< 1 Chronicles 5 >

1 Ǹjẹ́ àwọn ọmọ Reubeni, àkọ́bí Israẹli. (Nítorí òun ni àkọ́bí; ṣùgbọ́n, bí ó ti ṣe pé ó ba ibùsùn baba rẹ̀ jẹ́, a fi ogún ìbí rẹ̀ fún àwọn ọmọ Josẹfu ọmọ Israẹli: a kì yóò sì ka ìtàn ìdílé náà gẹ́gẹ́ bí ipò ìbí.
Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara.
2 Nítorí Juda borí àwọn arákùnrin rẹ̀, àti lọ́dọ̀ rẹ̀ ni aláṣẹ ti ń jáde wá; ṣùgbọ́n ogún ìbí jẹ́ ti Josẹfu),
Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara.
3 àwọn ọmọ Reubeni àkọ́bí Israẹli ni: Hanoku àti Pallu, Hesroni àti Karmi.
Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a: Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.
4 Àwọn ọmọ Joẹli: Ṣemaiah ọmọ rẹ̀, Gogu ọmọ rẹ̀, Ṣimei ọmọ rẹ̀.
Juel mụrụ Shemaya, nna Gog, Gog mụrụ Shimei.
5 Mika ọmọ rẹ̀, Reaiah ọmọ rẹ̀, Baali ọmọ rẹ̀.
Shimei mụrụ Maịka, Maịka amụọ Reaya. Reaya amụọ Baal.
6 Beera ọmọ rẹ̀, tí Tiglat-Pileseri ọba Asiria kó ní ìgbèkùn lọ. Ìjòyè àwọn ọmọ Reubeni ni Beera jẹ́.
Baal mụrụ Beera, onye Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa dọtara nʼagha. Beera bụkwa onyendu ndị Ruben.
7 Àti àwọn arákùnrin rẹ̀ nípa ìdílé wọn, nígbà tí a ń ka ìtàn ìdílé ìran wọn: Jeieli àti Sekariah ni olórí,
Ndị ụmụnna ha dịka agbụrụ niile ha si dị, bụ ndị e depụtara aha ha dịka usoro ọmụmụ ha si dị; Jeiel onyeisi, na Zekaraya,
8 àti Bela ọmọ Asasi ọmọ Ṣema, ọmọ Joẹli. Wọ́n tí ń gbé Aroeri àní títí dé Nebo àti Baali-Meoni.
na Bela nwa Azaz nwa Shema, nwa Juel. Ha nwere ebe obibi ha site nʼAroea ruo nʼugwu Nebo, rukwaa Baal-Meon.
9 Àti níhà àríwá, o tẹ̀dó lọ títí dé àtiwọ aginjù láti odò Eufurate; nítorí tí ẹran ọ̀sìn wọn pọ̀ sí i ní ilẹ̀ Gileadi.
Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead.
10 Àti ní ọjọ́ Saulu, wọ́n bá àwọn ọmọ Hagari jagun, ẹni tí ó ṣubú nípa ọwọ́ wọn; wọ́n sì ń gbé inú àgọ́ wọn ní gbogbo ilẹ̀ àríwá Gileadi.
Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead.
11 Àti àwọn ọmọ Gadi ń gbé lékè wọn, ní ilẹ̀ Baṣani títí dé Saleka:
Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.
12 Joẹli jẹ́ olórí, Ṣafamu ìran ọmọ Janai, àti Ṣafati ni Baṣani.
Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat.
13 Àti àwọn arákùnrin wọn ti ilẹ̀ àwọn baba wọn ní: Mikaeli, Meṣullamu Ṣeba, Jorai, Jaka, Sia àti Eberi méje.
Ụmụnna ha, ndị bụ ndị ndu ikwu asaa a bụ, Maikel, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Eba.
14 Wọ̀nyí ni àwọn ọmọ Abihaili, ọmọ Huri, ọmọ Jeroa, ọmọ Gileadi, ọmọ Mikaeli, ọmọ Jeṣiṣai, ọmọ Jado, ọmọ Busi.
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Abihail, nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikel, nwa Jehishai, nwa Jado, nwa Buz.
15 Ahi, ọmọ Adbeeli, ọmọ Guni, olórí ilé àwọn baba wọn.
Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya.
16 Wọ́n sì ń gbé Gileadi ní Baṣani àti nínú àwọn ìlú rẹ̀, àti nínú gbogbo ìgbèríko Ṣaroni, ní agbègbè wọn.
Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.
17 Gbogbo wọ̀nyí ni a kà nípa ìtàn ìdílé, ní ọjọ́ Jotamu ọba Juda, àti ní ọjọ́ Jeroboamu ọba Israẹli.
E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.
18 Àwọn ọmọ Reubeni, àti àwọn ọmọ Gadi, àti ààbọ̀ ẹ̀yà Manase, nínú àwọn ọkùnrin alágbára tí wọ́n ń gbé asà àti idà, tí wọ́n sì ń fi ọrun tafà, tí wọ́n sì mòye ogun, jẹ́ ọ̀kẹ́ méjì ó lé ẹgbẹ̀rìnlélógún dín ogójì ènìyàn, tí ó jáde lọ sí ogún náà.
Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.
19 Wọ́n sì bá àwọn ọmọ Hagari jagun, pẹ̀lú Jeturi, àti Nafiṣi àti Nadabu.
Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.
20 Nígbà tí wọ́n sì rí ìrànlọ́wọ́ gbà si, a sì fi àwọn ọmọ Hagari lé wọn lọ́wọ́, àti gbogbo àwọn tí ó wà pẹ̀lú wọn; nítorí tiwọn ké pe Ọlọ́run ní ogun náà, òun sì gbọ́ ẹ̀bẹ̀ wọn; nítorí tí wọ́n gbẹ́kẹ̀ wọn lé e.
E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.
21 Wọ́n sì kó ẹran ọ̀sìn wọn lọ; ìbákasẹ ẹgbàá mẹ́ẹ̀ẹ́dọ́gbọ̀n àti àgùntàn ọ̀kẹ́ méjìlá ó lé ẹgbàárùn-ún, àti kẹ́tẹ́kẹ́tẹ́ ẹgbẹ̀rún méjì, àti ènìyàn ọ̀kẹ́ márùn-ún.
Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.
22 Nítorí ọ̀pọ̀lọpọ̀ ni ó ṣubú tí a pa, nítorí láti ọ̀dọ̀ Ọlọ́run ni ogun náà, wọ́n sì jókòó ní ipò wọn títí di ìgbà ìkólọ sí ìgbèkùn.
E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.
23 Àwọn ọmọkùnrin ààbọ̀ ẹ̀yà Manase ń gbé ní ilẹ̀ náà: wọ́n bí sí i láti Baṣani títí dé Baali-Hermoni, àti Seniri àti títí dé òkè Hermoni.
Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.
24 Wọ̀nyí sì ni àwọn olórí ilé àwọn baba wọn. Eferi, Iṣi, Elieli, Asrieli, Jeremiah, Hodafiah àti Jahdieli àwọn alágbára akọni ọkùnrin, ọkùnrin olókìkí, àti olórí ilé àwọn baba wọn.
Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ.
25 Wọ́n sì ṣẹ̀ sí Ọlọ́run àwọn baba wọn, wọ́n sì ṣe àgbèrè tọ àwọn ọlọ́run ènìyàn ilẹ̀ náà lẹ́yìn, tí Ọlọ́run ti parun ní iwájú wọn.
Ma ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke nna nna ha. Kama ha merụrụ onwe ha site nʼife chi niile nke ndị bi nʼala ahụ na mbụ, bụ ndị Chineke lara nʼiyi nʼihu ha.
26 Nítorí náà Ọlọ́run Israẹli ru ẹ̀mí Pulu ọba Asiria sókè (èyí ni Tiglat-Pileseri ọba Asiria), ó si kó wọn lọ, àní àwọn ọmọ Reubeni àti àwọn ọmọ Gadi, àti ààbọ̀ ẹ̀yà Manase lọ sí ìgbèkùn. Ó sì kó wọn wá sí Hala, àti Habori, àti Harani, àti sí etí odò Gosani; títí dí òní yìí.
Nʼihi nke a, Chineke nke Izrel kpaliri mmụọ Pul, bụ eze Asịrịa (ya bụ Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa), ka o bilie megide ndị Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase, dọta ha nʼagha, buru ha gaa Hala, na Hoboa, na Hara na osimiri Gozan, ebe ha nọ ruo taa.

< 1 Chronicles 5 >