< 1 Kings 15 >
1 Ní ọdún kejìdínlógún ìjọba Jeroboamu ọmọ Nebati, Abijah jẹ ọba lórí Juda,
Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam nwa Nebat.
2 ó sì jẹ ọba ní ọdún mẹ́ta ní Jerusalẹmu. Orúkọ ìyá rẹ̀ sì ni Maaka, ọmọbìnrin Absalomu.
Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
3 Ó sì rìn nínú gbogbo ẹ̀ṣẹ̀ tí baba rẹ̀ ti dá ṣáájú rẹ̀; ọkàn rẹ̀ kò sì pé pẹ̀lú Olúwa Ọlọ́run rẹ̀, gẹ́gẹ́ bí ọkàn Dafidi baba ńlá rẹ̀ ti ṣe.
O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị.
4 Ṣùgbọ́n, nítorí i Dafidi Olúwa Ọlọ́run rẹ̀ fún un ní ìmọ́lẹ̀ kan ní Jerusalẹmu nípa gbígbé ọmọ rẹ̀ ró láti jẹ ọba ní ipò rẹ̀ àti láti fi ìdí Jerusalẹmu múlẹ̀.
Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike.
5 Nítorí tí Dafidi ṣe èyí tí ó dára ní ojú Olúwa, tí kò sì kùnà láti pa gbogbo èyí tí Olúwa pàṣẹ fún un mọ́ ní ọjọ́ ayé rẹ̀ gbogbo; bí kò ṣe ní kìkì ọ̀ràn Uriah ará Hiti.
Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het.
6 Ogun sì wà láàrín Rehoboamu àti Jeroboamu ní gbogbo ọjọ́ ayé Abijah.
Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija.
7 Ní ti ìyókù ìṣe Abijah, àti gbogbo èyí tí ó ṣe, a kò ha kọ wọ́n sínú ìwé ọ̀rọ̀ ọjọ́ àwọn ọba Juda? Ogun sì wà láàrín Abijah àti Jeroboamu.
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Abija, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.
8 Abijah sì sùn pẹ̀lú àwọn baba rẹ̀, a sì sin ín ní ìlú Dafidi. Asa ọmọ rẹ̀ sì jẹ ọba ní ipò rẹ̀.
Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
9 Ní ogún ọdún Jeroboamu ọba Israẹli, Asa jẹ ọba lórí Juda,
Nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị Jeroboam eze Izrel, ka Asa ghọrọ eze Juda.
10 Ó sì jẹ ọba ní Jerusalẹmu ní ọdún mọ́kànlélógójì. Orúkọ ìyá ńlá rẹ̀ sì ni Maaka, ọmọbìnrin Absalomu.
Ọ chịrị iri afọ anọ na otu na Jerusalem. Aha nne nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
11 Asa sì ṣe èyí tí ó dára lójú Olúwa, bí Dafidi baba rẹ̀ ti ṣe.
Asa mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka Devid nna ya mere.
12 Ó sì mú àwọn ọkùnrin alágbèrè ojúbọ òrìṣà kúrò ní ilẹ̀ náà, ó sì kó gbogbo ère tí àwọn baba rẹ̀ ti ṣe kúrò.
O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere.
13 Ó sì mú Maaka ìyá ńlá rẹ̀ kúrò láti máa ṣe ayaba, nítorí tí ó yá ère kan fún Aṣerah òrìṣà rẹ̀. Asa sì ké ère náà lulẹ̀, ó sì jó o ní àfonífojì Kidironi.
Ọ chụdakwara ọbụladị nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
14 Ṣùgbọ́n kò mú àwọn ibi gíga kúrò, síbẹ̀ ọkàn Asa pé pẹ̀lú Olúwa ní ọjọ́ ayé rẹ̀ gbogbo.
Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile.
15 Ó sì mú wúrà àti fàdákà àti àwọn ohun èlò tí òun àti baba rẹ̀ ti yà sí mímọ́ wọ ilé Olúwa.
O webatara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
16 Ogun sì wà láàrín Asa àti Baaṣa ọba Israẹli ní gbogbo ọjọ́ ayé wọn.
Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel ụbọchị ọchịchị ha niile.
17 Baaṣa, ọba Israẹli sì gòkè lọ sí Juda, ó sì kọ́ Rama láti má jẹ́ kí ẹnikẹ́ni jáde tàbí wọlé tọ Asa ọba lọ.
Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
18 Nígbà náà ni Asa mú gbogbo fàdákà àti wúrà tí ó kù nínú ìṣúra ilé Olúwa àti ìṣúra ilé ọba. Ó sì fi lé àwọn ìránṣẹ́ rẹ̀ lọ́wọ́, ó sì rán wọn lọ sí ọ̀dọ̀ Beni-Hadadi ọmọ Tabrimoni, ọmọ Hesioni ọba Siria tí ó ń gbé ní Damasku.
Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị,
19 Ó sì wí pé, “Jẹ́ kí májẹ̀mú kí ó wà láàrín èmi àti ìwọ, bí ó sì ti wà láàrín baba mi àti baba rẹ. Wò ó, Èmi rán ọrẹ fàdákà àti wúrà sí ọ. Ǹjẹ́ nísinsin yìí, da májẹ̀mú rẹ pẹ̀lú Baaṣa, ọba Israẹli, kí ó lè lọ kúrò lọ́dọ̀ mi.”
“Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị onyinye ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
20 Beni-Hadadi gba ti Asa ọba, ó sì rán àwọn alágbára olórí ogun rẹ̀ sí àwọn ìlú Israẹli. Ó sì ṣẹ́gun Ijoni, Dani àti Abeli-Beti-Maaka, àti gbogbo Kinnereti pẹ̀lú gbogbo ilẹ̀ Naftali.
Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ọ lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Bet-Maaka na ala Kineret niile, tinyere ala niile nke ndị Naftalị.
21 Nígbà tí Baaṣa sì gbọ́ èyí, ó sì ṣíwọ́ kíkọ́ Rama, ó sì lọ kúrò sí Tirsa.
Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, laghachi biri na Tịaza.
22 Nígbà náà ni Asa ọba kéde ká gbogbo Juda, kò dá ẹnìkan sí, wọ́n sì kó òkúta Rama kúrò àti igi rẹ̀, tí Baaṣa fi kọ́lé. Asa ọba sì fi wọ́n kọ́ Geba ti Benjamini àti Mispa.
Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa.
23 Ní ti ìyókù gbogbo ìṣe Asa, àti gbogbo agbára rẹ̀, àti gbogbo ohun tí ó ṣe, àti àwọn ìlú tí ó kọ́, a kò ha kọ wọ́n sínú ìwé ọ̀rọ̀ ọjọ́ àwọn ọba Juda? Ṣùgbọ́n, ní ìgbà ogbó rẹ̀, ààrùn ṣe é ní ẹsẹ̀ rẹ̀.
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi.
24 Asa sì sùn pẹ̀lú àwọn baba rẹ̀, a sì sin ín pẹ̀lú àwọn baba rẹ̀ ní ìlú Dafidi baba rẹ̀. Jehoṣafati ọmọ rẹ̀ sì jẹ ọba ní ipò rẹ̀.
Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
25 Nadabu ọmọ Jeroboamu sì jẹ ọba lórí Israẹli ní ọdún kejì Asa ọba Juda, ó sì jẹ ọba lórí Israẹli ní ọdún méjì.
Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ.
26 Ó sì ṣe búburú níwájú Olúwa, ó sì rìn ní ọ̀nà baba rẹ̀ àti nínú ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀, èyí tí ó mú Israẹli dá.
O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie.
27 Baaṣa ọmọ Ahijah ti ilé Isakari sì dìtẹ̀ sí i, Baaṣa sì kọlù ú ní Gibetoni, ìlú àwọn ará Filistini, nígbà tí Nadabu àti gbogbo Israẹli dó ti Gibetoni.
Baasha nwa Ahija, onye si nʼebo Isaka gbara izu ọjọọ megide ya. O tidara ya na Gibeton, nʼotu obodo ndị Filistia, mgbe Nadab na ndị Izrel niile nọchibidoro ya.
28 Baaṣa sì pa Nadabu ní ọdún kẹta Asa ọba Juda, ó sì jẹ ọba ní ipò rẹ̀.
Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda.
29 Ó sì ṣe, bí ó sì ti bẹ̀rẹ̀ sí ní jẹ ọba ó pa gbogbo ilé Jeroboamu, kò sì ku ẹnìkan tí ń mí fún Jeroboamu, ṣùgbọ́n ó run gbogbo wọn, gẹ́gẹ́ bí ọ̀rọ̀ Olúwa, tí ó sọ nípa ọwọ́ ìránṣẹ́ rẹ̀ Ahijah ará Ṣilo.
Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo.
30 Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ tí Jeroboamu ti ṣẹ̀ àti tí ó mú Israẹli ṣẹ̀, àti nítorí tí ó ti mú Olúwa Ọlọ́run Israẹli bínú.
Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel iwe.
31 Ní ti ìyókù ìṣe Nadabu àti gbogbo ohun tí ó ṣe, a kò ha kọ wọ́n sínú ìwé ọ̀rọ̀ ọjọ́ àwọn ọba Israẹli?
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel?
32 Ogun sì wà láàrín Asa àti Baaṣa ọba Israẹli ní gbogbo ọjọ́ wọn.
Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel, ụbọchị ọchịchị ha niile.
33 Ní ọdún kẹta Asa ọba Juda, Baaṣa ọmọ Ahijah sì jẹ ọba lórí gbogbo Israẹli ní Tirsa, ó sì jẹ ọba ní ọdún mẹ́rìnlélógún.
Nʼafọ nke atọ nke Asa, eze Juda, Baasha nwa Ahija ghọrọ eze ndị Izrel niile na Tịaza. Ọ chịrị iri afọ abụọ na abụọ.
34 Ó sì ṣe búburú níwájú Olúwa, ó sì rìn ní ọ̀nà Jeroboamu àti nínú ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀, èyí tí ó ti mú Israẹli ṣẹ̀.
O mere ọtụtụ ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam, jeekwa ije nʼime otu mmehie ahụ nke Jeroboam dubara ndị Izrel ime.