< Ezekiel 16 >
1 Ọ̀rọ̀ Olúwa tọ̀ mí wá wí pé:
Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
2 “Ọmọ ènìyàn, mú kí Jerusalẹmu mọ gbogbo ìwà ìríra rẹ̀.
“Nwa nke mmadụ, gwa Jerusalem okwu mee ka ọ mara banyere ndụ ya niile rụrụ arụ
3 Sọ pé, ‘Báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí sí Jerusalẹmu, ìran rẹ àti ilẹ̀ ìbí rẹ wà ní ilẹ̀ Kenaani; ará Amori ni baba rẹ̀, ìyá rẹ̀ sì jẹ́ ará Hiti.
sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Jerusalem: Ịpụta ụwa gị na ọmụmụ gị bụ nʼala ndị Kenan; nna gị bụ onye Amọrị, nne gị bụ onye Het.
4 Ní ọjọ́ tí a bí ọ, a kò gé okùn ìwọ́ rẹ, bẹ́ẹ̀ ni a kò sì fi omi wẹ̀ ọ́ láti mú kí o mọ́, a kò fi iyọ̀ pa ọ́ lára rárá, bẹ́ẹ̀ ni a kò fi aṣọ wé ọ.
Nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị, ebeghị otubo gị, ọ dịghị onye lekọtara gị maọbụ jiri mmiri saa gị ahụ ị sachapụ gị unyi maọbụ tee gị nnu, maọbụ jiri akwa kechie gị.
5 Kò sí ẹni tó ṣàánú tàbí kẹ́dùn rẹ dé bi à ti ṣe nǹkan kan nínú ìwọ̀nyí fún ọ, ṣùgbọ́n lọ́jọ́ ìbí rẹ, ìta la jù ọ́ sí torí wọ́n kórìíra rẹ.
Ọ dịghị onye nwere obi ebere nʼebe ị nọ. Ọ dịghị onye ihe banyere gị metụrụ nʼobi, ọ dịkwaghị onye lekọtara gị. Kama nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị a tufuru gị nʼọhịa, nʼihi na-eledara gị anya.
6 “‘Nígbà tí mo sì kọjá tí mo rí ọ tó ń jàgùdù nínú ẹ̀jẹ̀ rẹ, mo sọ fún ọ pé, “Yè!” Nítòótọ́, nígbà tí ìwọ wà nínú ẹ̀jẹ̀ rẹ pé, “Yè.”
“‘Ma mgbe m si nʼebe ahụ ị tọgbọ na-agafe, ahụrụ m gị ka i chịlịri ụkwụ gị, ọbara jukwara gị ahụ, dịka ị dina nʼime ọbara gị. Nʼoge ahụ, ihe pụrụ m nʼọnụ bụ, “Dị ndụ.”
7 Mo mú ọ dàgbà bí ohun ọ̀gbìn inú oko. O ga sókè, o sì dàgbà, o wá di arẹwà jùlọ, ọmú rẹ yọ, irun rẹ gùn, ìwọ tí o wà ní ìhòhò láìfi nǹkan kan bora.
Emere m ka ị too dịka osisi na-eto eto nʼime ọhịa. I tolitere, too ogologo ma tozuo oke na nwanyị, ị kpụrụ ara, agịrị isi gị pukwara, ma gị onwe gị gba ọtọ.
8 “‘Nígbà tí mo tún kọjá, tí mo rí ọ, mo rí i pé àsìkò àti nífẹ̀ẹ́ rẹ ti tó, mo fi ìṣẹ́tí aṣọ mi bo ìhòhò rẹ. Mo búra fún ọ, èmi sì bá ọ dá májẹ̀mú ìwọ sì di tèmi, ni Olúwa Olódùmarè wí.
“‘Emesịa, a gafere m nʼakụkụ gị, mgbe m lere gị anya ahụrụ m na i tozuola onye mmadụ ga-ahụ nʼanya. A gbasapụrụ m akụkụ akwa m nʼahụ gị, jiri ya kpuchie ọtọ gị. Aṅụrụ m gị iyi, mụ na gị gbara ndụ, ị ghọkwara nke m. Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
9 “‘Nígbà náà ni mo fi omi wẹ ẹ̀jẹ̀ kúrò ní ara rẹ, mo fi ìpara pa ọ́ lára.
“‘Eji m mmiri saa gị ahụ, sachapụ ọbara dị gị nʼahụ, teekwa gị mmanụ.
10 Mo fi aṣọ oníṣẹ́-ọnà sí ọ lára láti wọ̀ ọ́, mo wọ bàtà aláwọ fún ọ. Mo fi aṣọ funfun gbòò àti aṣọ olówó iyebíye ṣe ọ́ lọ́ṣọ̀ọ́.
Enyere m gị akwa ọcha na uwe a kpara nke ọma, nke i ji kpuchie ahụ gị. Nyekwa gị akpụkpọụkwụ e ji ezi akpụkpọ kwaa, jirikwa ezi akwa ọcha na uwe ndị dị oke ọnụ kpuchie gị.
11 Mo fi ohun ọ̀ṣọ́ ṣe ọ́ lọ́ṣọ̀ọ́, mo fi ẹ̀gbà ọwọ́ sí ọ ní ọwọ́, mo fi ìlẹ̀kẹ̀ ọrùn sí ọ ní ọrùn,
Eyinyere m gị ihe ịchọ mma, tinye ọlaaka nʼaka gị, nakwa ọlaolu nʼolu gị.
12 mo sì tún fi òrùka sí ọ ní imú, mo fi yẹtí sí ọ ní etí, mo sì fi adé tó rẹwà dé ọ ní orí.
Etinyekwara m gị ọla nʼimi, tinye gị ọlantị abụọ na ntị gị, na okpueze mara mma nʼisi gị.
13 Báyìí ni mo ṣe ọ́ lọ́ṣọ̀ọ́ pẹ̀lú wúrà àti fàdákà; tí aṣọ rẹ jẹ́ funfun gbòò, aṣọ olówó iyebíye àti aṣọ tí a ṣiṣẹ́ ọnà sí. Ìyẹ̀fun kíkúnná, oyin àti òróró ni oúnjẹ rẹ. Ó di arẹwà títí ó fi dé ipò ayaba.
E ji ihe ịchọ mma ọlaọcha na ọlaedo chọọ gị mma. Uwe gị bụkwa uwe ezi akwa ọcha, uwe dị oke ọnụ, na uwe a kpara nke ọma. Nri ị na-eri bụ ụtụ ọka a yọchaziri nke ọma, na mmanụ aṅụ, na mmanụ oliv. Mma gị pụtaziri ihe nke ọma, ị ruo ogo ịbụ eze nwanyị.
14 Òkìkí rẹ sì kàn káàkiri orílẹ̀-èdè nítorí ẹwà rẹ, nítorí dídán tí mo fi ṣe ẹwà rẹ ní àṣepé, ni Olúwa Olódùmarè wí.
Aha gị dara ụda nke ukwuu nʼetiti mba dị iche iche nʼihi mma gị, nke zuruoke site nʼebube ahụ bụ nke m tụkwasịrị gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
15 “‘Ṣùgbọ́n, ìwọ gbẹ́kẹ̀lé ẹwà rẹ, ìwọ sì di alágbèrè nítorí òkìkí rẹ. Ìwọ sì fọ́n ojúrere rẹ káàkiri sí orí ẹni yówù tó ń kọjá lọ, ẹwà rẹ sì di tìrẹ.
“‘Ma ị tụkwasịrị mma gị obi, jiri nʼihi na a mara aha gị ghọọ onye akwụna. I wekwaara onwe gị nye nwoke ọbụla gabigara mee ka mma gị bụrụ nke ya.
16 Ìwọ mú lára àwọn aṣọ rẹ, láti rán aṣọ aláràbarà fún ibi gíga òrìṣà tí ìwọ ti ń ṣe àgbèrè. Èyí kò yẹ kí ó rí bẹ́ẹ̀, tàbí kó tilẹ̀ ṣẹlẹ̀ rárá.
Ị were uwe gị ụfọdụ, meere onwe gị ebe dị iche iche dị elu nke tụrụ agwa, ebe doziri ihe ndina ịkwa iko gị. Ihe dị otu a emetụbeghị mbụ, ha ekwesịkwaghị ime mgbe ọbụla.
17 Ìwọ tún mú àwọn ohun ọ̀ṣọ́ dáradára tí mo fi wúrà àti fàdákà ṣe fún ọ láti fi yá ère ọkùnrin tí ó ń bá ọ ṣe àgbèrè papọ̀.
Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko.
18 Ìwọ sì wọ aṣọ iṣẹ́ ọnà abẹ́rẹ́ rẹ fún wọn, o sì tún gbé òróró àti tùràrí mi sílẹ̀ níwájú wọn.
Uwe ọma ahụ a kpara akpa ka i ji kpuchie ha. Mmanụ m na ụda m na-esi isi ụtọ ka ị chere nʼihu ha dịka onyinye.
19 Ìwọ tún gbé oúnjẹ tí mo fún ọ—ìyẹ̀fun dáradára, òróró àti oyin—fún wọn gẹ́gẹ́ bí ẹbọ sísun olóòórùn dídùn; ohun tó ṣẹlẹ̀ nìyìí, ni Olúwa Olódùmarè wí.
Ọzọkwa, ụtụ ọka ọma, mmanụ oliv na mmanụ aṅụ, nri ndị m nyere gị ka i rie, ka i ji chụọ aja na-esi isi ụtọ nʼihu ha. Otu a ka o si dị, ka Onyenwe anyị Onyenwe anyị kwupụtara.
20 “‘Àwọn ọmọkùnrin àti àwọn ọmọbìnrin tí o bí fún mi lo ti fi rú ẹbọ bí oúnjẹ fún àwọn òrìṣà. Ṣé ìwà àgbèrè rẹ kò ha tó bí?
“‘Ụmụ niile ị mụtaara m, nwoke na nwanyị, ka i ji chụọrọ arụsị gị aja ka ha rie. Ọ bụ na ịgba akwụna gị ezughịrị gị?
21 Tí ìwọ ti pa àwọn ọmọ mí, ìwọ sì fà wọ́n fún ère gẹ́gẹ́ bí ẹbọ sísun.
Ma i gburu ụmụ m, jiri ha chụọ aja nye arụsị!
22 Nínú gbogbo iṣẹ́ ìríra àti ìwà àgbèrè rẹ, ìwọ kò rántí ìgbà èwe rẹ, nígbà tí ìwọ wà ní ìhòhò, tó ń jàgùdù nínú ẹ̀jẹ̀.’
Nʼoge ndị a niile ị na-akwa iko, na-eme ihe arụ ndị a niile, o metụbeghị gị nʼobi ka i cheta ụbọchị niile ndị ahụ ị bụ nwantakịrị, mgbe ị nọ na-agba ọtọ, mgbe ọbara jupụtara gị nʼahụ.
23 “Báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí, ‘Ègbé! Ègbé ni fún ọ. Lẹ́yìn gbogbo ìwà búburú rẹ,
“‘Ahụhụ, ahụhụ, ga-adịrị gị, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Tinyekwara ajọ omume gị niile,
24 ìwọ kọ́lé amọ̀ fún ara rẹ, ìwọ sì kọ́ ojúbọ gíga sí gbogbo òpin ojú pópó.
i wuuru arụsị gị ụlọ ebe ịkwa iko, wuokwa ụlọ arụsị ndị ọzọ nʼakụkụ okporoụzọ niile.
25 Ní gbogbo ìkóríta ni ìwọ lọ kọ ojúbọ gíga sí, tí ìwọ sọ ẹwà rẹ di ìkórìíra, ìwọ sọ àgbèrè rẹ di púpọ̀ nípa fífi ara rẹ sílẹ̀ fún gbogbo ẹni tó ń kọjá lọ.
I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ, mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye.
26 Ìwọ ti ṣe àgbèrè pẹ̀lú ará Ejibiti tí í ṣe aládùúgbò rẹ láti mú mi bínú ìwọ sì ti sọ àgbèrè rẹ di púpọ̀.
Ị kwasoro ndị Ijipt bụ ndị agbataobi gị iko, ndị anụahụ ha dị ukwuu. I si otu a mee ka iwe dị ukwuu wee m megide ịkwa iko gị nke na-aba ụba.
27 Nítorí náà ni mo fi na ọwọ́ mi lé ọ lórí, mo sì ti bu oúnjẹ rẹ̀ kù; èmi yóò sì mú ìfẹ́ àwọn to kórìíra rẹ ṣẹ́ lé ọ lórí, àwọn ọmọbìnrin Filistini ti ìwàkiwà rẹ tì lójú.
Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi.
28 Nítorí àìnítẹ́lọ́rùn rẹ, ìwọ ti ṣe àgbèrè pẹ̀lú ara Asiria; ìwọ ti bá wọn ṣe àgbèrè, síbẹ̀síbẹ̀, kò sì lè tẹ́ ọ lọ́rùn.
Gị na ndị Asịrịa akwaala iko, nʼihi na afọ adịghị eju gị. Ọ bụladị mgbe nke a gasịrị, ị bụkwa onwe na-enweghị afọ ojuju.
29 Ìwọ si ti sọ àgbèrè rẹ di púpọ̀ láti ilẹ̀ Kenaani dé ilẹ̀ Kaldea; síbẹ̀ èyí kò sì tẹ́ ọ lọ́rùn níhìn-ín yìí.’
I mere ka ịkwa iko gị mụbaa ruo ala ndị Kaldịa, mba ahụ ịzụ ahịa doro anya. Ma ọbụladị na nke a afọ ejughịkwa gị.
30 “Olúwa Olódùmarè wí pé, ‘Báwo ni ọkàn rẹ ṣe jẹ aláìlera tó tí o ń ṣe gbogbo nǹkan wọ̀nyí, bí iṣẹ́ àwọn agídí alágbèrè!
“‘Iwe m dị ọkụ megide gị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Mgbe ị na-eme ihe ndị a, ị na-eme ha nnọọ dị ka onye akwụna nke ihere adịghị eme.
31 Ni ti pé ìwọ kọ́ ilé gíga rẹ ni gbogbo ìkóríta, tí ìwọ sì ṣe gbogbo ibi gíga rẹ ni gbogbo ìta, ìwọ kò sì wa dàbí panṣágà obìnrin, ní ti pé ìwọ gan ọ̀yà.
Mgbe ị rụrụ ụlọ arụsị nʼisi ụzọ niile, wuokwa ụlọ ịkwa iko gị na mbara ụzọ niile, i meghị ya dịka akwụna, nʼihi na ị jụrụ ịnara ndị gị na ha kwara iko ego ọbụla.
32 “‘Ìwọ alágbèrè aya! Ìwọ fẹ́ràn ọkùnrin àjèjì ju ọkọ rẹ lọ!
“‘Nʼezie, ị bụ nwanyị na-akwa iko ma ị nọ na di, onye na-anabata ndị ikom ọzọ karịa di ya!
33 Àwọn ọkùnrin máa ń sanwó fún àwọn panṣágà ni ṣùgbọ́n ìwọ lo tún ń sanwó fun wọn, tí ó tún ń fún àwọn olólùfẹ́ rẹ lẹ́bùn àti owó ẹ̀yìn kí wọn bá à le máa wá ọ wá láti gbogbo agbègbè fún àgbèrè ṣíṣe.
Ndị akwụna niile na-anata onyinye, ma gị onwe gị na-enye ndị ikom niile hụrụ gị nʼanya onyinye, inye ha ngarị ka ha bịakwute gị site nʼebe niile bịakwute gị nʼihi ịgba akwụna gị.
34 Nínú àgbèrè rẹ ìwọ yàtọ̀ sí àwọn alágbèrè obìnrin yòókù; nínú àgbèrè rẹ tí ẹnìkan kò tẹ̀lé ọ láti ṣe àgbèrè; àti ní ti pé ìwọ ń tọrẹ tí a kò sì tọrẹ fún ọ, nítorí náà ìwọ yàtọ̀.
Nʼihi ya, ị dị iche nʼetiti ndị inyom ndị ọzọ nʼụdị ịgba akwụna gị, o nweghị onye na-agbaso gị na-arịọ gị maka ịkwaso gị iko. Ị kwụrụ ụgwọ ma o nweghị ụgwọ a kwụrụ gị, nʼụzọ dị otu a ị dị iche.
35 “‘Nítorí náà, ìwọ alágbèrè, gbọ́ ọ̀rọ̀ Olúwa!
“‘Nʼihi nke a, gị nwanyị akwụna, nụrụ okwu Onyenwe anyị!
36 Báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí, “Nítorí pé ìwọ tú ìfẹ́kúfẹ̀ẹ́ rẹ jáde, ìwọ sì fi ìhòhò rẹ hàn, nípa ṣíṣe àgbèrè pẹ̀lú àwọn olólùfẹ́ rẹ, àti nítorí gbogbo òrìṣà ìríra tí o fi ẹ̀jẹ̀ àwọn ọmọ rẹ ṣe ìrúbọ fún,
Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị,
37 nítorí náà, Èmi yóò ṣa gbogbo àwọn olólùfẹ́ rẹ jọ, àwọn ẹni ti ìwọ ti bá jayé àti gbogbo àwọn tí ìwọ ti fẹ́ àti àwọn tí ìwọ kórìíra. Èmi yóò sa gbogbo wọn káàkiri jọ, láti mú wọn lòdì sí ọ, èmi yóò sí aṣọ rẹ, níwájú wọn, wọn yóò sì rí ìhòhò rẹ.
nʼihi ya, aga m achịkọta ndị niile bụ ndị ahụ niile ị hụrụ nʼanya, ndị gị na ha na-enwe obi ụtọ, ndị ị hụrụ nʼanya, ma ndị ị kpọrọ asị. Aga m achịkọta ha site gburugburu gị imegide gị, gbaa gị ọtọ nʼihu ha, ka ha hụ ọtọ gị niile.
38 Èmi yóò sì dá ọ lẹ́jọ́, gẹ́gẹ́ bí a ti dá obìnrin tó ba ìgbéyàwó jẹ́, tí wọn sì ta ẹ̀jẹ̀ sílẹ̀; Èmi yóò sì mú ẹ̀jẹ̀ ìbínú àti owú mi wá sórí rẹ.
Aga m ata gị ahụhụ a na-ata ndị inyom na-akwa iko, na ndị inyom na-egbu mmadụ. Aga m eme ka ịbọ ọbọ ọbara nke ọnụma m, ya na ekworo m, bịakwasị gị.
39 Nígbà náà ni èmi yóò fà ọ lé àwọn olólùfẹ́ rẹ lọ́wọ́, wọn yóò sì wó gbogbo òkìtì rẹ pẹ̀lú àwọn ojúbọ rẹ palẹ̀. Wọn yóò tú aṣọ kúrò lára rẹ̀, gbogbo ọ̀ṣọ́ rẹ ni wọn yóò gbà, wọn yóò sì fi ọ sílẹ̀ ní ìhòhò àti ní àìwọṣọ.
Aga m enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị hụrụ nʼanya, bụ ọtụtụ mba ahụ dị iche iche. Ha ga-ebibi gị, kwada ụlọ ịkwa iko gị, na ụlọ arụsị gị niile dị elu, gbaa gị ọtọ, narakwa gị uwe gị niile, na ihe ịchọ mma gị niile, hapụ gị ka ihere mee gị.
40 Wọn yóò pe àjọ ènìyàn jọ lé ọ lórí, àwọn tí yóò sọ ọ́ ní òkúta, tiwọn yóò sì fi idà wọn gé ọ sí wẹ́wẹ́.
Ha ga-akpọta igwe mmadụ ga-emegide gị, ndị ga-atụ gị nkume, jirikwa mma agha ha bọkasịa gị.
41 Wọn yóò jo gbogbo ilé rẹ palẹ̀ wọn yóò sì fi ìyà jẹ ọ́ ní ojú àwọn obìnrin. Èmi yóò fi òpin sí àgbèrè ṣíṣe rẹ. Ìwọ kò sì ní san owó fún àwọn olólùfẹ́ rẹ mọ́.
Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị.
42 Nígbà náà ni ìbínú mi sí o yóò rọ̀, owú ìbínú mi yóò sì kúrò lọ́dọ̀ rẹ; inú mi yóò rọ̀, èmi kò sì ní bínú mọ́.”
Mgbe ahụ, oke iwe m megide gị ga-adajụ, ekworo m ga-esite nʼebe ị nọ gabiga. Aga m anọ nwayọọ gharakwa iwe iwe ọzọ.
43 “‘Nítorí pé ìwọ kò rántí ọjọ́ èwe rẹ ṣùgbọ́n ìwọ ń rí mi fín pẹ̀lú gbogbo nǹkan wọ̀nyí, ó dájú pé, Èmi yóò mú gbogbo ohun tí ìwọ ti ṣe wa sí orí rẹ, ni Olúwa Olódùmarè wí, ìwọ kì yóò sì ṣe ìfẹ́kúfẹ̀ẹ́ yìí ni orí gbogbo ohun ìríra rẹ mọ́?
“‘Ebe ọ bụ na ị chetaghị ụbọchị ndị ahụ niile, mgbe ị dị nʼagbọghọbịa, ma i ji ihe ọjọọ ndị a niile ị na-eme kpasuo m iwe. Ya mere, aghaghị m ịkwụghachi gị dịka mmehie gị si dị. Ọ bụ na i meghị omume ndị a rụrụ arụ, tinyekwara mmehie agụụ ịkwa iko? Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
44 “‘Gbogbo àwọn to ń pòwe, ni yóò máa pòwe yìí mọ́ ọ pé: “Bí ìyá ṣe rí, bẹ́ẹ̀ ni ọmọ rẹ̀ obìnrin.”
“‘Lee, onye ọbụla na-atụ ilu, ga-atụ ilu a banyere gị sị, “Otu ọ dị nne ka ọ dị nwa ya nwanyị.”
45 Ìwọ ni ọmọ ìyá rẹ ti ó kọ ọkọ rẹ̀, àti àwọn ọmọ rẹ̀; ìwọ ni arábìnrin àwọn arábìnrin rẹ tí ó kọ àwọn ọkọ wọn àti àwọn ọmọ wọn: ara Hiti ni ìyá rẹ, ara Amori sì ni baba rẹ.
Nʼezie, ị dị ka nne gị, nʼihi na nne gị kpọrọ di ya na ụmụ ya asị. Ị dịkwa ka ụmụnne gị ndị inyom. Ha na-akpọ di ha na ụmụ ha asị. Nʼezie, nne gị bụ onye Het, nna gị bụkwa onye Amọrị.
46 Ẹ̀gbọ́n rẹ obìnrin ni Samaria, òun àti àwọn ọmọbìnrin rẹ̀ n gbé ni apá àríwá rẹ, àti àbúrò rẹ obìnrin ní ń gbé ọwọ́ òsì rẹ̀, àti àbúrò rẹ obìnrin ti ń gbé ọwọ́ ọ̀tún rẹ ni Sodomu àti àwọn ọmọ rẹ obìnrin.
Ada nne gị bụ Sameria, ya na ụmụ ya bi nʼugwu. Nwanne gị nwanyị nke nta bụ Sọdọm, ya na ụmụ ya bi nʼala ndịda.
47 Kì í sẹ pé ìwọ rìn ni ọ̀nà wọn nìkan, tàbí ṣe àfiwé ìwà ìríra wọn ṣùgbọ́n ní àárín àkókò kúkúrú díẹ̀, ìwọ bàjẹ́ jù wọ́n lọ
Ọ bụghị naanị na ị soro ụzọ ha niile, ị ṅomiri omume ibi ndụ arụ ha niile, kama dịka a ga-asị na nke a bụ ihe nta, nʼụzọ gị niile, ị ghọrọ onye rụrụ arụ karịa ha.
48 Olúwa Olódùmarè wí pé, “Bí mo ṣe wà láààyè, Sodomu tí í ṣe ẹ̀gbọ́n rẹ obìnrin àti àwọn ọmọbìnrin rẹ̀ kò ṣe to ohun tí ìwọ àti ọmọbìnrin rẹ ṣe.”
Ebe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom emetụbeghị ihe ndị a gị na ụmụ gị ndị inyom mere.
49 “‘Wò ó, ẹ̀ṣẹ̀ tí Sodomu ẹ̀gbọ́n rẹ̀ obìnrin ṣẹ̀ nìyìí. Òun àti àwọn ọmọbìnrin rẹ gbéraga, wọ́n jẹ́ alájẹjù àti aláìbìkítà; wọn kò ran tálákà àti aláìní lọ́wọ́.
“‘Mmehie nwanne gị nwanyị Sọdọm bụ nganga, na umengwụ, na oke oriri. Ha jụrụ inyere ndị nọ na mkpa, na ndị agụụ na-agụ nọ nʼọnụ ụzọ ha aka.
50 Nítorí náà, mo mu wọn kúrò níwájú mi lójú mi gẹ́gẹ́ bi ìwọ ti rò ó, nítorí ìgbéraga àti àwọn ohun ìríra tí wọ́n ṣe.
Ha dị elu nʼobi ha, mee ihe arụ nʼihu m. Nʼihi ya, esitere m nʼihu m wezuga ha dịka ị hụrụ.
51 Samaria kò ṣe ìdajì ẹ̀ṣẹ̀ rẹ. Ìwọ ṣe àwọn ohun ìríra ju tirẹ̀ lọ, ìwọ sì jẹ kí àwọn arábìnrin rẹ dàbí olódodo pẹ̀lú gbogbo ìwọ̀nyí tí ìwọ ti ṣe.
Ọ bụladị Sameria emerughị ọkara mmehie niile i mere. I meela ihe arụ bara ụba karịa nke ha mere, si otu a gụọ ụmụnne gị ndị inyom ka ndị ezi omume site nʼihe ndị a niile nke ị mere.
52 Gba ìtìjú rẹ, nítorí ìwọ ti jẹ́ kí arábìnrin rẹ gba ìdáláre. Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ rẹ ti burú ju tí wọn lọ, wọn dàbí olódodo ju ìwọ lọ. Nítorí náà rú ìtìjú rẹ, kí o sì gba ẹ̀gàn rẹ pẹ̀lú nítorí ìwọ ti jẹ́ kí àwọn arábìnrin rẹ dàbí olódodo.
Gị onwe gị buru ihe ihere gị, nʼihi na omume gị ekpepụtala ụmụnne gị ndị inyom. Nʼihi na mmehie gị dị njọ, dịkwa ukwuu karịa nke ha, ha bụ ndị a gụrụ na ndị ezi omume karịa gị. Ya mere, ka ihere mee gị, burukwa ọnọdụ ihere gị, nʼihi na ị meela ka a gụọ ụmụnne gị ndị inyom dịka ndị ezi omume.
53 “‘Bi o tilẹ̀ jẹ pe èmi yóò mú ìgbèkùn wọn padà, ìgbèkùn Sodomu àti àwọn ọmọ rẹ̀ obìnrin, pẹ̀lú Samaria àti àwọn ọmọ rẹ̀ obìnrin, nígbà náà ni èmi yóò tún mú ìgbèkùn àwọn òǹdè rẹ wá láàrín wọn,
“‘Ma otu ọ dị, aga m eme ka ọganihu nke Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke Sameria na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke gị dịghachikwa nʼetiti ha:
54 kí ó bá à le rú ìtìjú rẹ, àti ẹ̀gàn gbogbo ohun tí ìwọ ṣe láti tù wọ́n nínú.
Ka i nwee ike bụrụ ọnọdụ ihere gị, ka ihere mekwa gị nʼihi ihe niile i mere, nʼịkasị ha obi.
55 Nígbà tí àwọn arábìnrin rẹ, Sodomu àti àwọn ọmọbìnrin rẹ; Samaria àti àwọn ọmọbìnrin rẹ ba padà si ipò tí wọn wà tẹ́lẹ̀, ìgbà náà ni ìwọ náà yóò padà sí ipò àtijọ́ rẹ.
Ọzọ ndị ụmụnne gị nwanyị bụ Sọdọm na Sameria na ụmụ ha ndị inyom ga-alọta nʼọnọdụ mbụ ha; gị na ụmụ gị ndị inyom ga-alọtakwa nʼọnọdụ mbụ unu.
56 Ìwọ ko tilẹ̀ ní dárúkọ arábìnrin rẹ Sodomu ni ọjọ́ ìgbéraga rẹ,
Ma ị pụghị emeghe ọnụ gị kpọọ aha nwanne gị nwanyị bụ Sọdọm nʼụbọchị nganga gị,
57 kó tó di pé àṣírí ìwà búburú rẹ tú síta, báyìí ìwọ di ẹni ẹ̀gàn lọ́dọ̀ àwọn ọmọbìnrin Edomu, Siria àti gbogbo agbègbè rẹ, àti lọ́dọ̀ àwọn ọmọbìnrin Filistini àti lọ́dọ̀ àwọn tó yí ọ ká, tiwọn si ń kẹ́gàn rẹ.
tupu e kpughe ajọ omume gị. Ọ bụladị otu ahụ, ugbu a ị bụ ihe ịkwa emo nye ndị ada Edọm na ndị agbataobi ya niile, na ndị ada ndị Filistia. Ndị niile nọ gị gburugburu na-elelịkwa gị anya.
58 Èmi yóò gba ẹ̀san ìwà ìfẹ́kúfẹ̀ẹ́ àti àwọn iṣẹ́ ìríra rẹ ní Olúwa wí.’
Ị ga-anata ụgwọ ọrụ nke ịkwa iko gị, na ihe arụ ndị ọzọ ị na-eme. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
59 “Báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí, ‘Èmi yóò hùwà sí ọ gẹ́gẹ́ bi ó ṣe tọ́ sí ọ, nítorí ó ti kẹ́gàn ẹ̀jẹ́ nípa dídà májẹ̀mú.
“‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, nʼihi na ị ledara iyi ahụ ị ṅụrụ anya site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ.
60 Síbẹ̀ èmi yóò rántí májẹ̀mú tí mo bá ọ ṣe nígbà èwe rẹ, èmi yóò sì bá ọ dá májẹ̀mú láéláé.
Ma otu ọbụla o si dị, aga m edebezu nkwa ahụ niile m kwere gị mgbe ị dị na nwantakịrị. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti mụ na gị guzosie ike ruo ebighị ebi.
61 Nígbà náà ni ìwọ yóò rántí àwọn ọ̀nà rẹ ojú yóò sì tì ọ́ nígbà tí mo bá gba àwọn ẹ̀gbọ́n àti àbúrò rẹ obìnrin padà. Fún ọ gẹ́gẹ́ bí ọmọbìnrin, ṣùgbọ́n kì í ṣe lórí májẹ̀mú tí mo bá ọ dá.
Mgbe ahụ, ị ga-echeta ụzọ gị niile, ma nwee ihere, mgbe m ga-ewere ụmụnne gị ndị inyom ndị ahụ tọrọ gị na ndị nke ị tọrọ nye gị ha dịka ụmụ, ma ọ bụghị nʼihi ọgbụgba ndụ m.
62 Èmi yóò gbé májẹ̀mú mi kalẹ̀ pẹ̀lú rẹ, ìwọ yóò sì mọ pé èmi ni Olúwa.
Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị guzosie ike, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
63 Nígbà tí mo bá sì ti ṣe ètùtù fún gbogbo ẹ̀ṣẹ̀ rẹ tan, Èmi yóò sì rántí, ojú yóò tì ọ́, ìwọ kò sì ní le ya ẹnu rẹ mọ́ nítorí ìtìjú rẹ, ni Olúwa Olódùmarè wí.’”
Mgbe ahụ, aga m ekpuchiri gị ajọ omume niile bụ nke ị mere. Ihere ga-eme gị mgbe i chetara ndụ ọjọọ gị, ị gaghị emeghekwa ọnụ gị kwuo okwu nʼihi oke mweda nʼala gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”