< Якова 4 >

1 Звідки ві́йни та свари між вами? Чи не звідси, — від ваших пожадливостей, які в ваших членах воюють?
Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu?
2 Бажаєте ви — та й не маєте, убиваєте й за́здрите — та досягнути не можете, сва́ритеся та воюєте — та не маєте, бо не проха́єте,
Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere.
3 прохаєте — та не одержуєте, бо прохаєте на зле, щоб ужити на розко́ші свої.
Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa.
4 Перелю́бники та перелю́бниці, чи ж ви не знаєте, що дружба зо світом — то ворожнеча супроти Бога? Бо хто хоче бути світові при́ятелем, той ворогом Божим стається.
Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.
5 Чи ви ду́маєте, що даремно Писа́ння говорить: „Жада́є аж до за́здрости Дух, що в нас пробуває“?
Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.”
6 Та ще більшу благода́ть дає, через що й промовляє: „Бог противиться гордим, а смиренним дає благода́ть“.
Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
7 Тож підкоріться Богові та спротивляйтесь дияволові, — то й утече він від вас.
Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.
8 Набли́зьтесь до Бога, то й Бог набли́зиться до вас. Очистьте руки, грішні, та серця освятіть, двоєдушні!
Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ.
9 Журіться, сумуйте та плачте! Хай обернеться сміх ваш у плач, а радість у сум!
Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ.
10 У покорі́ться перед Господнім лицем, — і Він вас підійме!
Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.
11 Не обмовляйте, брати, один о́дного! Бо хто брата свого обмовляє або судить брата, той Зако́на обмовляє та судить Зако́на. А коли ти Зако́на осуджуєш, то ти не викона́вець Закона, але суддя.
Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe.
12 Один Законода́вець і Суддя, що може спасти й погубити. А ти хто такий, що осуджуєш ближнього?
Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?
13 А ну тепер ви, що говорите: „Сьогодні чи взавтра ми пі́дем у те чи те місто, і там рік проживе́мо, та бу́демо торгувати й заробляти“,
Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”
14 ви, що не відаєте, що́ трапиться взавтра, — яке ваше життя? Бо це пара, що на хвильку з'явля́ється, а потім зникає!
Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.
15 Замість того, щоб вам говорити: „Як схоче Госпо́дь та бу́демо живі, то зробимо це або те“.
Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.”
16 А тепер ви хва́литеся в своїх го́рдощах, — лиха́ всяка подібна хвальба́!
Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ.
17 Отож, хто знає, як чинити добро, та не чинить, — той має гріх!
Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.

< Якова 4 >