< 2 Chronicles 4 >

1 Ó ṣe pẹpẹ idẹ, ogún ìgbọ̀nwọ́ ní gígùn, ogún ìgbọ̀nwọ́ ní fífẹ̀ àti ìgbọ̀nwọ́ mẹ́wàá fún gíga.
Solomọn wukwara ebe ịchụ aja bronz. Ogologo ya ruru iri mita na ọkara. Obosara ya rukwara iri mita na ọkara; ma ịdị elu ya dị mita ise na ụma atọ.
2 Ó ṣe agbada dídà ńlá tí ó rí róbótó tí ìwọ̀n rẹ̀ jẹ́ ìgbọ̀nwọ́ mẹ́wàá láti etí kan dé etí èkejì ìgbọ̀nwọ́ márùn-ún sì ni gíga rẹ̀.
O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe nke ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.
3 Lábẹ́ etí, àwòrán àwọn akọ màlúù yíká mẹ́wàá sí ìgbọ̀nwọ́ kan. Àwọn akọ màlúù náà ni á dá ní ọ̀nà méjì ní àwòrán kan pẹ̀lú okùn.
Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ụmụ oke ehi gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ehi ndị ahụ dị nʼahịrị abụọ. A wụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.
4 Okùn náà dúró lórí akọ màlúù méjìlá, mẹ́ta kọjú sí àríwá, mẹ́ta kọjú sí ìwọ̀-oòrùn, mẹ́ta kọjú sí gúúsù mẹ́ta kọjú sí ìlà-oòrùn. Òkun náà sì sinmi lórí wọn àti gbogbo ìhà ẹ̀yìn wọn sì wà ní apá àárín.
E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.
5 Ó nípọn tó ìbú àtẹ́lẹwọ́, etí rẹ̀ sì dàbí etí ife ìmumi, bí i ìtànná lílì ó sì dá ìwọ̀n ẹgbẹ̀rún mẹ́ta bati dúró.
Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na asatọ.
6 Ó ṣe ọpọ́n mẹ́wàá fún fífọ nǹkan, ó sì gbé márùn-ún ka ìhà gúúsù àti márùn-ún ní àríwá. Nínú wọn ni ó ti ń fọ àwọn nǹkan tí wọ́n ń lò fún ẹbọ sísun ṣùgbọ́n, àwọn àlùfáà ní ó ń lo Òkun fún fífọ nǹkan.
A kpụkwara efere ukwu iri nke e ji asacha ihe e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ise nʼime ha dị nʼakụkụ ndịda olulu mmiri ahụ, ise nʼakụkụ ugwu. Ndị nchụaja na-esite naanị na olulu mmiri ahụ ekuru mmiri ha ji asacha ihe.
7 Ó ṣe ìgbé fìtílà dúró mẹ́wàá ti wúrà gẹ́gẹ́ bí èyí tí a yàn fún wọn. A sì gbé wọn kalẹ̀ sínú ilé Olúwa márùn un ní ìhà gúúsù àti márùn-ún ní ìhà àríwá.
Ọ kpụrụ ihe ịdọba oriọna ọlaedo iri nʼusoro dịka Chineke nyere ya nʼiwu. O debere ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda ụlọ ahụ, ise nʼakụkụ nke ugwu.
8 Ó ṣé tábìlì mẹ́wàá, ó sì gbé wọn sí inú ilé Olúwa, márùn un ní gúúsù àti márùn-ún ní ìhà àríwá. Ó ṣé ọgọ́rùn-ún ọpọ́n ìbùwọ́n wúrà.
O mekwara tebul iri dọnye nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda, ise nʼakụkụ ugwu. Ọ kpụkwara otu narị efere ọlaedo maka ịkwọsa mmiri.
9 Ó ṣe àgbàlá àwọn àlùfáà àti ààfin ńlá àti àwọn ìlẹ̀kùn fún ààfin, ó sì tẹ́ àwọn ìlẹ̀kùn náà pẹ̀lú idẹ.
Ọ mere ogige ndị nchụaja, mekwa otu ogige ukwuu, na ibo ọnụ ụzọ maka itinye nʼogige ahụ. O jiri bronz machie ibo ọnụ ụzọ ndị ahụ.
10 Ó gbé Òkun náà ka orí ìhà gúúsù ní ẹ̀bá igun gúúsù àríwá.
Oke osimiri ahụ ka ọ dọbara nʼakụkụ ndịda, na ncherita ihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ.
11 Huramu ṣe àwọn ìkòkò pẹ̀lú, àti ọkọ́ àti àwọn ọpọ́n ìbùwọ́n. Bẹ́ẹ̀ ni Huramu parí iṣẹ́ tí ó ti dáwọ́lé fún ọba Solomoni ní ilé Ọlọ́run.
Huram kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ dị nʼụlọnsọ Chineke, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.
12 Àwọn ọ̀wọ́n méjì; ọpọ́n méjì ìparí tí ó wà lókè àwọn ọ̀wọ́n iṣẹ́; àwọn méjì ní láti bo ọpọ́n méjì ìparí tí ń bẹ lókè àwọn ọ̀wọ́n;
Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; Ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma;
13 irinwó pomegiranate fún iṣẹ́ ẹ̀wọ̀n méjì náà, ẹsẹ̀ méjì pomegiranate ni fún iṣẹ́ ẹ̀wọ̀n kan, láti bo ọpọ́n rìbìtì méjì náà tí ó wà lórí àwọn òpó náà;
narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma;
14 ó sì ṣe àgbéró ó sì ṣe agbada sí orí wọn;
ihe ndọkwasị na efere ịsa mmiri ha,
15 agbada ńlá kan àti màlúù méjìlá lábẹ́ rẹ̀;
na Oke osimiri ahụ na ehi iri na abụọ ahụ dị ya nʼokpuru,
16 àwọn ìkòkò àti ọ̀kọ̀ àti àmúga ẹran àti gbogbo ohun èlò tí ó fi ara pẹ́ ẹ. Gbogbo ohun èlò ti Huramu-Abi fi idẹ dídán ṣe fún Solomoni ọba, fún ilé Olúwa jẹ́ idẹ dídán.
na ite niile, shọvel niile, ihe ịgụrụ anụ niile na ihe ngwongwo ndị ọzọ ya na ha so. Ihe niile nke Huram-Abi mere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz e hichaziri nke ọma.
17 Ọba dà wọ́n ní ilẹ̀ amọ̀ ní pẹ̀tẹ́lẹ̀ Jordani ní àárín méjì Sukkoti àti Sereda.
Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan, ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
18 Gbogbo nǹkan wọ̀nyí tí Solomoni ṣe ní iye lórí púpọ̀ tí a kò le mọ ìwọ̀n iye idẹ tí ó wọ́n.
Ihe ndị a niile nke Solomọn mere dị ukwuu nke ukwu; nke bụ na-enweghị ike ịgụkọta ihe ịdị arọ nke bronz ahụ bụ.
19 Solomoni pẹ̀lú ṣe gbogbo ohun èlò tí ó wà ní ilé Ọlọ́run: pẹpẹ wúrà tábìlì èyí tí àkàrà ìfihàn wà lórí rẹ̀;
Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Chineke, ya bụ, ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, na tebul niile nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
20 àwọn ọ̀pá fìtílà tí a fi ojúlówó wúrà ṣe pẹ̀lú fìtílà wọn kí wọn lè máa jó gẹ́gẹ́ bí àṣẹ ní iwájú ibi mímọ́ jùlọ gẹ́gẹ́ bí a ṣe fi lélẹ̀;
ihe ịdọkwasị oriọna niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, ha na oriọna ha niile, ka ọ na-enwu nʼihu ime ime ebe nsọ, dịka e nyere nʼiwu,
21 pẹ̀lú ìtànná wúrà àti fìtílà àti ẹ̀mú ni ó jẹ́ kìkìdá wúrà tí ó gbópọn;
ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile na ihe ịgụta ihe niile. E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ha niile.
22 pẹ̀lú ọ̀pá fìtílà, àti àwokòtò àti ṣíbí àti àwokòtò tùràrí àti àwọn ìlẹ̀kùn wúrà ti inú tẹmpili, àwọn ìlẹ̀kùn ibi mímọ́ sí Ibi Mímọ́ Jùlọ àti àwọn ìlẹ̀kùn à bá wọ inú gbọ̀ngàn ńlá.
Ọ kpụkwara ihe ịkpakepụ ọkụ niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji niile, na ihe ịgụ ọkụ niile, na ibo ọlaedo niile nke ụlọnsọ, ya bụ, ibo ọnụ ụzọ ime ime niile nke dịrị Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na ibo ndị dị nʼọnụ ụlọ ezumezu.

< 2 Chronicles 4 >