< Ezekiel 30 >
1 Ọ̀rọ̀ Olúwa tún tọ̀ mí wá: wí pé:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 “Ọmọ ènìyàn, sọtẹ́lẹ̀ kí o sì wí pé: ‘Báyìí ní Olúwa Olódùmarè wí: “‘Hu, kí o sì wí pé, “Ó ṣe fún ọjọ́ náà!”
“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “‘Kwasienụ akwa ike ma sị, “Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”
3 Nítorí ọjọ́ náà súnmọ́ tòsí àní ọjọ́ Olúwa súnmọ́ tòsí, ọjọ́ tí ọjọ́ ìkùùkuu ṣú dúdú, àsìkò ìparun fún àwọn kèfèrí.
Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso, Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso, ụbọchị igwe ojii, ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.
4 Idà yóò wá sórí Ejibiti ìrora ńlá yóò sì wá sórí Kuṣi. Nígbà tí àwọn tí a pa yóò ṣubú ní Ejibiti wọn yóò kò ọrọ̀ rẹ̀ lọ ìpìlẹ̀ rẹ̀ yóò sì wó lulẹ̀.
Mma agha ga-abịakwasị Ijipt, ihe mgbu ga-adakwasị Kush. Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala, a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya, mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.
5 Kuṣi àti Puti, Libia, Ludi àti gbogbo Arabia, Kubu àti àwọn ènìyàn ilẹ̀ náà tí ó mulẹ̀ yóò ṣubú nípa idà pẹ̀lú Ejibiti.
Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.
6 “‘Èyí yìí ní Olúwa wí: “‘Àwọn àlejò Ejibiti yóò ṣubú agbára ìgbéraga rẹ yóò kùnà láti Migdoli títí dé Siene, wọn yóò ti ipa idà ṣubú nínú rẹ; ní Olúwa Olódùmarè wí.
“‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada, nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa. Site na Migdol ruo nʼAswan, ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
7 Wọn yóò sì wà lára àwọn ilẹ̀ tí ó di ahoro, ìlú rẹ yóò sì wà ní ara àwọn ìlú tí ó di ahoro.
Ha ga-atọgbọrọ nʼefu, nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu. Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe, nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.
8 Lẹ́yìn náà wọn yóò mọ̀ pé èmi ní Olúwa, nígbà tí mo bá gbé iná kalẹ̀ ní Ejibiti tí gbogbo àwọn olùrànlọ́wọ́ rẹ̀ bá parun.
Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.
9 “‘Ní ọjọ́ náà oníṣẹ́ yóò ti ọ̀dọ̀ mi jáde nínú ọkọ̀ ojú omi láti dẹ́rùbà Kuṣi tí ó wà nínú àlàáfíà. Ìrora yóò wá sórí wọn gẹ́gẹ́ bí ti ọjọ́ ìparun Ejibiti. Kíyèsi i, ó dé.
“‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.
10 “‘Báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí: “‘Èmi yóò mú òpin bá ọ̀gọ̀ọ̀rọ̀ àwọn ènìyàn Ejibiti láti ọwọ́ Nebukadnessari ọba Babeli.
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn bibie igwe ndị agha Ijipt niile.
11 Òun àti àwọn ológun rẹ̀ ẹ̀rù àwọn orílẹ̀-èdè ní a o mú wá láti pa ilẹ̀ náà run. Wọn yóò fa idà wọn yọ sí Ejibiti ilẹ̀ náà yóò sì kún fún àwọn tí a pa.
Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere, ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt, werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.
12 Èmi yóò mú kí àwọn odò Naili gbẹ, Èmi yóò sì ta ilẹ̀ náà fún àwọn ènìyàn búburú: láti ọwọ́ àwọn àjèjì ènìyàn, Èmi yóò jẹ́ kí ilẹ̀ náà àti gbogbo ohun tí ó wá nínú rẹ ṣòfò. Èmi Olúwa ni ó ti sọ ọ́.
Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ. Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ. Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
13 “‘Báyìí ní Olúwa Olódùmarè wí: “‘Èmi yóò pa àwọn òrìṣà run, Èmi yóò sì mú kí òpin dé bá ère gbígbẹ́ ni Memfisi. Kò ní sí ọmọ-aládé mọ́ ní Ejibiti, Èmi yóò mú kí ìbẹ̀rù gba gbogbo ilẹ̀ náà.
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi, mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị. Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt, aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.
14 Èmi yóò sì mú kí Paturosi di ahoro, èmi yóò fi iná sí Ṣoani, èmi yóò sì fi ìyà jẹ Tebesi.
Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu. Aga m etinye ọkụ na Zoan, ma taa Tibs ahụhụ.
15 Èmi yóò tú ìbínú mi jáde sórí Pelusiumu ìlú odi Ejibiti èmi yóò sì ké àkójọpọ̀ Tebesi kúrò.
M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.
16 Èmi yóò ti iná bọ Ejibiti Pelusiumu yóò japoró ní ìrora. Ìjì líle yóò jà ní Tebesi Memfisi yóò wà ìpọ́njú ní ìgbà gbogbo.
Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.
17 Àwọn ọ̀dọ́mọkùnrin ní Heliopolisi àti Bubasiti yóò ti ipa idà ṣubú wọn yóò sì kó àwọn ìlú wọn ní ìgbèkùn.
Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.
18 Ojú ọjọ́ yóò ṣókùnkùn ní Tafanesi nígbà tí mo bá já àjàgà Ejibiti kúrò; níbẹ̀ agbára iyì rẹ̀ yóò dópin wọn yóò fi ìkùùkuu bò ó àwọn abúlé rẹ ní wọn yóò lọ sí ìgbèkùn.
Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt, nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị. Igwe ojii ga-ekpuchi ya, a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha.
19 Nítorí náà, Èmi yóò mú ki ìjìyà wá sórí Ejibiti, wọn yóò sì mọ̀ pé, Èmi ni Olúwa.’”
Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu, ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
20 Ní ọjọ́ keje oṣù kìn-ín-ní ọdún kọkànlá ọ̀rọ̀ Olúwa tọ̀ mí wá,
O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
21 “Ọmọ ènìyàn, Èmi ti ṣẹ́ apá Farao ọba Ejibiti. A kò ì tí ì di apá náà papọ̀ láti mu kí ó san, a kò sì ti di i si àárín igi pẹlẹbẹ kí o lè ni agbára tó láti di idà mú.
“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.
22 Nítorí náà, báyìí ní Olúwa Olódùmarè wí: Èmi lòdì sí Farao ọba Ejibiti. Èmi yóò sẹ́ apá rẹ̀ méjèèjì, èyí tí ó dára àti èyí tí a ti ṣẹ́ pẹ̀lú, yóò sì mú kí idà bọ́ sọnù ní ọwọ́ rẹ̀.
Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.
23 Èmi yóò sì fọ́n àwọn ènìyàn Ejibiti ká sí àárín àwọn orílẹ̀-èdè, èmi yóò sì tú wọn ká gbogbo ilẹ̀.
Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,
24 Èmi yóò mú kí apá ọba Babeli ní agbára, èmi yóò sì fi idà mi sí ọwọ́ rẹ, ṣùgbọ́n èmi yóò ṣẹ́ apá Farao, yóò sì kérora níwájú rẹ̀ bí ọkùnrin tí a sá ní àṣápa.
meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ.
25 Èmi yóò mú kí apá ọba Babeli lé, ṣùgbọ́n apá Farao yóò sì rọ. Nígbà náà wọn yóò mọ̀ pé, Èmi ni Olúwa, nígbà tí mo bá mú idà mi sí ọwọ́ ọba Babeli yóò sì fi idà náà kọlu Ejibiti.
Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt.
26 Èmi yóò fọ́n àwọn ara Ejibiti ká sí àárín orílẹ̀-èdè, èmi yóò sì tú wọn ká sí àárín orílẹ̀-èdè, èmi yóò sì tú wọn ká sí gbogbo ilẹ̀. Nígbà náà wọn yóò mọ̀ pé èmi ni Olúwa.”
Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”