< 2 Corinthians 3 >
1 Àwa ha tún bẹ̀rẹ̀ láti máa yín ara wá bí? Tàbí àwa ha ń fẹ́ ìwé ìyìn sọ́dọ̀ yín, tàbí láti ọ̀dọ̀ yín gẹ́gẹ́ bí ẹlòmíràn tí ń ṣe?
Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme?
2 Ẹ̀yin fúnra yín ni ìwé ìyìn wa, tí a ti kọ sí yín ní ọkàn, ti gbogbo ènìyàn mọ̀, tí wọ́n sì ń kà.
Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị nke e dere nʼobi anyị nke mmadụ niile maara ma gụọkwa.
3 Ẹ̀yin sì ń fihàn pé ìwé tí a gbà sílẹ̀ láti ọ̀dọ̀ Kristi ni yín, kì í ṣe èyí tí a sì fi jẹ́lú kọ, bí kò sẹ Ẹ̀mí Ọlọ́run alààyè, kì í ṣe nínú wàláà òkúta bí kò ṣe nínú wàláà ọkàn ẹran.
Unu na-egosikwa na unu bụ akwụkwọ ozi si nʼebe Kraịst nọ, mpụta ihe nke ozi anyị jere. Ọ bụghị ihe e ji inki dee na mbadamba nkume, kama ọ bụ mmụọ Chineke na-adị ndụ ka e ji dee ya na mbadamba obi mmadụ.
4 Irú ìgbẹ́kẹ̀lé yìí ni àwa ní nípasẹ̀ Kristi sọ́dọ̀ Ọlọ́run,
Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ.
5 kì í ṣe pé àwa tó fún ara wa láti ṣírò ohunkóhun bí ẹni pé láti ọ̀dọ̀ àwa tìkára wa; ṣùgbọ́n láti ọ̀dọ̀ Ọlọ́run ní tító wà,
Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke.
6 Ẹni tí ó mú wa yẹ bí ìránṣẹ́ májẹ̀mú tuntun; kì í ṣe ní ti ìwé àkọsílẹ̀ ṣùgbọ́n ní ti ẹ̀mí, nítorí ìwé a máa pa ni, ṣùgbọ́n ẹ̀mí a máa sọ ní di ààyè.
Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ.
7 Ṣùgbọ́n bí iṣẹ́ ìránṣẹ́ tí ikú, tí a tí kọ tí a sì ti gbẹ́ sí ara òkúta bá jẹ́ ológo tó bẹ́ẹ̀ tí àwọn ọmọ Israẹli kò lè tẹjúmọ́ wíwo ojú Mose nítorí ògo ojú rẹ̀ (ògo ti ń kọjá lọ);
Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga,
8 yóò ha ti rí tí iṣẹ́ ìránṣẹ́ ti ẹ̀mí kì yóò kúkú jẹ́ ògo jù?
ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa?
9 Nítorí pé bi iṣẹ́ ìránṣẹ́ ìdálẹ́bi bá jẹ́ ológo, mélòó mélòó ni iṣẹ́ ìránṣẹ́ òdodo yóò tayọ jù ú ní ògo.
Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya.
10 Nítorí, èyí tí a tí ṣe lógo rí, kó lógo mọ́ báyìí, nítorí ògo tí ó tayọ.
Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya.
11 Nítorí pé bí èyí ti ń kọjá lọ bá lógo, mélòó mélòó ni èyí tí ó dúró kí yóò ní ògo!
Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.
12 Ǹjẹ́ nítorí náà bí a tí ní irú ìrètí bí èyí, àwa ń fi ìgboyà púpọ̀ sọ̀rọ̀.
Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla.
13 Kì í sì í ṣe bí Mose, ẹni tí ó fi ìbòjú bo ojú rẹ̀, ki àwọn ọmọ Israẹli má ba à lè tẹjúmọ́ wíwo òpin èyí tí ń kọjá lọ.
Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe.
14 Ṣùgbọ́n ojú inú wọn fọ́; nítorí pé títí fi di òní olónìí nípa kíka májẹ̀mú láéláé, ìbòjú kan náà ṣì wà láìká kúrò; nítorí pé nínú Kristi ni a tí lè mú ìbòjú náà kúrò.
Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ.
15 Ṣùgbọ́n títí di òní olónìí, nígbàkígbà ti a bá ń ka Mose, ìbòjú náà ń bẹ lọ́kàn wọn.
Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha.
16 Ṣùgbọ́n nígbà ti òun bá yípadà sí Olúwa, a ó mú ìbòjú náà kúrò.
Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ.
17 Ǹjẹ́ Olúwa ni Ẹ̀mí náà: níbi tí Ẹ̀mí Olúwa bá sì wà, níbẹ̀ ni òmìnira gbé wà.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.
18 Ṣùgbọ́n gbogbo wa ń wo ògo Olúwa láìsí ìbòjú bí ẹni pé nínú àwòjìji, a sì ń pa wa dà sí àwòrán kan náà láti ògo dé ògo, àní bí láti ọ̀dọ̀ Olúwa tí í ṣe Ẹ̀mí.
Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.