< Exodus 12 >

1 Olúwa sọ fún Mose àti Aaroni ni ilẹ̀ Ejibiti pé,
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha,
2 “Oṣù yìí ni yóò jẹ́ oṣù àkọ́kọ́ fún yín, oṣù àkọ́kọ́ nínú ọdún yín.
“Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu.
3 Sọ fún gbogbo àwọn ènìyàn Israẹli pé ni ọjọ́ kẹwàá oṣù yìí, ọkùnrin kọ̀ọ̀kan yóò mú ọ̀dọ́-àgùntàn kọ̀ọ̀kan fún ìdílé rẹ̀, ọ̀kan fún agbo ilé kọ̀ọ̀kan.
Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla.
4 Bí ìdílé kan bá kéré jù fún odidi ọ̀dọ́-àgùntàn kan, kí wọn kí ó ṣe àjọpín ọ̀kan pẹ̀lú aládùúgbò wọn ti ó sun mọ́ wọn kí wọ́n lo iye ènìyàn tiwọn jẹ láti ṣe òdínwọ̀n irú ọ̀dọ́-àgùntàn tiwọn yóò lò ní ìbámu pẹ̀lú ìwọ̀n ti ẹni kọ̀ọ̀kan lè jẹ.
Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ.
5 Ọ̀dọ́-àgùntàn tí ìwọ yóò mú gbọdọ̀ jẹ́ akọ ọlọ́dún kan tí kò lábùkù, ìwọ lè mú lára àgbò tàbí ewúrẹ́.
Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu.
6 Ṣe ìtọ́jú wọn títí di ọjọ́ kẹrìnlá oṣù yìí nígbà tí gbogbo ìjọ ènìyàn Israẹli yóò pa ẹran náà ní àfẹ̀mọ́júmọ́.
Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya.
7 Wọn yóò mú lára ẹ̀jẹ̀ ẹran náà, wọn yóò fi kan ẹ̀gbẹ́ méjèèjì àti òkè ẹnu-ọ̀nà àbáwọlé níbi tí wọ́n bá ti jẹ ẹran ọ̀dọ́-àgùntàn náà.
Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ.
8 Ní òru ọjọ́ kan náà, wọn yóò jẹ ẹran tí a ti fi iná sun, pẹ̀lú ewé ewúro àti àkàrà aláìwú.
Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu.
9 Ẹ má ṣe jẹ ẹran náà ni tútù tàbí ní bíbọ̀ nínú omi, ṣùgbọ́n kí ẹ fi iná sun orí, ẹsẹ̀ àti àwọn nǹkan inú ẹran náà.
A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya.
10 Ẹ má ṣe fi èyíkéyìí sílẹ̀ di òwúrọ̀ ọjọ́ kejì, bí ó bá ṣẹ́kù di òwúrọ̀ ọjọ́ kejì, kí ẹ jó o níná.
Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ.
11 Báyìí ni ẹ̀yìn yóò ṣe jẹ́ tí ẹ̀yin ti àmùrè ní ẹ̀gbẹ́ yín, sáńdà yín ní ẹsẹ̀ yín àti ọ̀pá yín ni ọwọ́ yín. Ẹ yára jẹ ẹ́, oúnjẹ àjọ ìrékọjá Olúwa ni.
Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
12 “Ní òru ọjọ́ yìí kan náà ni Èmi yóò la gbogbo ilẹ̀ Ejibiti kọjá, èmi yóò sì pa gbogbo àkọ́bí àti ènìyàn, àti ẹranko, èmi yóò mú ìdájọ́ wà sí orí àwọn òrìṣà ilẹ̀ Ejibiti. Èmi ni Olúwa.”
“Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị.
13 Ẹ̀jẹ̀ ni yóò jẹ́ àmì fún un yín ní àwọn ilé tí ẹ̀yin wà, nígbà tí èmi bá rí ẹ̀jẹ̀ náà, Èmi yóò ré e yín kọjá. Ààrùn kan kì yóò kàn yín nígbà tí èmi bá kọlu Ejibiti láti pa wọ́n run.
Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt.
14 “Ọjọ́ òní ni yóò sì máa ṣe ọjọ́ ìrántí fún yín, ẹ́yin yóò sì máa láàrín àwọn ìran tí ó ń bọ̀ lẹ́yìn ni ẹ̀yin yóò ti máa ṣe ní àjọ fún Olúwa; ní ìran-ìran yín bí ìlànà tí yóò wà títí ayé.
“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
15 Fún ọjọ́ méje ni ẹ̀yin yóò fi jẹ àkàrà tí kò ní ìwúkàrà. Ní ọjọ́ kìn-ín-ní, ẹ ó gbé ìwúkàrà kúrò ni ilé yín, nítorí ẹnikẹ́ni tí ó bá jẹ ohunkóhun tí ó ni ìwúkàrà nínú láti ọjọ́ kìn-ín-ní di ọjọ́ keje ni kí a yọ kúrò ni Israẹli.
Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel.
16 Ní ọjọ́ kìn-ín-ní kí àpéjọ mímọ́ kí ó wà; àti ní ọjọ́ keje àpéjọ mímọ́ mìíràn yóò wà fún yín. Ẹ má ṣe ṣe iṣẹ́kíṣẹ́ kan ní àwọn ọjọ́ wọ̀nyí, bí kò ṣe oúnjẹ tí olúkúlùkù yóò jẹ; kìkì èyí ni gbogbo ohun tí ẹ̀yin lè ṣe.
Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri.
17 “Ẹ ó sì kíyèsí àjọ àìwúkàrà, nítorí ní ọjọ́ náà gan an ni mo mú ogun yín jáde kúrò ni ilẹ̀ Ejibiti. Nítorí náà ni kí ẹ máa kíyèsi ọjọ́ náà ní ìran-ìran yín bí ìlànà tí yóò wà títí ayé.
“Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ
18 Àkàrà ti kò ni ìwúkàrà ni ẹ̀yin yóò jẹ láti ìrọ̀lẹ́ ọjọ́ kẹrìnlá títí di ìrọ̀lẹ́ ọjọ́ kọ̀kànlélógún oṣù àkọ́kọ́.
Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu.
19 Fún ọjọ́ méje ni ẹ kò gbọdọ̀ ni ìwúkàrà nínú ilé yín, ẹnikẹ́ni tí ó bá jẹ ohun tí ó ni ìwúkàrà nínú ni a ó yọ kúrò ni àárín àwùjọ Israẹli, ìbá à ṣe àlejò tàbí ẹni tí a bí ní ilẹ̀ náà.
Nʼime ụbọchị asaa ahụ, agaghị ahụ ihe na-eko achịcha nʼụlọ unu. A ga-esite nʼọgbakọ ndị Izrel bipụ onye ọbụla riri ihe ọbụla nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya. Iwu a dịrị ndị ọbịa niile nʼala Izrel, dịkwara ndị nwa afọ ala.
20 Ẹ kò gbọdọ̀ jẹ ohunkóhun tí a fi ìwúkàrà ṣe. Ní ibikíbi tí ẹ̀yin bá ń gbé, kí ẹ̀yin kí ó jẹ àkàrà tí kò ní ìwúkàrà.”
Unu agaghị eri ihe ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. Nʼebe obibi unu niile, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko ka unu ga-eri.”
21 Ní ìgbà náà ni Mose pé gbogbo àwọn àgbàgbà Israẹli jọ, ó sì sọ fún wọn pé, “Ẹ jáde lọ, kí ẹ sì yan ọ̀dọ́-àgùntàn fún àwọn ìdílé yín, kí ẹ sì pa ẹran àjọ ìrékọjá Olúwa.
Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a.
22 Ẹ̀yin yóò sì mú ìdí-ewé hísópù, ẹ tì í bọ inú ẹ̀jẹ̀ tí ó wà nínú ọpọ́n kí ẹ sì fi kun òkè à bá wọ ẹnu-ọ̀nà ilé yín àti ẹ̀gbẹ́ méjèèjì ìlẹ̀kùn yín. Ẹnikẹ́ni nínú yín kò gbọdọ̀ jáde sí òde títí di òwúrọ̀.
Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ.
23 Ní ìgbà tí Olúwa bá ń lọ káàkiri ní ilẹ̀ Ejibiti láti kọlù wọn, yóò rí ẹ̀jẹ̀ ni òkè ẹnu-ọ̀nà àti ni ẹ̀gbẹ́ ẹnu-ọ̀nà ilé yín, yóò sì ré ẹnu-ọ̀nà ilé náà kọjá, kì yóò gba apanirun láààyè láti wọ inú ilé e yín láti kọlù yín.
Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu.
24 “Ẹ pa ìlànà yìí mọ́ gẹ́gẹ́ bí ohun tí ẹ ó máa ṣe títí ayérayé láàrín yín àti àwọn ìran yín.
“Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu.
25 Nígbà tí ẹ̀yin bá de ilẹ̀ tí Olúwa yóò fi fún un yín bí òun ti ṣe ìlérí, ẹ máa kíyèsi àjọ yìí.
Mgbe unu batara nʼala ahụ Onyenwe anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe a.
26 Ní ìgbà tí àwọn ọmọ yín bá béèrè lọ́wọ́ yín, ‘Kí ni ohun tí àjọ yìí túmọ̀ sí fún un yín?’
Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’
27 Ẹ sọ fún wọn ni ìgbà náà, ‘Ẹbọ ìrékọjá sí Olúwa ni, ẹni tí ó rékọjá ilé àwọn ọmọ Israẹli ni ìgbà tí ó kọlu àwọn ara Ejibiti. Tí ó si da wa sí nígbà ti ó pa àwọn ara Ejibiti.’” Àwọn ènìyàn sì tẹríba láti sìn.
Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’”
28 Àwọn ọmọ Israẹli ṣe gẹ́gẹ́ bí Olúwa ti pàṣẹ fún Mose àti Aaroni.
Ụmụ Izrel mezuru ihe niile Onyenwe anyị gwara ha site nʼọnụ Mosis na Erọn.
29 Ní ọ̀gànjọ́ òru Olúwa kọlu gbogbo àwọn àkọ́bí ilẹ̀ Ejibiti, láti orí àkọ́bí. Farao tí ó wà ní orí ìtẹ́ títí dé orí àkọ́bí ẹlẹ́wọ̀n tí ó wà nínú túbú àti àkọ́bí ẹran ọ̀sìn pẹ̀lú.
Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ.
30 Farao àti àwọn ìjòyè rẹ̀ àti gbogbo àwọn ara Ejibiti dìde ní ọ̀gànjọ́ òru, igbe ẹkún ńlá sì gba gbogbo ilẹ̀ Ejibiti, nítorí kò sí ilé kan tí ó yọ sílẹ̀ tí ènìyàn kan kò ti kú.
Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị Ijipt niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala Ijipt, nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị.
31 Farao sì ránṣẹ́ pe Mose àti Aaroni ní òru, ó sì wí pé, “Ẹ kúrò lọ́dọ̀ mi ẹ̀yin àti àwọn ènìyàn Israẹli! Ẹ lọ láti sin Olúwa gẹ́gẹ́ bí ẹ ti béèrè.
Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee Onyenwe anyị unu ofufe dịka unu rịọrọ.
32 Ẹ kó agbo àgùntàn yín àti agbo màlúù yín gẹ́gẹ́ bí ẹ̀yin ti sọ, kí ẹ sì máa lọ, kí ẹ sì súre fún mi.”
Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.”
33 Àwọn ara Ejibiti ń rọ àwọn ènìyàn náà láti yára máa lọ kúrò ní ilẹ̀ wọn. Wọ́n wí pé, “Bí bẹ́ẹ̀ kọ́ gbogbo wa ni yóò kú!”
Ndị Ijipt gbalịrị ime ka ụmụ Izrel hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.”
34 Àwọn ènìyàn náà sì mú ìyẹ̀fun púpọ̀ kí wọn tó fi ìwúkàrà sí i, wọ́n gbe le èjìká wọn nínú ọpọ́n tí wọ́n ti fi aṣọ dì.
Ya mere, ụmụ Izrel buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha.
35 Àwọn ọmọ Israẹli ṣe gẹ́gẹ́ bí Mose ti sọ fún wọn. Wọ́n sì béèrè lọ́wọ́ ará Ejibiti fún ohun èlò fàdákà àti wúrà àti fún aṣọ pẹ̀lú.
Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe.
36 Olúwa ti mú kí àwọn ènìyàn yìí rí ojúrere àwọn ará Ejibiti wọ́n sì fún wọn ní ohun tí wọ́n béèrè fún, wọ́n sì ko ẹrù àwọn ará Ejibiti.
Onyenwe anyị nyere ndị ya amara nʼihu ndị Ijipt, ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ Izrel napụtara ndị Ijipt ihe niile ha ji biri nʼụlọ.
37 Àwọn ọmọ Israẹli sì rìn láti Ramesesi lọ sí Sukkoti. Àwọn ọkùnrin tó ń fi ẹsẹ̀ rìn tó ọgbọ̀n ọ̀kẹ́ ni iye láìka àwọn obìnrin àti àwọn ọmọdé.
Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị.
38 Ọ̀pọ̀ àwọn ènìyàn mìíràn ni ó bá wọ́n lọ àti ọ̀pọ̀lọpọ̀ ẹran ọ̀sìn, agbo àgùntàn àti agbo màlúù.
Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ.
39 Pẹ̀lú ìyẹ̀fun tí kò ní ìwúkàrà nínú tí wọ́n gbé jáde láti Ejibiti wá ni wọ́n fi ṣe àkàrà aláìwú. Ìyẹ̀fun náà kò ni ìwúkàrà nínú nítorí a lé wọn jáde láti ilẹ̀ Ejibiti wọn kò si rí ààyè láti tọ́jú oúnjẹ fún ara wọn.
Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri.
40 Iye ọdún ti àwọn ará Israẹli gbé ní ilẹ̀ Ejibiti jẹ́ irinwó ọdún ó lé ọgbọ̀n.
Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ.
41 Ó sì ní òpin irinwó ọdún ó le ọgbọ̀n, ní ọjọ́ náà gan an, ni ó sì ṣe tí gbogbo ogun Olúwa jáde kúrò ní ilẹ̀ Ejibiti.
Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị Onyenwe anyị niile hapụrụ Ijipt.
42 Nítorí pé, Olúwa ṣe àìsùn ni òru ọjọ́ náà láti mú wọn jáde kúrò ní ilẹ̀ Ejibiti, ní òru yìí ni gbogbo Israẹli ní láti máa ṣe àìsùn láti fi bu ọlá fún Olúwa títí di àwọn ìran tí ń bọ̀.
Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ Onyenwe anyị nʼọgbọ ha niile.
43 Olúwa sọ fún Mose àti Aaroni pé, “Ìwọ̀n yìí ni àwọn òfin fún àjọ ìrékọjá: “Àjèjì kò gbọdọ̀ jẹ nínú rẹ̀.
Onyenwe anyị kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga: “Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ.
44 Ẹrú tí ẹ̀yin bá rà lè jẹ́ nínú rẹ̀ lẹ́yìn tí ẹ̀yin bá ti kọ ọ́ ní ilà,
Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu.
45 ṣùgbọ́n àtìpó àti alágbàṣe kò ni jẹ nínú rẹ̀.
Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya.
46 “Nínú ilé ni ẹ ti gbọdọ̀ jẹ ẹ́; ẹ kò gbọdọ̀ mú èyíkéyìí nínú ẹran náà jáde kúrò nínú ilé. Ẹ má ṣe ṣẹ́ ọ̀kankan nínú egungun rẹ̀.
“A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ.
47 Gbogbo àjọ Israẹli ni ó gbọdọ̀ ṣe àjọyọ̀ ọ rẹ̀.
Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a.
48 “Àjèjì ti ó bá ń gbé ní àárín yín ti ó bá fẹ́ kópa nínú àjọ ìrékọjá Olúwa, ni o gbọdọ̀ kọ gbogbo àwọn ọmọkùnrin ilé rẹ̀ ní ilà; ní ìgbà náà ni ó lè kó ipa gẹ́gẹ́ bí àwọn ọmọ tí a bí ní ilẹ̀ náà. Gbogbo àwọn ọmọkùnrin tí a kò bá kọ ní ilà, wọ́n kò ni jẹ nínú rẹ̀.
“Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ.
49 Òfin yìí kan náà ni ó mú àwọn ọmọ tí a bí ni ilẹ̀ náà àti àwọn àlejò tí ń gbé ní àárín yín.”
Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.”
50 Gbogbo àwọn ọmọ Israẹli ṣe gẹ́gẹ́ bí Olúwa ti pàṣẹ fún Mose àti Aaroni.
Ụmụ Izrel mere ihe ndị a niile, dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu site nʼọnụ Mosis na Erọn.
51 Àti pé ní ọjọ́ náà gan an ni Olúwa mú àwọn ọmọ Israẹli jáde kúrò ní ilẹ̀ Ejibiti gẹ́gẹ́ bí ìpín ìpín wọn.
Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị sitere nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel, dịka usuu ha niile si dị.

< Exodus 12 >