< Від Луки 19 >

1 І, ввійшовши Ісус, переходив через Єрихо́н.
Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe.
2 І ось чоловік, що звався Закхе́й, — він був старши́й над ми́тниками, і був багатий, —
Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya.
3 бажав ба́чити Ісуса, хто Він, але з-за наро́ду не міг, — бо мали́й був на зріст.
Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ.
4 І, забігши вперед, він виліз на фіґове дерево, щоб бачити Його, бо Він мав побіч нього прохо́дити.
Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ.
5 А коли на це місце Ісус підійшов, то поглянув уго́ру до нього й промовив: „Закхе́ю, — зійди за́раз додо́лу, бо сьогодні потрібно Мені бути в домі твоїм!“
Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.”
6 І той зараз додо́лу ізліз, і прийняв Його з радістю.
Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya.
7 А всі, як побачили це, почали нарікати, і казали: „Він до грішного мужа в гости́ну зайшов!“
Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.”
8 Став же Закхе́й та й промовив до Господа: „Господи, половину маєтку свого́ я віддам ось убогим, а коли кого скри́вдив був чим, — верну вче́тверо“.
Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”
9 Ісус же промовив до нього: „Сьогодні на дім цей спасі́ння прийшло, бо й він син Авраамів.
Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham.
10 Син бо Лю́дський прийшов, щоб знайти та спасти, що загинуло!“
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”
11 Коли ж вони слухали це, розповів Він іще одну при́тчу, бо Він був недалеко від Єрусалиму, вони ж ду́мали, що об'я́виться Боже Царство тепер.
Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe.
12 Отож Він сказав: „Один чоловік, роду славного, відправлявся в далеку країну, щоб царство прийняти й вернутись.
Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa.
13 І покликав він десятьох своїх рабів, дав їм десять мін, і сказав їм: „Торгуйте, аж поки верну́ся“.
Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’
14 Та його громадяни його нена́виділи, і послали посланців услід за ним, кажучи: „Не хочемо, щоб він був над нами царем“.
“Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’
15 І сталось, коли він верну́вся, як царство прийняв, то звелів посклика́ти рабів, яким срі́бло роздав, щоб довідатися, хто́ що набув.
“Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru.
16 І перший прийшов і сказав: „Пане, міна твоя принесла́ десять мін“.
“Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’
17 І відказав він йому: „Гаразд, рабе добрий! Ти в мало́му був вірний, — володій десятьма́ містами“.
“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’
18 І другий прийшов і сказав: „Пане, твоя міна п'ять мін принесла́“.
“Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’
19 Він же сказав і тому́: „Будь і ти над п'ятьма́ містами“.
“Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’
20 І ще інший прийшов і сказав: „Пане, ось міна твоя, що я мав її сховану в хустці.
“Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya.
21 Я бо боявся тебе, — ти ж бо люди́на жорсто́ка: береш, чого не поклав, і жнеш, чого не посіяв“.
Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’
22 І відказав той йому: „Уста́ми твоїми, злий рабе, суджу́ я тебе! Ти знав, що я — жорстока люди́на, беру́, чого не поклав, і жну, чого не посіяв.
“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị?
23 Чому́ ж не віддав ти міня́льникам срі́бла мого, — і я, повернувшись, узяв би своє із прибу́тком?“
Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’
24 І сказав він присутнім: „Візьміть міну від нього, та дайте тому́, хто десять мін має“.
“Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’
25 І відказали йому: „Пане, — він десять мін має“.
“Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’
26 Говорю́ бо я вам: „Кожному, хто має, то дасться йому, хто ж не має, — забереться від нього і те, що він має.
“Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere.
27 А тих ворогів моїх, які не хотіли, щоб царював я над ними, приведіте сюди, — і на оча́х моїх їх повбивайте“.
Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’”
28 А як це оповів, Він далі пішов, простуючи в Єрусалим.
Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem.
29 І ото, як набли́зився до Вітфагі́ї й Віфа́нії, на горі, що Оли́вною зветься, Він двох учнів послав,
Mgbe ọ na-abịaru Betfeji na Betani nso, nʼUgwu a na-akpọ Oliv, Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya,
30 наказуючи: „Ідіть у село, яке перед вами; увійшовши до нього, зна́йдете прив'язане осля́, що на нього ніко́ли ніхто із людей не сідав. Відв'яжіть його, і приведіть.
sị, “Gaanụ nʼime obodo nta ahụ dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kenyere nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-anọkwasịbeghi nʼelu ya, tọpụnụ ya, kpụtara m ya.
31 Коли ж вас хто спитає: „На́що відв'язуєте?“, відкажіть тому так: „Госпо́дь потребу́є його“.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ unu, ‘Gịnị mere unu ji atọpụ ya?’ Gwanụ onye ahụ sị, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.’”
32 Посланці́ ж відійшли, — і знайшли, як Він їм був сказав.
Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha.
33 А коли осля стали відв'язувати, хазяї́ його їх запитали: „На́що осля ви відв'язуєте?“
Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ nwa ịnyịnya ahụ?”
34 Вони ж відказали: „Господь потребу́є його“.
Ha sịrị, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.”
35 І вони привели́ до Ісуса його, і, поклавши одежу свою на осля, посадили Ісуса.
Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, nyere Jisọs aka ka ọ rigoro nʼelu ya.
36 Коли ж Він їхав, вони простила́ли одежу свою по дорозі.
Dị ka ọ na-aga, ndị mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ.
37 А як Він наближався вже до сходу з гори Оливної, то ввесь на́товп учнів, радіючи, почав гучним голосом Бога хвалити за всі чуда, що бачили,
Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ,
38 кажучи: „Благослове́нний Цар, що йде у Господнє Ім'я́! Мир на небеса́х, і слава на висоті!“
na-asị, “Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.” “Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.”
39 А деякі фарисеї з народу сказали до Нього: „Учителю, — заборони́ Своїм учням!“
Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!”
40 А Він їм промовив у відповідь: „Кажу вам, що коли ці замо́вкнуть, то каміння кричатиме!“
Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.”
41 І коли Він набли́зився, і місто побачив, то заплакав за ним,
Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya,
42 і сказав: „О, якби й ти хоч цього дня пізнало, що потрібне для миру тобі! Та тепер від очей твоїх сховане це.
sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị.
43 Бо при́йдуть на тебе ті дні, і твої вороги тебе ва́лом ото́чать, і обля́жуть тебе, і стиснуть тебе звідусю́ди.
Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị.
44 І зрівняють з землею тебе, і поб'ють твої діти в тобі, і не позоста́влять у тобі каменя на камені, бо не зрозуміло ти ча́су відвідин твоїх“.
Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.”
45 А коли Він у храм увійшов, то почав виганяти продавці́в,
Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa.
46 до них кажучи: „Написано: „Дім Мій — дім молитви“, а ви з нього зробили „пече́ру розбійників“.
Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’”
47 І Він кожного дня у храмі навчав. А первосвященики й книжники й найважні́ші з наро́ду шукали, щоб Його погубити,
Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.
48 але не знахо́дили, що вчинити Йому, бо ввесь наро́д горнувся до Нього та слухав Його.
Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.

< Від Луки 19 >