< 1 Kings 18 >

1 Ó sì ṣe, lẹ́yìn ọjọ́ púpọ̀, ní ọdún kẹta, ọ̀rọ̀ Olúwa sì tọ Elijah wá pé, “Lọ, kí o sì fi ara rẹ̀ hàn fún Ahabu, èmi yóò sì rọ òjò sórí ilẹ̀.”
Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nʼafọ nke atọ, okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, “Bilie, gaa gosi Ehab onwe gị. Aga m emekwa ka mmiri zookwa nʼala a.”
2 Bẹ́ẹ̀ ni Elijah lọ fi ara rẹ̀ han Ahabu. Ìyàn ńlá sì mú ní Samaria,
Ya mere, Ịlaịja pụrụ gaa igosi Ehab onwe ya. Ma ụnwụ dị na Sameria nʼoge a siri nnọọ ike.
3 Ahabu sì ti pe Obadiah, ẹni tí ń ṣe olórí ilé rẹ̀. Obadiah sì bẹ̀rù Olúwa gidigidi.
O nwere otu nwoke na-elekọta ihe dị nʼezinaụlọ Ehab. Aha ya bụ Ọbadaya. (Ọ bụ nwoke ji obi ya niile kwere na Onyenwe anyị.
4 Nígbà tí Jesebeli sì ń pa àwọn wòlíì Olúwa kúrò, Obadiah sì mú ọgọ́rùn-ún wòlíì, ó sì fi wọ́n pamọ́ sínú ihò òkúta, àádọ́ta ní ihò kọ̀ọ̀kan, ó sì fi àkàrà pẹ̀lú omi bọ́ wọn.
Mgbe eze nwanyị bụ Jezebel na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.)
5 Ahabu sì ti wí fún Obadiah pé, “Lọ sí gbogbo ilẹ̀ sí orísun omi gbogbo àti sí ilẹ̀ gbogbo. Bóyá àwa lè rí koríko láti gba àwọn ẹṣin àti àwọn ìbáaka là, kí a má bá à ṣòfò àwọn ẹranko pátápátá.”
Ehab kpọrọ Ọbadaya sị ya, “Jegharịa nʼala a niile nyochapụta na ndagwurugwu na isi iyi niile, ebe ahịhịa ndụ dị. Gbutere ịnyịnya na ịnyịnya muul m ahịhịa ahụ ka ha taa ghara ịnwụ, ka anyị gharakwa igbu ha.”
6 Bẹ́ẹ̀ ni wọ́n sì pín ilẹ̀ tí wọ́n fẹ́ dé láàrín ara wọn, Ahabu gba ọ̀nà kan lọ, Obadiah sì gba ọ̀nà mìíràn lọ.
Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ.
7 Bí Obadiah sì ti ń rìn lọ, Elijah sì pàdé rẹ̀. Obadiah sì mọ̀ ọ́n, ó dojúbolẹ̀, ó sì wí pé, “Ǹjẹ́ ìwọ ni nítòótọ́, Elijah, olúwa mi?”
Ọ dịghị anya, na mberede, Ọbadaya hụrụ Ịlaịja ka ọ na-abịa izute ya. Ọbadaya matara na ọ bụ ya. Nʼihi ya, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala sị, “Ọ bụ gị ka m hụrụ nʼezie, onyenwe m, Ịlaịja?”
8 Elijah sì dá a lóhùn pé, “Bẹ́ẹ̀ ni, lọ kí o sọ fún olúwa rẹ pé, ‘Elijah ń bẹ níhìn-ín.’”
Ịlaịja zara sị ya, “E, ọ bụ m. Ugbu a gaa gwa onyenwe gị, ‘mụ bụ Ịlaịja nọ nʼebe a.’”
9 Obadiah sì béèrè pé, “Ẹ̀ṣẹ̀ kí ni mo ha dá tí ìwọ fi ń fi ìránṣẹ́ rẹ lé Ahabu lọ́wọ́ láti pa?
Mgbe ahụ, Ọbadaya jụrụ Ịlaịja sị, “Gịnị bụ ihe m mejọrọ, nke mere i ji na-achọ inyefe ohu gị nʼaka Ehab ka o gbuo ya?
10 Mo mọ̀ dájú pé bí Olúwa Ọlọ́run rẹ ti ń bẹ, kò sí orílẹ̀-èdè tàbí ìjọba kan tí olúwa mi kò ti rán ènìyàn lọ láti wò ọ́. Àti nígbà tí orílẹ̀-èdè tàbí ìjọba kan bá wí pé o kò sí, òun a sì mú kí wọ́n búra wí pé wọn kò rí ọ.
Dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị adị ndụ, o nwebeghị mba maọbụ alaeze dị nke nna m ukwu na-ezigaghị mmadụ ịchọ gị. Ebe ọbụla ọ gara a na-akọrọ ya na Ịlaịja anọghị nʼebe ahụ. Ehab na-eme ka eze obodo ahụ ṅụọ iyi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.
11 Ṣùgbọ́n nísinsin yìí, ìwọ wí fún mi pé kí n lọ sọ́dọ̀ olúwa mi, kí n sì wí pé, ‘Elijah ń bẹ níhìn-ín.’
Ma ugbu a, ị na-asị m gaa gwa Onyenwe m na, ‘Ịlaịja nọ nʼebe a.’
12 Èmi kò sì mọ ibi tí ẹ̀mí Olúwa yóò gbé ọ lọ nígbà tí mo bá fi ọ́ sílẹ̀. Bí mo bá lọ, tí mo sì sọ fún Ahabu, tí kò sì rí ọ, òun a sì pa mí. Síbẹ̀ èmi ìránṣẹ́ rẹ bẹ̀rù Olúwa láti ìgbà èwe mi wá.
Ọ bụrụkwanụ na m esite nʼebe a pụọ, onye ma ebe Mmụọ Onyenwe anyị ga-ebuga gị. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na Ehab abịa hapụ ịhụ gị, ọ ga-egbu m. Nʼihi na mụ bụ ohu gị bụ onye na-efe Onyenwe anyị ofufe siterị na mgbe m bụ okorobịa.
13 Ṣé Olúwa mi kò ha ti gbọ́ ohun tí mo ṣe nígbà tí Jesebeli ń pa àwọn wòlíì Olúwa? Mo fi ọgọ́rùn-ún wòlíì Olúwa pamọ́ sínú ihò òkúta méjì, àràádọ́ta ní ọ̀kọ̀ọ̀kan, mo sì fi omi àti oúnjẹ bọ́ wọn.
Ọ bụ na onyenwe m anụghị ihe m mere mgbe Jezebel nọ na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị? E zoro narị ndị amụma Onyenwe anyị nʼime ọgba nkume abụọ, iri ise nʼime otu ọgba nkume, iri ise nʼime otu ọgba nkume ka m zoro ha, jirikwa nri na mmiri ọṅụṅụ zụọ ha.
14 Ìwọ sì sọ fún mi nísinsin yìí pé, kí n tọ olúwa mi lọ pé, ‘Elijah ń bẹ níhìn-ín.’ Òun a sì pa mí!”
Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!”
15 Elijah sì wí pé, “Bí Olúwa àwọn ọmọ-ogun ti wà, ẹni tí èmi ń sìn, nítòótọ́ èmi yóò fi ara mi hàn fún Ahabu lónìí.”
Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.”
16 Bẹ́ẹ̀ ni Obadiah sì lọ láti pàdé Ahabu, ó sì sọ fún un, Ahabu sì lọ láti pàdé Elijah.
Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.
17 Nígbà tí Ahabu sì rí Elijah, ó sì wí fún un pé, “Ṣé ìwọ nìyìí, ìwọ tí ń yọ Israẹli lẹ́nu?”
Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?”
18 Elijah sì dá a lóhùn pé, “Èmi kò yọ Israẹli lẹ́nu, bí kò ṣe ìwọ àti ilé baba rẹ. Ẹ ti kọ òfin Olúwa sílẹ̀, ẹ sì ń tọ Baali lẹ́yìn.
Ịlaịja zara sị Ehab, “O nweghị mgbe m ji butere Izrel nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere Izrel nsogbu. Unu agbakụtala iwu Onyenwe anyị azụ, gbasoro chi Baal dị iche iche.
19 Nísinsin yìí kó gbogbo Israẹli jọ láti pàdé mi lórí òkè Karmeli. Àti kí o sì mú àádọ́ta lé ní irinwó àwọn wòlíì Baali àti irinwó àwọn wòlíì òrìṣà Aṣerah tí wọ́n ń jẹun ní tábìlì Jesebeli.”
Ugbu a, kpọkọta ndị Izrel niile ka ha zute m nʼugwu Kamel. Kpọpụtakwa ndị amụma Baal ọnụọgụgụ ha dị narị anọ na iri mmadụ ise, na ndị amụma Ashera, ndị dị narị anọ, bụ ndị na-eso eze nwanyị Jezebel erikọ ihe na tebul ya.”
20 Bẹ́ẹ̀ ni Ahabu ránṣẹ́ sí gbogbo àwọn ọmọ Israẹli, ó sì kó àwọn wòlíì jọ sí orí òkè Karmeli.
Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel.
21 Elijah sì lọ síwájú gbogbo àwọn ènìyàn, ó sì wí pé, “Yóò ti pẹ́ tó tí ẹ̀yin yóò máa ṣiyèméjì? Bí Olúwa bá ni Ọlọ́run, ẹ máa tọ̀ ọ́ lẹ́yìn, ṣùgbọ́n bí Baali bá ni Ọlọ́run, ẹ máa tọ̀ ọ́ lẹ́yìn.” Ṣùgbọ́n àwọn ènìyàn náà kò sì wí ohun kan.
Ịlaịja gara nʼihu ndị a, sị ha, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka unu ga-akwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụrụ na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, soronụ ya! Ma ọ bụrụkwanụ na unu ekpebie na Baal bụ chi unu, soronụ ya.” Ma ndị zukọrọ nʼebe ahụ ekwughị ihe ọbụla.
22 Nígbà náà ni Elijah wí fún wọn pé, “Èmi nìkan ṣoṣo ni ó kù ní wòlíì Olúwa, ṣùgbọ́n, àádọ́ta lé ní irinwó ni wòlíì Baali.
Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma Onyenwe anyị fọdụrụ, ma ndị amụma Baal dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ.
23 Ẹ fún wa ní ẹgbọrọ akọ màlúù méjì. Jẹ́ kí wọn kí ó sì yan ẹgbọrọ akọ màlúù kan fún ara wọn, kí wọn kí ó sì gé e sí wẹ́wẹ́, kí wọn kí ó sì tò ó sí orí igi, kí wọn kí ó má ṣe fi iná sí i. Èmi yóò sì tún ẹgbọrọ akọ màlúù kejì ṣe, èmi yóò sì tò ó sórí igi, èmi kì yóò sì fi iná sí i.
Ugbu a wetanụ oke ehi abụọ ka ndị amụma Baal họrọ otu oke ehi, nke ha chọrọ. Ha ga-egbujasị ya, tụkwasị ya nʼelu nkụ dị nʼebe ịchụ aja, ma ha agaghị amụnye ọkụ ọbụla nʼokpuru ya. Mụ onwe m ga-akwado oke ehi nke ọzọ tụkwasị ya nʼelu nkụ ma agaghị m amụnyekwa ọkụ nʼokpuru ya.
24 Nígbà náà ẹ ó sì ké pe orúkọ àwọn Ọlọ́run yín, èmi yóò sì ké pe orúkọ Olúwa. Ọlọ́run náà tí ó fi iná dáhùn, òun ni Ọlọ́run.” Nígbà náà ni gbogbo àwọn ènìyàn náà sì wí pé, “Ohun tí ìwọ sọ dára.”
Emesịa, unu ga-akpọku chi Baal unu, mụ onwe m kwa ga-akpọku aha Onyenwe anyị. Ọ ga-erukwa na chi ga-eji ọkụ za, chi ahụ bụ Chineke.” Ndị Izrel niile zara sị, “Okwu gị dị mma.”
25 Elijah sì wí fún àwọn wòlíì Baali wí pé, “Ẹ yan ẹgbọrọ akọ màlúù kan fún ara yín, kí ẹ sì tètè kọ́ ṣe é, nítorí ẹ̀yin pọ̀. Ẹ ké pe orúkọ àwọn ọlọ́run yín, ṣùgbọ́n ẹ má ṣe fi iná sí i.”
Ịlaịja gwara ndị amụma Baal, sị, “Ebe unu dị ọtụtụ, burunu ụzọ họrọ otu oke ehi nʼime ehi abụọ a dozie ya. Unu amụnyekwala ya ọkụ nʼokpuru, kama kpọkuonụ chi unu.”
26 Nígbà náà ni wọ́n sì mú ẹgbọrọ akọ màlúù náà, tí a ti fi fún wọn, wọ́n sì ṣe é. Nígbà náà ni wọ́n sì ké pe orúkọ Baali láti òwúrọ̀ títí di ọ̀sán gangan wí pé, “Baali! Dá wa lóhùn!” Wọ́n sì ń kégbe. Ṣùgbọ́n kò sí ìdáhùn; kò sí ẹnìkan tí ó sì dáhùn. Wọ́n sì jó yí pẹpẹ náà ká, èyí tí wọ́n tẹ́.
Ya mere, ndị amụma Baal weere oke ehi ahụ e nyere ha doziekwa ya. Mgbe ahụ, ha kpọkuru aha Baal, chi ha. Site nʼụtụtụ tigide mkpu ruo nʼetiti ehihie na-asị “O Baal, biko, zaa anyị.” Ma o nweghị ihe ha nụrụ site nʼọnụ Baal. Ọ dịkwaghị onye zara ha. Ha malitere ite egwu gburugburu ebe ịchụ aja ahụ ha kwadoro.
27 Ní ọ̀sán gangan, Elijah bẹ̀rẹ̀ sí ń fi wọ́n ṣe ẹlẹ́yà ó sì wí pé, “Ẹ kígbe lóhùn rara Ọlọ́run sá à ni òun! Bóyá ó ń ṣe àṣàrò, tàbí kò ráyè, tàbí ó re àjò. Bóyá ó sùn, ó yẹ kí a jí i.”
Nʼihe dị ka nʼetiti ehihie, Ịlaịja malitere ịchị ha ọchị, na ịkwa ha emo. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Tisienụ mkpu ike ka Baal nwe ike ịnụ arịrịọ unu. Nʼezie, ọ bụ chi! Ma eleghị anya ọ nọ nʼoke echiche, maọbụ o ji ọrụ nʼaka, maọbụ ọ gara njem. Ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra. Ọ chọrọ onye ga-akpọte ya.”
28 Bẹ́ẹ̀ ni wọ́n sì kígbe lóhùn rara, wọ́n sì fi ọ̀bẹ àti ọ̀kọ̀ ya ara wọn gẹ́gẹ́ bí ìṣe wọn, títí tí ẹ̀jẹ̀ fi tú jáde ní ara wọn.
Ndị amụma a tiri mkpu nʼoke olu dịka ha si eme. Ha ji mma na ùbe na-egbukasị onwe ha ahụ, tutu ruo mgbe ọbara malitere isite ha nʼahụ na-agbapụta.
29 Nígbà tí ọjọ́ yẹ àtàrí, wọ́n sì ń fi òmùgọ̀ sọtẹ́lẹ̀ títí di àkókò ìrúbọ àṣálẹ́, ṣùgbọ́n kò sí ohùn, kò sì ṣí ìdáhùn, kò sì ṣí ẹni tí ó kà á sí.
Ma mgbe etiti ehihie gasịrị, ha nọgidekwara na-ebu amụma ruo mgbe oge ịchụ aja uhuruchi ruru, ma o nweghị onye zara ha, o nwekwaghị olu a nụrụ. Ọ dịkwaghị onye ṅara ha ntị.
30 Nígbà náà ni Elijah wí fún gbogbo àwọn ènìyàn náà pé, “Ẹ súnmọ́ mi.” Wọ́n sì súnmọ́ ọn, ó sì tún pẹpẹ Olúwa tí ó ti wó lulẹ̀ ṣe.
Mgbe ahụ, Ịlaịja kpọrọ ndị Izrel sị ha, “Bịaruenụ m nso.” Ha niile bịaruru ya nso, o doziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ndị ahụ a kwaturu nʼala na mbụ.
31 Elijah sì mú òkúta méjìlá, ọ̀kọ̀ọ̀kan fún ẹ̀yà ọmọ Jakọbu kan, ẹni tí ọ̀rọ̀ Olúwa tọ̀ wá wí pé, “Israẹli ni orúkọ rẹ̀ yóò máa jẹ́.”
Ịlaịja chịịrị nkume iri na abụọ, nke otu nʼime ha nọchiri anya otu ebo Jekọb, onye okwu Onyenwe anyị rutere si ya, “Aha gị ga-abụ Izrel.”
32 Ó sì tẹ́ pẹpẹ pẹ̀lú àwọn òkúta wọ̀nyí ní orúkọ Olúwa, ó sì wa yàrá yí pẹpẹ náà ká, tí ó lè gba ìwọ̀n òsùwọ̀n irúgbìn méjì.
O ji nkume ndị a wuzie ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Emesịa, o gwuru olulu miri emi, nke gbara ebe ịchụ aja ahụ gburugburu.
33 Ó sì to igi náà dáradára, ó sì ké ẹgbọrọ akọ màlúù náà wẹ́wẹ́, ó sì tò ó sórí igi. Nígbà náà ni ó sì wí fún wọn wí pé, “Ẹ fi omi kún ìkòkò mẹ́rin, kí ẹ sì tu sórí ẹbọ sísun àti sórí igi náà.”
Ọ tụkwasịrị nkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, tụkwasịkwa otu oke ehi o gbujasịrị nʼelu nkụ ndị ahụ. Emesịa, o nyere ndị nọ nʼebe ahụ iwu sị ha, “Gbajuonụ ite anọ mmiri. Butekwanụ mmiri ahụ bịa wụkwasị ya nʼelu aja nsure ọkụ a, na nʼelu nkụ ndị a.” Mgbe ha mesiri nke a, Ịlaịja gwara ha okwu sị,
34 Ó sì wí pe, “Ẹ ṣe é ní ìgbà kejì.” Wọ́n sì ṣe é ní ìgbà kejì. Ó sì tún wí pé, “Ṣe é ní ìgbà kẹta.”
“Gbajukwaanụ ite mmiri ndị ahụ, bute ha bịa wụkwasị mmiri ahụ nke ugboro abụọ nʼelu aja nsure ọkụ a.” Ha mere dịka Ịlaịja kwuru. Ịlaịja nyekwara ha iwu sị, “Gbajukwaanụ ya nke ugboro atọ, bịa wụkwasị ya.” Ha mekwara otu a.
35 Omi náà sì sàn yí pẹpẹ náà ká, ó sì fi omi kún yàrá náà pẹ̀lú.
Mmiri jupụtakwara nʼebe ịchụ aja ahụ, na olulu ahụ dị ya gburugburu.
36 Ó sì ṣe, ní ìrúbọ àṣálẹ́, wòlíì Elijah sì súnmọ́ tòsí, ó sì gbàdúrà wí pé, “Olúwa, Ọlọ́run Abrahamu, Isaaki àti Israẹli, jẹ́ kí ó di mí mọ̀ lónìí pé ìwọ ni Ọlọ́run ní Israẹli àti pé èmi ni ìránṣẹ́ rẹ, àti pé mo ṣe gbogbo nǹkan wọ̀nyí nípa àṣẹ rẹ.
Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, “O, Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Izrel, biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị Chineke nʼIzrel, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile.
37 Gbọ́ ti èmi, Olúwa, gbọ́ ti èmi, kí àwọn ènìyàn wọ̀nyí lè mọ̀ pé ìwọ Olúwa ni Ọlọ́run àti pé ìwọ tún yí ọkàn wọn padà.”
Biko, Onyenwe anyị m, zaa m ekpere m, zaa m ya, ka ndị Izrel niile mata na gị onwe gị, Onyenwe anyị bụ Chineke, na gị onwe gị na-atụgharịkwa obi ha ịlaghachikwute gị.”
38 Nígbà náà ni iná Olúwa bọ́ sílẹ̀, ó sì sun ẹbọ sísun náà àti igi, àti àwọn òkúta, àti erùpẹ̀, ó sì tún lá omi tí ń bẹ nínú yàrá náà.
Mgbe ahụ, na mberede, ọkụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe daa, rechapụ oke ehi ahụ, na nkụ ahụ, na nkume, na ntụ, ma rechapụkwa mmiri niile dị nʼime olulu ahụ dị gburugburu ebe ịchụ aja ahụ.
39 Nígbà tí gbogbo àwọn ènìyàn sì rí èyí, wọ́n da ojú wọn bolẹ̀, wọ́n sì kígbe pé, “Olúwa, òun ni Ọlọ́run! Olúwa, òun ni Ọlọ́run!”
Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “Onyenwe anyị, ya onwe ya bụ Chineke! Onyenwe anyị ya onwe ya bụ Chineke!”
40 Nígbà náà ni Elijah sì pàṣẹ fún wọn pé, “Ẹ mú àwọn wòlíì Baali. Ẹ má ṣe jẹ́ kí ọ̀kan nínú wọn kí ó sálọ!” Wọ́n sì mú wọn, Elijah sì mú wọn sọ̀kalẹ̀ sí àfonífojì Kiṣoni, ó sì pa wọ́n níbẹ̀.
Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.
41 Elijah sì wí fún Ahabu pé, “Lọ, jẹ, kí o sì mu, nítorí ìró ọ̀pọ̀lọpọ̀ òjò ń bọ̀.”
Emesịa, Ịlaịja gwara Ehab okwu sị, “Gaa rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; nʼihi na anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-ada.”
42 Bẹ́ẹ̀ ni Ahabu gòkè lọ láti jẹ àti láti mu. Ṣùgbọ́n Elijah gun orí òkè Karmeli lọ ó sì tẹríba, ó sì fi ojú rẹ̀ sí agbede-méjì eékún rẹ̀.
Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu Kamel gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere.
43 Ó sì wí fún ọmọ ọ̀dọ̀ rẹ̀ pé, “Lọ, kí o sì wo ìhà Òkun, òun sì gòkè lọ, ó sì wò.” Ó sì wí pé, “Kò sí nǹkan níbẹ̀.” Ó sì wí pé, “Tún lọ nígbà méje.”
Nʼoge a, ọ gwara nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Gaa lee anya nʼụzọ oke osimiri.” Ọ rịgoro lee anya, sị, “Ọ dịghị ihe ọbụla m hụrụ.” Ịlaịja gwakwara ya otu a, ugboro asaa, sị ya, “Jeghachi.”
44 Nígbà keje, ìránṣẹ́ náà sì wí pé, “Àwọsánmọ̀ kékeré kan dìde láti inú Òkun, gẹ́gẹ́ bí ọwọ́ ènìyàn.” Elijah sì wí pé, “Lọ, kí o sọ fún Ahabu pé, ‘Di kẹ́tẹ́kẹ́tẹ́ rẹ, kí o sì sọ̀kalẹ̀ lọ, kí òjò ó má ba à dá ọ dúró.’”
O ruo na nke ugboro asaa, nwokorobịa ahụ bịaghachiri sị Ịlaịja, “Onyenwe m, ahụrụ m igwe ojii dị nta dịka ọbụ aka mmadụ ka o si nʼoke osimiri na-apụta.” Ya mere, Ịlaịja sịrị, “Gaa gwa Ehab, ‘dozie ụgbọ agha gị, gbadaa tupu mmiri ozuzo egbochi gị ịla.’”
45 Ó sì ṣe, nígbà díẹ̀ sí i, ọ̀run sì ṣú fún àwọsánmọ̀, ìjì sì dìde, òjò púpọ̀ sì rọ̀, Ahabu sì gun kẹ̀kẹ́ lọ sí Jesreeli.
Ọ dịghị anya, eluigwe gbajikọtara nnọọ oji. Oke ifufe bidokwara ife. Mmiri dị ukwuu bidokwara izo. Mgbe ahụ, Ehab gbaara ụgbọ agha ya laa Jezril.
46 Agbára Olúwa sì ń bẹ lára Elijah; ó sì di àmùrè ẹ̀gbẹ́ rẹ, ó sì sáré níwájú Ahabu títí dé Jesreeli.
Ma ike Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaịja. Ọ fanyere ọnụ uwe mwụda ya na belịt o kere nʼukwu, gbapụ ọsọ buru Ehab ụzọ gbaruo obodo Jezril.

< 1 Kings 18 >