< Exodus 31 >
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
2 “Wò ó, Èmi ti yan Besaleli ọmọ Uri, ọmọ Huri, ti ẹ̀yà Juda,
“Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda,
3 Èmi sì ti fi Ẹ̀mí Ọlọ́run kún un pẹ̀lú ọgbọ́n, òye àti ìmọ̀ ní gbogbo onírúurú iṣẹ́ ọnà.
emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche,
4 Láti ṣe aláràbarà iṣẹ́ ní wúrà, fàdákà àti idẹ,
ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,
5 láti gbẹ́ òkúta àti láti tò wọ́n, láti ṣiṣẹ́ ní igi, àti láti ṣiṣẹ́ ní gbogbo onírúurú iṣẹ́ ọnà.
ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche.
6 Síwájú sí i, èmi ti yan Oholiabu ọmọ Ahisamaki, ti ẹ̀yà Dani, láti ràn án lọ́wọ́. “Bákan náà, Èmi ti fi ọgbọ́n fún gbogbo àwọn oníṣẹ́-ọnà láti ṣe ohun gbogbo tí mo pàṣẹ fún ọ:
Ọzọkwa, ahọpụtala m Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, ka ọ bụrụ onye inyeaka Bezalel. “Enyekwala m ndị ǹka niile amara ịrụ ọrụ dị iche, nke ga-enyere ha aka ịrụ ihe ndị a niile m nyere gị iwu ịrụ:
7 “àgọ́ àjọ náà, àpótí ẹ̀rí pẹ̀lú ìtẹ́ àánú tí ó wà lórí rẹ̀, àti gbogbo ohun èlò àgọ́ náà,
“ya bụ, ụlọ nzute ahụ, na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu, na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ,
8 tábìlì àti ohun èlò rẹ̀, ọ̀pá fìtílà tí ó jẹ́ kìkì wúrà àti gbogbo ohun èlò rẹ̀, pẹpẹ tùràrí,
na tebul, na ngwongwo ya, ma ihe ịdọkwasị oriọna nke ọlaedo a nụchara anụcha, na ngwongwo ya,
9 pẹpẹ ẹbọ sísun àti gbogbo ohun èlò rẹ̀, agbada pẹ̀lú ẹsẹ̀ rẹ̀,
na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya, na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ.
10 àti aṣọ híhun pẹ̀lú, papọ̀ pẹ̀lú aṣọ mímọ́ fún Aaroni àlùfáà àti aṣọ fún àwọn ọmọ rẹ̀ nígbà tí wọ́n bá ń ṣiṣẹ́ bí àlùfáà,
Na uwe ọma ahụ akpara akpa, ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja.
11 òróró ìtasórí àti tùràrí olóòórùn dídùn fún Ibi Mímọ́. “Kí wọ́n ṣe wọ́n gẹ́gẹ́ bí mo ṣe pàṣẹ fún ọ.”
Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis,
13 “Kí ìwọ kí ó sọ fún àwọn ọmọ Israẹli pé, ‘Ẹ̀yin gbọdọ̀ máa pa ọjọ́ ìsinmi mi mọ́. Èyí ni yóò jẹ́ àmì láàrín Èmi àti ẹ̀yin fún ìrandíran tó ń bọ̀, nítorí kí ẹ̀yin lè mọ̀ pé Èmi ni Olúwa, ẹni tí ó yà yín sí mímọ́.
Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ.
14 “‘Nítorí náà, kí ẹ̀yin kí ó máa pa ọjọ́ ìsinmi mọ́, nítorí mímọ́ ni fún un yín. Ẹnikẹ́ni tí ó bá bà á jẹ́, ni a yóò pa; ẹnikẹ́ni tí ó bá ṣe iṣẹ́ kankan ní ọjọ́ náà ni a yóò gé kúrò nínú àwọn ènìyàn rẹ.
“‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ.
15 Ọjọ́ mẹ́fà ni kí ẹ fi ṣiṣẹ́, ṣùgbọ́n ọjọ́ keje ní ọjọ́ ìsinmi tí ẹ̀yin yóò fi sinmi, mímọ́ ni fún Olúwa. Ẹnikẹ́ni tí ó bá ṣiṣẹ́ ní ọjọ́ ìsinmi ni a ó pa nítòótọ́.
Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ unu niile. Ma ụbọchị nke asaa dị iche. Ọ bụ ụbọchị izuike. Ọ bụkwa ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, onye ọbụla rụrụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị Izuike ga-anwụ.
16 Nítorí náà ni àwọn ọmọ Israẹli yóò ṣe máa pa ọjọ́ ìsinmi mọ́, ẹ máa ṣe àkíyèsí rẹ̀ dé ìrandíran tó ń bọ̀ bí i májẹ̀mú títí láé.
Ndị Izrel ga-edebe ụbọchị Izuike, na-eme mmemme ya nʼọgbọ niile, dịka ọgbụgba ndụ nke ebighị ebi.
17 Yóò jẹ́ àmì láàrín Èmi àti àwọn ọmọ Israẹli títí láé, nítorí ní ọjọ́ mẹ́fà ni Olúwa dá ọ̀run àti ayé, àti ní ọjọ́ keje ni ó fi iṣẹ́ sílẹ̀, ó sì sinmi.’”
Ọ ga-abụ ihe ịrịbama nke ga-adịgide nʼetiti mụ na ndị Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na nʼụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa. Ọ kwụsịrị ọrụ nʼụbọchị nke asaa, zuo ike, turu ndụ.’”
18 Nígbà tí Olúwa parí ọ̀rọ̀ sísọ fún Mose lórí òkè Sinai, ó fún un ní òkúta wàláà ẹ̀rí méjì, òkúta wàláà òkúta tí a fi ìka Ọlọ́run kọ.
Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Mosis okwu ndị a nʼelu ugwu Saịnaị, o nyere ya mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Ọ bụkwa mbadamba nkume ndị ahụ nke mkpịsịaka Chineke dere ihe nʼelu ha.