< 1 Kings 6 >
1 Ní ìgbà tí ó pe ọ̀rìnlénírinwó ọdún lẹ́yìn ìgbà tí àwọn ọmọ Israẹli ti jáde kúrò ní ilẹ̀ Ejibiti, ní ọdún kẹrin ìjọba Solomoni lórí Israẹli, ní oṣù Sifi, tí ń ṣe oṣù kejì, ó sì bẹ̀rẹ̀ sí kọ́ ilé Olúwa.
Solomọn bidoro iwu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ nʼọnwa Zif, bụ ọnwa nke abụọ nʼafọ nke anọ nke ịbụ eze ya. Ọ bụkwa nʼafọ nke mere ya narị afọ anọ na iri afọ asatọ site nʼoge ndị Izrel si nʼala Ijipt pụta.
2 Ilé náà tí Solomoni ọba kọ́ fún Olúwa sì jẹ́ ọgọ́ta ìgbọ̀nwọ́ ní gígùn, ogún ìgbọ̀nwọ́ ní ìbú àti ọgbọ̀n ìgbọ̀nwọ́ ní gíga.
Ụlọnsọ nke eze Solomọn wuuru Onyenwe anyị dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara, ebe ịla elu ya dịkwa mita iri na anọ.
3 Ìloro níwájú tẹmpili ilé náà, ogún ìgbọ̀nwọ́ ní gígùn rẹ̀, ìbú ilé náà, ìgbọ̀nwọ́ mẹ́wàá láti iwájú ilé náà.
Mpụta ọnụ ụlọ nke dị nʼihu ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ahụ dị mita itoolu nʼogologo nke gbakwunyere ihe nʼobosara ụlọnsọ ahụ, dịrịkwa mita anọ na ọkara nʼobosara ya.
4 Ó sì ṣe fèrèsé tí kò fẹ̀ fún ilé náà.
O meere ụlọnsọ ahụ oghereikuku kpara nkpa nʼime ma saa mbara nʼezi, nʼebe elu elu mgbidi ụlọ ahụ.
5 Lára ògiri ilé náà ni ó bu yàrá yíká; àti tẹmpili àti ibi mímọ́ jùlọ ni ó sì ṣe yàrá yíká.
Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu.
6 Yàrá ìsàlẹ̀ sì jẹ́ ìgbọ̀nwọ́ márùn-ún ní ìbú, ti àárín sì jẹ́ ìgbọ̀nwọ́ mẹ́fà ní ìbú, àti ẹ̀kẹta ìgbọ̀nwọ́ méje sì ni ìbú rẹ̀. Nítorí lóde ilé náà ni ó dín ìgbọ̀nwọ́ kọ̀ọ̀kan káàkiri, kí igi àjà kí ó má ba à wọ inú ògiri ilé náà.
Obosara okpukpu ụlọ nke dịkarịsịrị ala bụ mita abụọ na ọkara, obosara okpukpu nke ụlọ etiti dị mita atọ, otu a kwa, obosara okpukpu ụlọ nke atọ dị mita atọ na ọkara. Mgbe e wuru mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu, e wukwara ihe dịka aka nʼakụkụ mgbidi ahụ niile. Ọ bụ nʼelu ihe ndị a dịka aka ka e dokwasịrị osisi e ji wuo ọnụụlọ nta ndị ahụ. Nʼụzọ dị otu a, ka e ji gbochie ịmanye ihe ọbụla nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
7 Ní kíkọ́ ilé náà, òkúta tí a ti gbẹ́ sílẹ̀ kí a tó mú un wá ibẹ̀ nìkan ni a lò, a kò sì gbúròó òòlù tàbí àáké tàbí ohun èlò irin kan nígbà tí a ń kọ́ ọ lọ́wọ́.
Mgbe a na-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ bụ naanị nkume awara nke ọma nʼebe a nọ gwupụta ha ka eji wuo ya. O nweghị onye nụrụ ụzụ itipịa nkume, maọbụ ụzụ ịwa osisi, maọbụ ụdị mkpọtụ ahụ ngwa ọrụ mkpirisi igwe na-eme, nʼebe a nọ wuo ụlọnsọ ukwu ahụ, mgbe a na-ewu ya.
8 Ẹnu-ọ̀nà yàrá ìsàlẹ̀ sì wà ní ìhà gúúsù ilé náà; wọ́n sì fi àtẹ̀gùn tí ó lórí gòkè sínú yàrá àárín, àti láti yàrá àárín bọ́ sínú ẹ̀kẹta.
Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ.
9 Bẹ́ẹ̀ ni ó kọ́ ilé náà, ó sì parí rẹ̀, ó sì bo ilé náà pẹ̀lú àwọn ìtí igi àti pákó kedari.
Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ.
10 Ó sì kọ́ yàrá ẹ̀gbẹ́ sí gbogbo ilé náà. Gígùn ọ̀kọ̀ọ̀kan sì jẹ́ ìgbọ̀nwọ́ márùn-ún, ó sì so wọ́n mọ́ ilé náà pẹ̀lú ìtì igi kedari.
O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.
11 Ọ̀rọ̀ Olúwa sì tọ Solomoni wá wí pé,
Okwu Onyenwe anyị rutere Solomọn ntị,
12 “Ní ti ilé yìí tí ìwọ ń kọ́ lọ́wọ́, bí ìwọ bá tẹ̀lé àṣẹ mi, tí ìwọ sì ṣe ìdájọ́ mi, tí o sì pa òfin mi mọ́ láti máa ṣe wọ́n, Èmi yóò mú ìlérí tí mo ti ṣe fún Dafidi baba rẹ̀ ṣẹ nípa rẹ̀.
“Banyere ụlọnsọ ukwu a i na-ewu, ọ bụrụ na i mee ihe m gwara gị, gbasoo ihe niile m nyere gị nʼiwu, ma mezuo okwu m niile, aga m esite na gị mezuo nkwa ahụ m kwere nna gị Devid.
13 Èmi yóò sì máa gbé àárín àwọn ọmọ Israẹli, èmi kì ó sì kọ Israẹli ènìyàn mi.”
Aga m ebikwa nʼetiti ndị Izrel, agaghị m ahapụkwa ndị m, Izrel.”
14 Bẹ́ẹ̀ ni Solomoni kọ́ ilé náà, ó sì parí rẹ̀.
Emesịa, Solomọn wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ.
15 Ó sì fi pákó kedari tẹ́ ògiri ilé náà nínú, láti ilẹ̀ ilé náà dé àjà rẹ̀, ó fi igi bò wọ́n nínú, ó sì fi pákó firi tẹ́ ilẹ̀ ilé náà.
O ji osisi sida dị obosara machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ site nʼakụkụ ala ruo nʼelu ya. E jikwa osisi junipa machie ala ụlọ ahụ niile.
16 Ó pín ogún ìgbọ̀nwọ́ sí ẹ̀yìn ilé náà, láti ilẹ̀ dé àjà ilé ni ó fi pákó kedari kọ́, èyí ni ó kọ sínú, fún ibi tí a yà sí mímọ́ àní Ibi Mímọ́ Jùlọ.
O ji osisi sida kewapụta ihe ruru mita itoolu nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, site nʼala ụlọ ahụ ruo nʼelu, nʼihi iwepụta site nʼụlọnsọ ahụ, ime ime ebe nsọ, nke bụ Ebe Kachasị Nsọ.
17 Ní iwájú ilé náà, ogójì ìgbọ̀nwọ́ ni gígùn rẹ̀ jẹ́.
Ụlọ ezumezu nke dị nʼihu ọnụụlọ a dị iri mita na asatọ.
18 Inú ilé náà sì jẹ́ kedari, wọ́n ṣe iṣẹ́ ọnà rẹ̀ pẹ̀lú ìrudí àti ìtànná. Gbogbo rẹ̀ sì jẹ́ kedari; a kò sì rí òkúta kan níbẹ̀.
Ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ bụ osisi sida, nke a tụrụ ihe ọtụtụ nke oyiyi afụfa ọhịa na okoko osisi wasara awasa nʼelu ya. Ihe niile dị nʼime ụlọ ahụ bụ osisi sida, adịghị ahụ nkume ọbụla anya.
19 Ó sì múra ibi mímọ́ jùlọ sílẹ̀ nínú ilé náà láti gbé àpótí ẹ̀rí Olúwa ka ibẹ̀.
Ọ kwadokwara ebe nsọ ahụ, ebe dị nʼime ime ụlọ ahụ, maka idebe igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼebe ahụ.
20 Inú ibi mímọ́ náà sì jẹ́ ogún ìgbọ̀nwọ́ ní gígùn, ogún ìgbọ̀nwọ́ ní ìbú, àti ogún ìgbọ̀nwọ́ ní gíga. Ó sì fi kìkì wúrà bo inú rẹ̀ ó sì fi igi kedari bo pẹpẹ rẹ̀.
Ime ime ebe nsọ ahụ, dị mita iri nʼogologo, obosara ya dịkwa mita iri, ịdị elu ya dịkwa mita iri. O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọ a niile, jiri osisi sida machie ebe nchụaja ya.
21 Solomoni sì fi kìkì wúrà bo inú ilé náà, ó sì tan ẹ̀wọ̀n wúrà dé ojú ibi mímọ́ jùlọ, ó sì fi wúrà bò ó.
Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie.
22 Gbogbo ilé náà ni ó fi wúrà bò títí ó fi parí gbogbo ilé náà, àti gbogbo pẹpẹ tí ó wà níhà ibi mímọ́ jùlọ, ni ó fi wúrà bò.
Ya mere, o ji ọlaedo machie ime ya niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụ aja nke dịịrị ime ime ebe nsọ ahụ.
23 Ní inú ibi mímọ́ jùlọ ni ó fi igi olifi ṣe kérúbù méjì, ọ̀kọ̀ọ̀kan jẹ́ ìgbọ̀nwọ́ mẹ́wàá ní gíga.
O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise.
24 Apá kérúbù kìn-ín-ní sì jẹ́ ìgbọ̀nwọ́ márùn-ún ní gíga, àti apá kérúbù kejì ìgbọ̀nwọ́ márùn-ún; ìgbọ̀nwọ́ mẹ́wàá láti ṣóńṣó apá kan dé ṣóńṣó apá kejì.
Cherub nke mbụ nwere nku abụọ, otu nku dị mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, nku nke ọzọ dịkwa mita abụọ na ụma atọ nʼogologo. Ya bụ, mita ise site na ụma isii, site nʼọnụ otu nku ruo nʼọnụ nku nke ọzọ.
25 Ìgbọ̀nwọ́ mẹ́wàá sì ni kérúbù kejì pẹ̀lú, nítorí kérúbù méjèèjì jọ ara wọn ní ìwọ̀n ní títóbi àti títẹ̀wọ̀n bákan náà.
Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu.
26 Gíga kérúbù kọ̀ọ̀kan jẹ́ ìgbọ̀nwọ́ mẹ́wàá.
Ịdị elu nke cherub ọbụla ruru mita ise na ụma isii.
27 Ó sì gbé àwọn kérúbù náà sínú ilé ti inú lọ́hùn ún, pẹ̀lú ìyẹ́ apá wọn ní nínà jáde. Ìyẹ́ apá kérúbù kan sì kan ògiri kan, nígbà tí ìyẹ́ apá èkejì sì kan ògiri kejì, ìyẹ́ apá wọn sì kan ara wọn láàrín yàrá náà.
O tinyere cherubim ndị a nke gbasapụrụ nku ha nʼime ime Ebe Nsọ Kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu. Ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ otu akụkụ ahụ ụlọ ahụ, ebe ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ na nke ibe ya nʼetiti ọnụụlọ ahụ.
28 Ó sì fi wúrà bo àwọn kérúbù náà.
O jiri ọlaedo machie cherubim ndị ahụ.
29 Lára àwọn ògiri tí ó yí ilé náà ká, nínú àti lóde, ó sì ya àwòrán àwọn kérúbù sí i àti ti igi ọ̀pẹ, àti ti ìtànná ewéko.
Nʼahụ aja ụlọnsọ ukwu ahụ gbaa gburugburu, ma nʼime ọnụụlọ nke dị nʼime na ndị dị na mpụta, ka ọ pịkwasịrị oyiyi cherubim, osisi nkwụ na okoko osisi wara awa.
30 Ó sì tún fi wúrà tẹ́ ilẹ̀ ilé náà nínú àti lóde.
O jikwa ọlaedo machie ala ụlọ nke ọnụụlọ niile dị nʼime ụlọ, na ọnụụlọ ndị dị na mpụta ụlọnsọ ukwu ahụ.
31 Nítorí ojú ọ̀nà ibi mímọ́ jùlọ ni ó ṣe ìlẹ̀kùn igi olifi sí pẹ̀lú àtẹ́rígbà àti òpó ìhà jẹ́ ìdámárùn-ún ògiri.
O ji osisi oliv mee ibo ọnụ ụzọ mbata nke ime ime ebe nsọ ahụ, osisi ndị a bụ otu ụzọ nʼụzọ ise nke obosara ebe nsọ ahụ.
32 Àti lára ìlẹ̀kùn igi olifi náà ni ó ya àwòrán àwọn kérúbù, igi ọ̀pẹ àti ti ìtànná ewéko sí, ó sì fi wúrà bò wọ́n, ó sì tan wúrà sí ara àwọn kérúbù àti sí ara igi ọ̀pẹ.
Nʼahụ ibo abụọ ahụ nke si nʼosisi oliv, ọ tụnyere oyiyi cherubim abụọ, igu nkwụ na okoko osisi wara awa. O ji ọlaedo etipịara etipịa machie oyiyi cherubim na igu nkwụ ndị ahụ.
33 Bẹ́ẹ̀ ni ó sì ṣe òpó igi olifi onígun mẹ́rin fún ìlẹ̀kùn ilé náà.
Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ.
34 Ó sì tún fi igi firi ṣe ìlẹ̀kùn méjì, ọ̀kọ̀ọ̀kan wọn sì ní ewé méjì tí ó yí sí ihò ìtẹ̀bọ̀.
O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu.
35 Ó sì ya àwòrán kérúbù, àti ti igi ọ̀pẹ àti ti ìtànná ewéko sí ara wọn, ó sì fi wúrà bò ó, èyí tí ó tẹ́ sórí ibi tí ó gbẹ́.
Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha.
36 Ó sì fi ẹsẹẹsẹ òkúta mẹ́ta gbígbẹ, àti ẹsẹ̀ kan ìtí kedari kọ́ àgbàlá ti inú lọ́hùn ún.
O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.
37 Ní ọdún kẹrin ni a fi ìpìlẹ̀ ilé Olúwa lé ilẹ̀, ní oṣù Sifi.
Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
38 Ní ọdún kọkànlá ní oṣù Bulu, oṣù kẹjọ, a sì parí ilé náà jálẹ̀ jálẹ̀, pẹ̀lú gbogbo ìpín rẹ̀, gẹ́gẹ́ bí gbogbo èyí tí ó yẹ. Ó sì lo ọdún méje ní kíkọ́ ilé náà.
Ọ bụ nʼime afọ iri na otu, nʼọnwa Bul, ya bụ ọnwa nke asatọ, ka e wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼihe niile ya dịka ntụziaka e nyere si dị. Ọ bụ afọ asaa ka o weere ya i ji rụchaa ụlọnsọ ukwu ahụ.