela ihe niile ma o nweghị onye ga-aga ibu agha nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile.
15 Idà wà ní ìta, àjàkálẹ̀-ààrùn àti ìyàn wà nílé, idà yóò pa ẹni tó bá wà ní orílẹ̀-èdè, àjàkálẹ̀-ààrùn àti ìyàn yóò pa ẹni tó bá wà ní ìlú.
Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.
16 Gbogbo àwọn tí ó bọ́ nínú wọn yóò sálà, wọn yóò sì wà lórí òkè. Bí i àdàbà inú àfonífojì, gbogbo wọn yóò máa ṣọ̀fọ̀, olúkúlùkù nítorí àìṣedéédéé rẹ̀.
Ma ndị gbapụrụ agbapụ ga-agbaga nọrọ nʼugwu. Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu, ha niile ga-asụ ude akwa, onye ọbụla nʼihi mmehie ha.
17 Gbogbo ọwọ́ yóò rọ, gbogbo orúnkún yóò di aláìlágbára bí omi.
Aka niile ga-akụda, ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee.
18 Wọn yóò wọ aṣọ ọ̀fọ̀, ẹ̀rù yóò sì bò wọ́n mọ́lẹ̀, ìtìjú yóò mù wọn, wọn yóò sì fá irun wọn.
Ha ga-eyikwasị akwa mkpe, oke ihe egwu ga-ekpuchi ha. Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi, a ga-akpụchakwa isi niile.
19 “‘Wọn yóò dà fàdákà wọn sí ojú pópó, wúrà wọn yóò sì dàbí èérí fàdákà àti wúrà wọn kò ní le gbà wọ́n ní ọjọ́ ìbínú gbígbóná Olúwa. Wọn kò ní le jẹun tẹ́ ra wọn lọ́rùn tàbí kí wọn kún ikùn wọn pẹ̀lú oúnjẹ nítorí pé ó ti di ohun ìkọ̀sẹ̀ fún wọn.
“‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.
20 Wọ́n ń ṣe ìgbéraga pẹ̀lú ohun ọ̀ṣọ́ wọn tí ó lẹ́wà, wọn sì ti fi ṣe òrìṣà, wọn sì tún ya àwòrán ìríra wọn níbẹ̀. Nítorí náà, èmi yóò sọ àwọn nǹkan wọ̀nyí di aláìmọ́ fún wọn.
Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.
21 Èmi yóò sì fi àwọn nǹkan wọ̀nyí ṣe ìjẹ fún àjèjì àti ìkógun fún àwọn ènìyàn búburú ayé, wọn yóò sì sọ ọ́ di aláìmọ́.
Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha, nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata ndị ga-emerụ ya.
22 Èmi yóò gbójú mi kúrò lára wọn, àwọn ọlọ́ṣà yóò sì sọ ibi ìṣúra mi di aláìmọ́; àwọn ọlọ́ṣà yóò wọ inú rẹ̀, wọn yóò sì bà á jẹ́.
Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-abata nʼime ya merụọkwa ya.
23 “‘Rọ ẹ̀wọ̀n irin! Nítorí pé ilẹ̀ náà kún fún ẹ̀ṣẹ̀ ìtàjẹ̀ sílẹ̀, ìlú náà sí kún fún ìwà ipá.
“‘Kwadoonụ ụdọ igwe. Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara, obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.
24 Èmi yóò mú kí orílẹ̀-èdè ti ó búburú jùlọ láti jogún ilé wọn. Èmi yóò sì fi òpin sí ìgbéraga àwọn alágbára, ibi mímọ́ wọn yóò sì di bíbàjẹ́.
Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile. Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị, meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
25 Nígbà tí ìpayà bá dé, wọn yóò wá àlàáfíà, lórí asán.
Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara, ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.
26 Wàhálà lórí wàhálà yóò dé, ìdágìrì lórí ìdágìrì. Nígbà náà ni wọn yóò wá ìran lọ́dọ̀ wòlíì, ṣùgbọ́n ẹ̀kọ́ òfin yóò parun lọ́dọ̀ àlùfáà, bẹ́ẹ̀ ni ìmọ̀ràn yóò ṣègbé lọ́dọ̀ àwọn àgbàgbà.
Mbibi ga-esochi mbibi, akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi. Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma, ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị, ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa.
27 Ọba yóò ṣọ̀fọ̀, ọmọ-aládé yóò wà láìní ìrètí, ọwọ́ àwọn ènìyàn ilẹ̀ náà yóò wárìrì. Èmi yóò ṣe é fún wọn gẹ́gẹ́ bí ìṣe wọn, èmi yóò ṣe ìdájọ́ wọn gẹ́gẹ́ bí ìgbékalẹ̀ wọn. Nígbà náà ni wọn yóò mọ̀ pé èmi ní Olúwa.’”
Eze ga-eru ụjụ, nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe, aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu. Aga m emeso ha dịka omume ha si dị, aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị. “‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”

< Ezekiel 7 >