< Exodus 38 >

1 Ó sì fi igi kasia kọ́ pẹpẹ ẹbọ sísun, ìgbọ̀nwọ́ mẹ́fà ni gíga rẹ̀ àti ìgbọ̀nwọ́ márùn-ún, igun rẹ̀ ṣe déédé.
Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke ịla elu ya dị otu mita na iri sentimita atọ. Ogologo ya na obosara ya ha nʼotu. Ha dị mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ.
2 Ó ṣe ìwo sí igun mẹ́rẹ̀ẹ̀rin, nítorí kí ìwo àti pẹpẹ náà lè jẹ́ ọ̀kan, ó sì bo pẹpẹ náà pẹ̀lú idẹ.
Ha rụnyekwara mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ ghọọ nke e jikọtara nʼotu. Ha jikwa bronz machie ebe ịchụ aja a.
3 Idẹ ni ó ṣe gbogbo ohun èlò pẹpẹ, ìkòkò rẹ̀, ọkọ, àwokòtò rẹ̀, fọ́ọ̀kì tí a fi n mú ẹran àti àwo iná rẹ̀.
Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
4 Ó ṣe ààrò fún pẹpẹ náà, àwọ̀n onídẹ, kí ó wà níṣàlẹ̀ ẹsẹ̀ rẹ̀, dé ìdajì òkè pẹpẹ náà.
Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya.
5 Ó dá òrùka idẹ láti mú kí ó di òpó igun mẹ́rẹ̀ẹ̀rin idẹ ààrò náà mú.
Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ.
6 Ó sì fi igi kasia ṣe àwọn òpó náà, ó sì bò wọ́n pẹ̀lú idẹ.
Ha mere mkpara osisi akashia ndị a, were bronz machie ha.
7 Ó sì fi òpó náà bọ inú òrùka, nítorí kí ó lè wà ní ìhà pẹpẹ náà láti máa fi gbé e. Ó sì fi pákó ṣé pẹpẹ náà ní oníhò nínú.
Ha mere ka mkpara ndị ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ime ka ha dịrị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ maka iji nʼebu ya. Ha ji obodobo osisi rụọ ya dịka igbe.
8 Ó ṣe agbada idẹ, o sì fi idẹ ṣe ẹsẹ̀ rẹ̀ ti àwòjìji àwọn obìnrin tí ó ń sìn ní ẹnu-ọ̀nà àgọ́ àjọ.
Ha ji bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya. Ọ bụ enyo nke ndị inyom ahụ ndị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka e ji kpụọ ha.
9 Ó sì ṣe àgbàlá inú náà. Ní ìhà gúúsù ni aṣọ títa ti ọ̀gbọ̀ olókùn dáradára wà, ó jẹ́ mita mẹ́rìndínláàádọ́ta ní gígùn,
Ọzọ, ha mere ogige ahụ. Ịdị ogologo nke nʼakụkụ ndịda dị iri mita anọ na ise. O nwere akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
10 pẹ̀lú ogún òpó àti ogún ihò ìtẹ̀bọ̀ idẹ, àti pẹ̀lú fàdákà tí ó kọ́ ọ, tí ó sì de àwọn òpó náà.
Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha.
11 Ní ìhà àríwá náà tún jẹ mita mẹ́rìndínláàádọ́ta ní gígùn, ó sì ní ogún òpó àti ogun ihò ìtẹ̀bọ̀ idẹ, pẹ̀lú fàdákà tí ó kọ́ ọ, tí ó sì de àwọn òpó náà.
Otu a kwa, akụkụ ugwu dịkwa iri mita anọ na ise. O nwere iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
12 Ìhà ìwọ̀-oòrùn jẹ́ mita mẹ́tàlélógún ní fífẹ̀, ó sì ní aṣọ títa pẹ̀lú òpó mẹ́wàá àti ihò ìtẹ̀bọ̀ mẹ́wàá, pẹ̀lú fàdákà tí ó kọ́ ọ, tí ó sì de àwọn òpó náà pọ̀.
Akụkụ ọdịda anyanwụ dị iri mita abụọ na atọ. Nwekwaa akwa mgbochi, nwere ogidi iri na ebe ndọkwasị iri, tinyere anya nko ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
13 Fún ìhà ìlà-oòrùn, sí ibi tí oòrùn ti ń yọ náà jẹ́ mita mẹ́tàlélógún ni fífẹ̀.
Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite dịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.
14 Aṣọ títa ìhà ẹnu-ọ̀nà kan jẹ́ mita mẹ́fà ààbọ̀, pẹ̀lú òpó mẹ́ta àti ihò ìtẹ̀bọ̀ mẹ́ta,
Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ bụ ihe dị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
15 àti aṣọ títa ní ìhà kejì tí ó wà ní ẹnu-ọ̀nà àgbàlá náà jẹ́ mita mẹ́fà ààbọ̀ pẹ̀lú òpó mẹ́ta àti ihò ìtẹ̀bọ̀ mẹ́fà.
Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa bụ ihe dị nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ
16 Gbogbo aṣọ tí ó yí àgbàlá náà jẹ́ ọ̀gbọ̀ olókùn dáradára.
Akwa mgbochi niile nke ogige ahụ gburugburu bụ ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.
17 Ihò ìtẹ̀bọ̀ fún òpó náà idẹ ni. Ìkọ́ òpó náà àti ìgbànú tí ó wà lára òpó náà jẹ́ fàdákà, a sì bo orí wọn pẹ̀lú fàdákà; gbogbo àwọn òpó àgbàlá náà ní ìgbànú fàdákà.
Ogidi ọbụla nwere ihe ndọkwasị bronz. Nko niile na ihe njikọta niile ka e jikwa ọlaọcha machie. Ọ bụkwa naanị ọlaọcha ka e ji mee okporo osisi ndị ahụ.
18 Aṣọ títa fún ẹnu-ọ̀nà àgbàlá náà jẹ́ ti aṣọ aláró, ti elése àlùkò, ti òdòdó àti ti ọ̀gbọ̀ olókùn wẹ́wẹ́ tí a fi iṣẹ́ abẹ́rẹ́ ṣe; ogún ìgbọ̀nwọ́ sì ni gígùn rẹ̀, àti gíga rẹ̀ ní ìbò rẹ̀ jẹ ìgbọ̀nwọ́ márùn-ún, ó bá aṣọ títa àgbàlá wọ̀n-ọn-nì ṣe déédé,
Akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ bụ ihe e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee; akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ dị mita itoolu nʼogologo, yikwaa akwa mgbochi nke ebe ogige ahụ, dị mita abụọ na iri sentimita atọ nʼịdị elu.
19 pẹ̀lú òpó mẹ́rin àti ihò ìtẹ̀bọ̀ idẹ mẹ́rin. Ìkọ́ àti ìgbànú wọn jẹ́ fàdákà, a sì bo orí wọn pẹ̀lú fàdákà.
Ọ bụ ogidi anọ ka e ji jidesie ha ike na ihe ndọkwasị bronz anọ, nko na okporo osisi ha niile bụ ọlaọcha. E jikwa ọlaọcha machie isi ogidi ndị ahụ.
20 Gbogbo èèkàn àgọ́ tabanaku náà àti ti àyíká àgbàlá náà jẹ́ idẹ.
Ǹtu niile nke ụlọ nzute ahụ nakwa nʼogige ya gburugburu bụ bronz ka e ji kpụọ ha.
21 Wọ̀nyí ni iye ohun èlò tí a lò fún tabanaku náà, tabanaku ẹ̀rí, èyí ti a kọ bí òfin Mose nípa àwọn ọmọ Lefi ní abẹ́ àkóso Itamari ọmọ Aaroni àlùfáà.
Ndị a bụ ngwongwo niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ; ebe a ga-edebe Ihe Ama ahụ. Ọ bụ ndị Livayị depụtara ihe niile ndị a nʼusoro dịka Mosis si nye ha nʼiwu. Ọ bụkwa Itama, nwa Erọn onye nchụaja, lekọtara ndị niile rụrụ ọrụ idekọta ya.
22 (Besaleli ọmọ Uri, ọmọ Huri, ti ẹ̀yà Juda, ṣe ohun gbogbo ti Olúwa pàṣẹ fún Mose.
Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, rụzuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
23 Pẹ̀lú rẹ̀ ni Oholiabu ọmọ Ahisamaki, ti ẹ̀yà Dani: alágbẹ̀dẹ, àti oníṣẹ́-ọnà àti oníṣọ̀nà tí a fi iṣẹ́ abẹ́rẹ́ ṣe ní aṣọ aláró àti elése àlùkò àti òdòdó àti ọ̀gbọ̀ dáradára.)
Onye na-enyere ya aka bụ Oholiab nwa Ahisamak, onye ebo Dan, bụ onye ọka a maara aha ya, ọ bụ onye ọka ihe ọtụtụ, na onye ọka ịdụnye ihe ịchọ mma dị iche iche nʼakwa na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha.
24 Àròpọ̀ iye wúrà lára wúrà ọrẹ tí a lò fún gbogbo iṣẹ́ ibi mímọ́ náà jẹ́ tálẹ́ǹtì mọ́kàndínlọ́gbọ̀n àti òjìlélẹ́ẹ̀gbẹ́rín ó dín mẹ́wàá ṣékélì gẹ́gẹ́ bí i ṣékélì ibi mímọ́.
Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise.
25 Fàdákà tí a rí nínú ìjọ, ẹni tí a kà nínú ìkànìyàn jẹ́ ọgọ́rùn-ún tálẹ́ǹtì àti òjìdínlẹ́gbẹ̀san ó lé mẹ́ẹ̀ẹ́dógún ṣékélì, gẹ́gẹ́ bí ìwọ̀n ṣékélì ibi mímọ́,
Ịdị arọ nke ọlaọcha enwetara nʼaka ọgbakọ ahụ, bụ puku kilogram anọ, na narị kilogram isii na iri ise dịka shekel ebe nsọ si dị.
26 ààbọ̀ ṣékélì kan ní orí ẹnìkọ̀ọ̀kan, gẹ́gẹ́ bí ìwọ̀n ṣékélì ibi mímọ́, lórí olúkúlùkù ẹni tí ó ti kọjá tí a ti kà, láti ẹni ogún ọdún tàbí jù bẹ́ẹ̀ lọ, àròpọ̀ wọ́n jẹ́ ọgbọ̀n ọ̀kẹ́ lé ẹgbẹ̀tadínlógún ó lé àádọ́jọ ọkùnrin.
Ha niile tụrụ otu beka, otu isi, dịka ụtụ mgbe e kere ụtụ ọkara shekel dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị, e nyere nʼisi onye ọbụla nke gabigara nʼebe ndị a gụrụ ọnụ nọ, bụ ndị gbara iri afọ abụọ rigoo. Ọnụọgụgụ ha dị narị isii, na puku atọ, na narị ise, na iri ise.
27 Ọgọ́rùn-ún tálẹ́ǹtì fàdákà ní a lò láti fi dá ihò ìtẹ̀bọ̀ fún ibi mímọ́ àti fún aṣọ títa ọgọ́rùn-ún ihò ìtẹ̀bọ̀ nínú ọgọ́rùn-ún tálẹ́ǹtì náà tálẹ́ǹtì kan fún ihò ìtẹ̀bọ̀ kọ̀ọ̀kan.
Ịdị arọ nke ọlaọcha niile e ji rụọ ụkwụ ibo niile nke ebe nsọ ahụ, na ụkwụ ogidi niile e ji jidesie akwa mgbochi ndị ahụ ike bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram isii. Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji wuo ụkwụ ọbụla bụ iri kilogram atọ na isii.
28 Ó lo òjìdínlẹ́gbẹ̀san ó lé mẹ́ẹ̀ẹ́dógún ṣékélì ni ó fi ṣe ìkọ́ fún òpó náà, láti fi bo orí òpó náà àti láti fi ṣe ọ̀já wọn.
Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji menye nko nʼibo osisi niile, na nke e ji machie okporo osisi niile, na nke e ji techie isi ogidi osisi niile, bụ iri kilogram abụọ.
29 Idẹ ara ọrẹ náà jẹ́ àádọ́rin tálẹ́ǹtì àti egbèjìlá ṣékélì.
Ịdị arọ nke bronz niile ndị mmadụ wetara dịka onyinye aja mfufe bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram atọ, na iri isii.
30 Ó lò ó láti fi ṣe ihò ìtẹ̀bọ̀ fún ẹnu-ọ̀nà àgọ́ àjọ, pẹpẹ idẹ náà pẹ̀lú ààrò idẹ rẹ̀ àti gbogbo ohun èlò rẹ̀,
E ji bronz ndị a wuo ụkwụ ogidi niile a manyere nʼihu ụzọ e si abata ogige ụlọ nzute ahụ. E jikwa ya wuo ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpụ bronz ahụ, na ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja,
31 ihò ìtẹ̀bọ̀ àgbàlá náà àyíká àti ihò ìtẹ̀bọ̀ ẹnu-ọ̀nà àgbàlá àti gbogbo èèkàn àgọ́ náà, àti gbogbo èèkàn àgbàlá náà yíká.
na ụkwụ ogidi a manyere nʼihu ụlọ nzute, na ǹtu niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ, na ogige gbara ya gburugburu.

< Exodus 38 >